Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Job 5:1-27

5  “Biko, kpọọ òkù! Ọ̀ dị onye na-aza gị? Ònye n’ime ndị nsọ ka ị ga-agbakwuru?   N’ihi na iwe ga-egbu onye nzuzu, Anyaụfụ ga-egbukwa onye ọ na-adị mfe ịrata.   Mụ onwe m ahụwo ka onye nzuzu na-agbanye mgbọrọgwụ,+ Ma na mberede amalitere m ịbụ ebe obibi ya ọnụ.   Ụmụ ya nọ nzọpụta n’ebe dị anya,+ A na-echikwa ha ọnụ n’ala n’ọnụ ụzọ ámá n’enweghị onye nnapụta.   Onye agụụ na-agụ na-eri ihe onye ahụ wetara n’ubi; Mmadụ na-ewere anụ ọ bọrọ abọ n’ebe o konyere ya, Ọnyà na-anwakwa ijide akụ̀ ha.   N’ihi na ihe ọjọọ adịghị esi n’ájá nkịtị epupụta, Nsogbu adịghịkwa esi n’ala nkịtị epulite.   N’ihi na a mụrụ mmadụ ịta ahụhụ, Dị ka ikerike ọkụ si efeli elu.   Otú ọ dị, mụ onwe m ga-ajụ Chineke ase, Ọ bụkwa Chineke ka m ga-enyefe okwu m,+   Onye na-eme oké ihe ndị a na-apụghị ịchọpụtacha achọpụtacha, Ihe dị ebube a na-apụghị ịgụta ọnụ;+ 10  Onye na-eme ka mmiri zoo n’elu ụwa,+ Onye na-ezipụkwa mmiri ka o zoo n’ala;+ 11  Onye na-eme ka ndị dị ala nọrọ n’ebe dị elu,+ Ka ndị na-eru uju wee nọrọ n’ebe dị elu ha n’ihi nzọpụta ha nwetara; 12  Onye na-akụghasị atụmatụ ndị aghụghọ,+ Ka aka ha wee ghara ịrụpụta ihe; 13  Onye na-ejide ndị maara ihe n’aghụghọ ha,+ Onye na-emekwa ka atụmatụ ndị aghụghọ ghọọ ihe mgbagwoju anya;+ 14  Ha na-ezute ọchịchịrị ọbụna n’ehihie, Ha na-asọgharịkwa ìsì n’etiti ehihie dị ka ọ̀ bụ n’abalị;+ 15  Onye na-azọpụta mmadụ ná mma agha nke si ha n’ọnụ, Na-anapụtakwa ogbenye n’aka onye dị ike,+ 16  Ka olileanya wee dịrị onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya,+ Ma ajọ omume na-emechi ọnụ ya.+ 17  Lee! Obi ụtọ na-adịrị onye Chineke na-abara mba;+ Ajụkwala ịdọ aka ná ntị nke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile! 18  N’ihi na ya onwe ya na-eme ka ndị mmadụ nwee ihe mgbu, ma ọ na-ekechi ọnyá ha; Ọ na-etijasị ndị mmadụ, ma aka ya na-agwọ ha. 19  N’ahụhụ isii ka ọ ga-anapụta gị,+ N’ahụhụ asaa kwa, ọ dịghị ihe ọjọọ ga-emetụ gị.+ 20  N’oge ụnwụ, ọ ga-anapụta gị n’aka ọnwụ,+ N’oge agha, ọ ga-anapụtakwa gị n’aka mma agha. 21  A ga-ezobe gị ka a ghara iji ire pịa gị ụtarị,+ Ị gaghịkwa atụ mbibi egwu mgbe ọ bịara. 22  Ị ga-achị mbibi na agụụ ọchị, Ị gaghịkwa atụ anụ ọhịa nke ụwa egwu. 23  N’ihi na gị na nkume dị n’ọhịa ga-agba ndụ, A ga-emekwa ka gị na anụ ọhịa biri n’udo.+ 24  Ị ga-amarakwa na udo bụ ụlọikwuu gị, Ị ga-agakwa hụ ala anụ ụlọ gị na-ata ahịhịa, ọ dịghịkwa ihe ị ga-achọ achọ. 25  Ị ga-amarakwa na ụmụ gị dị ọtụtụ,+ Nakwa na ụmụ gị dị ka ahịhịa dị n’ala.+ 26  Ị ga-aga n’ili mgbe ike ka dị gị,+ Dị ka mgbe a tụkọbara ùkwù ọka* n’oge ya. 27  Lee! Nke a bụ nchọpụta anyị meworo. Otú ahụ ka ọ dị. Nụrụ ya, gị onwe gị kwa, mara ya.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Job 5:26*  Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.