Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Job 41:1-34

41  “Ị̀ ga-ejili nko azụ̀ dọpụta Agụ Iyi,*+ Ka ị̀ ga-ejili ụdọ keda ire ya?   Ị̀ ga-etinyeli ụdọ ahịhịa amị n’oghere imi ya,+ Ka ị̀ pụrụ iji ogwu dụpuo agba ya?   Ọ̀ ga-arịọsi gị arịrịọ ike, Ka ọ̀ ga-agwa gị okwu dị nro?   Gị na ya ùnu ga-agba ndụ, Ka i wee jiri ya mere ohu ruo mgbe a na-akaghị aka?   Ị̀ ga-egwusa ya egwu dị ka ọ̀ bụ nnụnụ, Ka ị̀ ga-ekenye ya eriri ka ụmụ agbọghọ gị were ya gwurie egwu?   Ndị ahịa hà ga-eji ihe gbanwere ya? Hà ga-ekesara ya ndị ahịa?   Ị̀ pụrụ ịmaju ya ube n’ahụ́,+ Ma ọ bụ majuo ube e ji egbu azụ̀ n’isi ya?   Tụkwasị ya aka gị. Cheta otú o si ebu agha. Emela ya ọzọ.   Lee! Ihe mmadụ na-atụ anya ya n’ebe ọ nọ ga-akụ afọ n’ala. Anya nkịtị mmadụ hụrụ ya ga-akwada onye ahụ. 10  Ọ dịghị onye obi kara nke na ọ ga-aga kpasuo ya. Ọ̀ bụkwa onye pụrụ iguzo n’ihu m?+ 11  Ònye buru ụzọ nye m ihe, nke na m kwesịrị ịkwụ ya ụgwọ?+ Ihe niile dị n’okpuru eluigwe dum bụ nke m.+ 12  M gaghị ahapụ ịkọ banyere akụkụ ahụ́ ya dị iche iche Ma ọ bụ banyere ịdị ike ya na otú ọdịdị ahụ́ ya si maa mma. 13  Ònye yipụtụworo ya uwe? Ònye ga-abanye ya n’ọnụ? 14  Ònye meghetụworo ọnụ ya nke yiri ọnụ ụzọ? Ezé ya niile na-emenye ụjọ. 15  Ihe na-ebu ya isi bụ akpịrịkpa ya ndị nọ n’ahịrị n’ahịrị, Bụ́ ndị rapagidere n’ahụ́ ibe ha dị ka è ji mgbá siri ike nyagide ha. 16  Otu na-arapagidesi ike n’ahụ́ ibe ya, Ọbụna ikuku apụghịkwa isi n’etiti ha gafere. 17  Nke ọ bụla na-arapagidesi ike n’ahụ́ ibe ya; Ha na-arapara n’ahụ́ ibe ha, a pụghịkwa ikewa ha. 18  Uzere ya na-enwupụta ìhè, Anya ya dịkwa ka ìhè chi ọbụbọ. 19  Àmụ̀mà na-esi ya n’ọnụ apụta, Ọbụna ọkụ na-esikwa na ya apụta. 20  Anwụrụ ọkụ na-esi n’oghere imi ya apụta, Dị ka ekwú ọkụ e ji ahịhịa amị menye ọkụ na ya. 21  Ume ọ na-eku na-eme ka icheku ọkụ nwuru ọkụ, Ọbụna ire ọkụ na-esikwa ya n’ọnụ apụta. 22  Ike dị n’olu ya, Obi na-ekoropụ onye guzo n’ihu ya. 23  Akpụkpọ ahụ́ nke dị n’okpuru afọ ya siri ike; O yiri ihe a wụrụ awụ n’ahụ́ ya, a gaghị ewepụ ha ewepụ. 24  A wụsiri obi ya ike dị ka nkume, Ee, nkume a wụsiri ike dị ka nne nkume igwe nri. 25  O bilie ọtọ, ụjọ na-ejide ndị dị ike;+ Ụjọ na-etinye ha ná mgbagwoju anya. 26  Ọ bụrụ na e jiri mma agha bịakwasị ya, o nweghị ebe mma agha ga-eru ya, Ube na akụ́ na isi akụ́ enweghịkwa ebe ha ga-eru ya.+ 27  Ígwè+ na-adị ya ka okporo ọka efu, Ọla kọpa na-adịkwa ya ka osisi rere ure. 28  Akụ́ adịghị achụ ya ọsọ; Nkume èbè+ na-adịkwa ya ka ahịhịa ọka efu. 29  Okpiri na-adị ya ka ahịhịa ọka efu,+ Ọ na-achịkwa mkpọtụ árọ̀ na-eme ọchị. 30  Okpuru afọ ya dị ka ibe eju pịchara ọnụ; Ọ na-agbasa ihe e ji etichapụta mkpụrụ+ n’elu apịtị. 31  Ọ na-eme ka ala ala osimiri na-agbọ agbọ dị ka ite; Ọ na-eme ka oké osimiri dị ka ite a gbanyere mmanụ otite. 32  Ọ na-eme ka ụzọ o si gafere na-enwu zaa; Mmadụ echee na ogbu mmiri bụ isi awọ́. 33  E nweghị ihe yiri ya n’elu ala, Ihe na-adịghị atụ ihe ọ bụla egwu. 34  Ọ na-ahụ ihe ọ bụla nke dị elu. Ọ bụkwa eze anụ ọhịa niile dị ebube.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Job 41:1*  N’asụsụ Hibru, ‘Levayatan.’