Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Job 39:1-30

39  “Ị̀ maara oge a kara aka mgbe ewu ọhịa nke na-ebi n’oké nkume ji amụ nwa?+ Ị̀ na-ahụ mgbe nne ele na-amụ nwa+ n’ihe mgbu?   Ị̀ na-agụkọ ọnwa ole ha na-ebu afọ ime, Ka ị̀ maara oge ha ji amụ nwa?   Ha na-ehuru ehuru mgbe ha na-amụ nwa, Mgbe ha na-ewepụ ihe mgbu ha.   Ụmụ ha na-agbasi ike, ha na-anọ n’ime ọhịa buo; Ha na-apụ, ha adịghịkwa alaghachikwute ha.   Ònye hapụrụ ịnyịnya ọhịa+ ka ọ gawara onwe ya, Ọ̀ bụkwa onye tọpụrụ agbụ e kere ịnyịnya ibu ọhịa,   Bụ́ nke m nyere ọzara ka ọ bụrụ ụlọ ya, Nyekwa ala nnu+ ka ọ bụrụ ebe obibi ya?   Ọ na-achị ọgba aghara dị n’obodo ọchị; Ọ dịghịkwa anụ mkpọtụ onye na-achụ nta+ na-eme.   Ọ na-akpagharị n’ugwu na-achọ ahịhịa ọ ga-ata,+ Na-achọgharịkwa ụdị ahịhịa ndụ+ ọ bụla.   Atụ́ ọ̀ ga-achọ ijere gị ozi,+ Ka ọ̀ ga-anọbọ chi n’akụkụ ihe i ji etinyere anụ ụlọ nri? 10  Ị̀ ga-eji ụdọ kegide atụ́ n’ebe ị na-akọ ihe, Ka ọ̀ ga na-etiri ala+ na-eso gị n’azụ? 11  Ị̀ ga-atụkwasị ya obi n’ihi na ike ya dị ukwuu, Ị̀ ga-ahapụrụ ya ọrụ i kwesịrị ịrụ? 12  Ị̀ ga-enwe nchekwube na ọ ga-ewelatara gị ihe ubi Nakwa na ọ ga-ekpokọta ihe n’ebe nzọcha mkpụrụ gị? 13  Nne enyí nnụnụ ò jiriwo ọṅụ tie nku ya, Ka ọ̀ bụ nku na ábụ́bà ụgbala+ ka o nwere? 14  N’ihi na ọ na-ahapụ àkwá ya n’ala, Ọ bụkwa n’ájá ka ọ na-eme ka ha nweta okpomọkụ, 15  Ọ na-echefu na ụkwụ nwere ike ịzọpịa ha, Ma ọ bụ na anụ ọhịa nwere ike ịzọ ha ụkwụ. 16  Ọ na-emesi ụmụ ya ike, dị ka à ga-asị na ọ bụghị ya mụrụ ha+ N’efu ka ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ n’ihi na ọ naghị atụ ụjọ. 17  N’ihi na Chineke emewo ka o chefuo amamihe, O nyeghịkwa ya nghọta.+ 18  N’oge ọ na-eti nku ya n’elu, Ọ na-achị ịnyịnya na onye na-agba ya ọchị. 19  Ị̀ pụrụ inye ịnyịnya ike?+ Ị̀ pụrụ ime ka ọzà nke na-eme ụṅara dịrị n’olu ya? 20  Ị̀ pụrụ ime ka ọ na-amali elu dị ka igurube? Ịdị ebube nke iku ume ya na-emenye ụjọ.+ 21  Ọ na-azọ ụkwụ ya ike ike+ na ndagwurugwu, jirikwa ike ya na-awụli elu; Ọ na-apụ izute ihe agha.+ 22  Ọ na-achị ihe na-emenye ụjọ ọchị, ọ dịghịkwa atụ egwu;+ Mma agha adịghịkwa eme ka ọ gbaghachi azụ. 23  Akpa akụ́ na-eme mkpọtụ n’akụkụ ya, Tinyere ihu ube na árọ̀. 24  Ọ na-eme mkpọtụ, jirikwa iwe na-awụ ọsọ, Ọ dịghịkwa ekwe na ọ bụ ụda opi ka ọ na-anụ. 25  Ozugbo a fụrụ opi, ọ na-asị Ehee! Ọ na-anọkwa n’ebe dị anya anụ ísì agha, Mkpọtụ nke ndị isi agha na mkpu agha.+ 26  Ọ̀ bụ n’ihi nghọta gị ka agụ nkwọ ji efeli oké elu, Ka o jikwa na-agbasapụrụ ifufe si n’ebe ndịda nku ya? 27  Ka ọ̀ bụ iwu i nyere mere ugo+ ji efeli elu, Ọ̀ bụkwa ya mere o ji na-akpa akwụ́ ya n’ebe dị elu,+ 28  Meekwa ka ọ na-ebi n’oké nkume, na-anọkwa n’abalị N’ọnụ ọnụ nkume dị elu nakwa n’ebe siri ike ọbụba? 29  Ọ bụ ebe ahụ ka ọ na-esi aga achọ nri;+ Anya ya na-erukwa n’ebe dị oké anya. 30  Ụmụ ya na-aṅụ ọbara; Ọ bụkwa n’ebe ozu ndị e gburu egbu dị ka ọ na-anọ.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji