Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Job 37:1-24

37  “N’ezie, obi m malitere ịma jijiji+ n’ihi nke a, Obi na-amapụkwa m.   Ṅaanụ ntị nke ọma nụrụ wuruwuru olu ya na-azụ,+ Nakwa mbigbọ nke si ya n’ọnụ apụta.   Ọ na-atọhapụ ya n’okpuru eluigwe dum, Àmụ̀mà+ ya na-erukwa n’ebe niile ụwa sọtụrụ.   Oké ụda na-esochi ya; Ọ na-eji ụda olu ya dị ike+ ebigbọ dị ka égbè eluigwe,+ Ọ dịghịkwa ahapụ ibigbọ mgbe a nụrụ olu ya.+   Chineke na-eji olu ya ebigbọ+ n’ụzọ dị ebube, Na-emekwa oké ihe dị iche iche anyị na-apụghị ịmata.+   N’ihi na ọ na-asị snoo, ‘Daa n’ụwa,’+ Ọ na-agwakwa oké mmiri ozuzo ka o zoo, ọbụna oké mmiri ozuzo ya nke dị ike.+   Ọ na-eme ka ọrụ mmadụ efu ọ bụla na-arụ kwụsị, Ka mmadụ efu ọ bụla wee mata ọrụ ya.   Anụ ọhịa na-anọ n’ebe zoro ezo, Ọ bụkwa n’ebe ọ na-ezo ka o bi.+   Ifufe mmiri na-esi n’ime ụlọ+ ya abịa, Oyi na-esikwa n’ifufe nke si n’ebe ugwu abịa.+ 10  Ọ bụ ume Chineke kupụrụ na-eme ka e nwee mkpụrụ mmiri,+ Ọ na-akpakwara ogbu mmiri ókè.+ 11  Ee, ọ na-eme ka mmiri na-anyịgbu ígwé ojii, Ìhè+ ya na-emekwa ka ígwé ojii gbasasịa, 12  Nduzi ya na-eme ka ha na-aga okirikiri ịrụ ọrụ ha N’ebe ọ bụla o nyere iwu+ ka ha gaa n’elu ala. 13  Ọ na-eji ya emere ụtarị+ ma ọ bụ jiri ya dee ala+ Ma ọ bụ jiri ya gosi obiọma.*+ 14  Ṅaa ntị na nke a, Job; Guzo ma chebara ọrụ dị ebube nke Chineke echiche.+ 15  Ị̀ maara mgbe Chineke nyere ha iwu,+ Mgbe o mekwara ka ìhè ígwé ojii ya nwuo? 16  Ị̀ maara otú ígwé ojii si kwụrụ,+ Bụ́ ọrụ dị ebube nke Onye nwere ihe ọmụma zuru okè?+ 17  Ị̀ maara otú uwe gị si ekporo ọkụ Mgbe ụwa dara jụụ site n’ebe ndịda?+ 18  Ị̀ pụrụ iso ya jiri ihe tisaa mbara igwe,+ Nke dị ka enyo siri ike nke a wụrụ awụ? 19  Gwa anyị ihe anyị ga-agwa ya; Anyị apụghị ikwu okwu n’ihi ọchịchịrị. 20  À ga-akọrọ ya akọrọ na m ga-ekwu okwu? Ka è nweela onye kwuru na a ga-akọrọ ya?+ 21  Ugbu a, ha adịghị ahụ ìhè; Ọ na-egbuke egbuke na mbara igwe, Mgbe ifufe fefere wee zachaa ha. 22  N’ugwu ka ịma mma nke yiri ọlaedo si abịa. Ebube+ Chineke dị egwu. 23  Anyị amatabeghị ihe niile banyere Onye Pụrụ Ime Ihe Niile;+ Ike ya dị ukwuu,+ Ọ gaghịkwa eleda+ ikpe ziri ezi+ na ezi omume+ dị ukwuu anya. 24  Ya mere, ka ndị mmadụ tụọ egwu ya.+ O dịghịkwa eji onye ọ bụla nke maara ihe n’obi ya akpọrọ ihe.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Job 37:13*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”