Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Job 36:1-33

36  Elaịhu wee gaa n’ihu ikwu, sị:   “Nwetụkwuoro m ndidi, m ga-agwakwa gị Na ọ ka dị ihe m ga-ekwu banyere Chineke.   M ga-esi n’ebe dị anya nweta ihe ọmụma m, M ga-akpọkwa Onye kpụrụ m onye ezi omume.+   N’ihi na, n’ezie, ihe m na-ekwu abụghị okwu ụgha; Onye nwere ihe ọmụma+ zuru okè nọ n’ihu gị.   Lee! Chineke dị ike,+ ọ gaghịkwa ajụ mmadụ; Ọ dị ike ná nghọta nke obi ya;   Ọ gaghị ahapụ onye ajọ omume ọ bụla ndụ,+ Ma ọ ga-ekpe ndị nọ n’ahụhụ ikpe ziri ezi.+   Ọ gaghị ewepụ anya ya n’ahụ́ onye ọ bụla bụ́ onye ezi omume;+ Ọbụna ndị eze nọ n’ocheeze+ Ọ ga-emekwa ka ha nọrọ n’ocheeze ruo mgbe ebighị ebi, a ga-ebulikwa ha elu.   Ọ bụrụ na e kee ha agbụ,+ A na-eji ụdọ mmekpa ahụ́ ejide ha.   Mgbe ahụ, ọ ga-akọrọ ha banyere otú ha si eme omume Nakwa njehie ha, n’ihi na ha na-ebuli onwe ha elu. 10  Ọ ga-emeghekwa ntị ha ka ha nụ ndụmọdụ,+ Ọ ga-ekwukwa na ha kwesịrị ịhapụ ihe ọjọọ.+ 11  Ọ bụrụ na ha erube isi ma jeere ya ozi, Ha ga-enweta ihe ọma n’oge ndụ ha niile Bizuokwa ndụ ha n’obi ụtọ.+ 12  Ma ọ bụrụ na ha erubeghị isi, akụ́ ụta+ ga-agbagbu+ ha, Ha ga-anwụkwa n’enweghị ihe ọmụma. 13  Ndị si n’ezi ofufe dapụ n’ime obi ha na-akpadoro onwe ha iwe.+ Ha agaghị eti mkpu enyemaka ọbụna ma o kee ha agbụ. 14  Mkpụrụ obi ha ga-anwụ mgbe ha bụ okorobịa,+ Ha ga-anwụkwa n’etiti ndị ikom bụ́ ndị akwụna ụlọ arụsị.+ 15  Ọ ga-anapụta onye nọ n’ahụhụ n’ahụhụ ya, Ọ ga-emeghekwa ntị ha mgbe a na-emegbu ha. 16  Ọ ga-anapụtakwa gị n’ọnụ ahụhụ!+ Ị ga-anọ n’ebe sara mbara karị,+ nke na-adịghị mkpagide, Ngụgụ obi nke dị na tebụl gị ga-ejupụtakwa n’abụba.+ 17  Ikpe a mara onye ajọ omume+ ga-eju gị afọ; Mkpebi ikpe na ikpe ziri ezi ga-adịgide. 18  Lezie anya ka ọnụma+ ghara ịraba gị n’iji obi ilu na-akụ aka, Ekwekwala ka ihe mgbapụta+ buru ibu dufuo gị. 19  Ọ̀ dị ihe mkpu enyemaka ị na-eti ga-arụpụta?+ Ee e, ọ dịghịkwa ihe Oké mgbalị gị niile ga-arụpụta n’oge ahụhụ.+ 20  Atụsila anya abalị ike, Bụ́ mgbe ndị mmadụ na-esi n’ebe ha nọ agbaghachi azụ. 21  Lezie anya ka ị ghara ime ihe ọjọọ,+ N’ihi na ọ bụ nke a ka ị họọrọ kama ịhọrọ ịnọ n’ahụhụ.+ 22  Lee! Chineke ji ike ya eme ihe n’ụzọ dị ebube; Olee onye ozizi dị ka ya? 23  Ọ̀ dịwo onye mere ka ọ zaa ajụjụ banyere ihe o mere,+ Ọ̀ dịwokwa onye sịrị ya, ‘I meela ihe ọjọọ’?+ 24  Cheta na i kwesịrị ito ọrụ ya+ Bụ́ nke ndị mmadụ jiworo bụọ abụ.+ 25  Ihe niile a kpọrọ mmadụ elekwasịwo anya na ya; Mmadụ efu sikwa n’ebe dị anya na-ele ya.+ 26  Lee! Chineke dị elu karịa otú anyị pụrụ ịmata;+ A pụghịkwa ịchọpụta afọ ndụ ya.+ 27  N’ihi na ọ na-amịkọrọ mmiri niile tasara n’ala;+ Mmiri ahụ na-aghọ mmiri ozuzo na alụlụụ ya. 28  Mmiri ewee si n’ígwé ojii na-atapụta,+ Na-atasa ụmụ mmadụ n’ụba. 29  N’ezie, ònye pụrụ ịghọta urukpuru ígwé ojii, Oké mkpọtụ nke si n’ụlọ ndò ya?+ 30  Lee! O mewo ka ìhè ya gbasaa n’elu ya,+ O kpuchiwokwa ala ala oké osimiri. 31  N’ihi na ọ bụ ha ka o ji ekpechitere ndị mmadụ;+ Ọ na-enyekwa ihe oriri n’ụba.+ 32  O kpuchiwo àmụ̀mà n’ime aka ya, Ọ na-enyekwa ya iwu ka ọ bịakwasị onye mwakpo.+ 33  Oké ụda+ ya na-akọ banyere ya, Anụ ụlọ na-akọkwa banyere onye ahụ nke na-abịanụ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji