Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Job 35:1-16

35  Elaịhu gakwara n’ihu ịza, sị:   “Ọ̀ bụ ihe a ka ị na-ewere dị ka ikpe ziri ezi? Ị sịwo, ‘Ezi omume m karịrị nke Chineke.’+   N’ihi na ị na-asị, ‘Olee uru ọ baara gị?+ Olee uru m na-erite nke karịrị nke m ga-erite ma a sị na m na-emehie?’+   Mụ onwe m ga-azaghachi gị Na ndị enyi gị+ bụ́ ndị gị na ha nọ.   Lelie anya n’eluigwe+ hụ, Leekwa ígwé ojii,+ na ha dị nnọọ elu karịa gị.   Ọ bụrụ na i mee mmehie, olee ihe i metere ya?+ Ọ bụrụkwa na nnupụisi gị abaa ụba, olee ihe i metere ya?   Ọ bụrụ n’ezie na ị bụ onye ziri ezi, gịnị ka ị na-enye ya, Ọ̀ bụkwa gịnị ka ọ na-enweta n’aka gị?+   Ọ bụ mmadụ ibe gị ka ajọ omume gị ga-emetụta,+ Ọ bụkwa mmadụ ka ị ga-emeso ezi omume.+   Ha na-akpọ òkù ka e nyere ha aka n’ihi ọtụtụ mmegbu a na-emegbu ha;+ Ha na-eti mkpu enyemaka n’ihi ogwe aka nke ndị ukwu.+ 10  Ma ọ dịghị onye sịrị, ‘Olee ebe Chineke, bụ́ Onye Ukwu nke kere+ m, nọ, Onye na-eme ka e nwee abụ olu ụtọ n’abalị?’+ 11  Ọ bụ ya na-ezi anyị ihe+ karịa anụ ọhịa nke ụwa,+ Na-emekwa ka anyị mara ihe karịa anụ ufe nke eluigwe. 12  Ha nọ n’ebe ahụ na-akpọku ya, ma ọ dịghị aza,+ N’ihi nganga+ nke ndị ọjọọ. 13  Ma Chineke adịghị anụ okwu ụgha,+ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile adịghịkwa ahụ ya,+ 14  Ma ya fọdụzie mgbe ị sịrị na ị dịghị ahụ Chineke!+ Ọ bụ n’aka ya ka ikpe dị, n’ihi ya, i kwesịrị iji ndidi chere ya.+ 15  N’ihi na iwe ya emeghị ka o nye gị ntaramahụhụ,+ O tinyeghịkwa obi n’ihe i kwuru n’echeghị echiche.+ 16  Job na-asaghe ọnụ ya na nkịtị; Ọ na-ekwukwa ọtụtụ okwu nke amamihe na-adịghị.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji