Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Job 33:1-33

33  “Ma ugbu a, Job, nụrụ okwu m, Ṅaakwa ntị n’ihe niile m na-ekwu.   Biko, lee! aghaghị m imeghe ọnụ m; Ire m na okpo ọnụ+ m ga-ekwurịrị okwu.   Okwu m na-egosi na obi m ziri ezi,+ Ọ bụkwa ihe ọmụma ka egbugbere ọnụ m ji ezi obi na-ekwupụta.+   Ọ bụ mmụọ Chineke kere m,+ Ọ bụkwa ume Onye Pụrụ Ime Ihe Niile mere ka m dị ndụ.+   Saa m okwu ma ọ bụrụ na i nwere ike, Doo okwu n’usoro n’ihu m; jikere ejikere.   Lee! Ihe ị bụ n’anya ezi Chineke ka mụ onwe m bụ;+ Ọ bụkwa ụrọ ka e ji kpụọ m.+   Lee! Ọ dịghị ihe ụjọ dị n’ebe m nọ nke ga-emenye gị ụjọ, Ọ dịghịkwa nsogbu m na-enye gị nke+ ga-adị arọ n’ahụ́ gị.   Ọ bụ naanị na i kwuwo ná ntị m, Anọwokwa m na-anụ ka ị na-ekwu, sị,   ‘Adị m ọcha, enweghịkwa m njehie;+ Adị m ọcha, adịghịkwa m emejọ ihe.+ 10  Lee! Ọ bụ ụzọ ọ ga-esi megide m ka ọ na-achọ, O weere m ka onye iro ya.+ 11  O tinyere ụkwụ m n’ọtọsị,+ Ọ na-ele ụzọ m niile anya.’+ 12  Lee! Ka m gwa gị, i kwuteghị nke a;+ N’ihi na Chineke dị nnọọ ukwuu karịa mmadụ efu.+ 13  Gịnị mere o ji bụrụ ya ka i sesara okwu?+ Ọ bụ n’ihi na ọ dịghị asa gị ihe niile ị na-ekwu?+ 14  N’ihi na Chineke na-ekwu okwu otu ugboro, Nakwa ugboro abụọ+—ọ bụ ezie na mmadụ adịghị eji ya akpọrọ ihe— 15  Ná nrọ,+ bụ́ ọhụụ+ nke abalị, Mgbe oké ụra ji ndị mmadụ, Mgbe ụra na-atụ ha n’elu ihe ndina.+ 16  Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ na-emeghe ntị ụmụ mmadụ,+ Ọ na-emekwa ka okwu ịdọ aka ná ntị ya bamie ha n’obi, 17  Iji mee ka mmadụ si n’omume ya chigharịa,+ Nakwa ka o wee napụta mmadụ n’aka nganga.+ 18  Ọ na-egbochi mkpụrụ obi ya ịdaba n’olulu,+ Na-egbochikwa akụ́ ụta+ ịla ndụ ya n’iyi. 19  A na-ejikwa ihe mgbu adọ ya aka ná ntị n’elu ihe ndina ya, Ihe mgbu ọ na-enwe n’ọkpụkpụ ya adịghịkwa akwụsị akwụsị. 20  Ndụ ya na-eme ka nri ghọọ ihe na-asọ oyi,+ Mkpụrụ obi ya na-emekwa ka nri dị mma ghọọ ihe na-asọ oyi. 21  Ọ taala ahụ́, Ọkpụkpụ ya ndị a na-adịbughị ahụ anya apụtawo ìhè. 22  Mkpụrụ obi ya na-abịaru olulu nso,+ Ndụ ya na-abịarukwa ndị na-egbu mmadụ nso. 23  Ọ bụrụ na o nwere onye ozi, Ọnụ na-ekwuchitere ya, otu n’ime otu puku mmadụ, Onye ga-agwa mmadụ ihe ziri ezi ọ ga-eme, 24  O wee meere ya amara, sị, ‘Napụta ya ka ọ ghara ịgbada n’olulu!+ Enwetawo m ihe mgbapụta!+ 25  Ka ahụ́ ya dị ọhụrụ karịa otú ọ dị n’oge ọ bụ nwata;+ Ka ọ laghachi otú ọ dị n’oge o nwere ike okorobịa.’+ 26  Ọ ga-arịọsi Chineke arịrịọ ike ka o nwee mmasị n’ebe ọ nọ,+ Ọ ga-ejikwa iti mkpu ọṅụ hụ ihu ya, Ọ ga-enyeghachi mmadụ efu ezi omume Ya. 27  Ọ ga-abụrụ ụmụ mmadụ abụ wee sị, ‘Emehiewo m;+ emewokwa m ka ihe kwụ ọtọ gbagọọ agbagọ, Ọ bụghịkwa ihe m kwesịrị ime ma ọlị. 28  Ọ napụtawo mkpụrụ obi m ka ọ ghara ịba n’olulu,+ Ndụ m ga-ahụkwa ìhè.’ 29  Lee! Chineke na-eme ihe a niile, ọ na-emere ya mmadụ, ugboro abụọ, ugboro atọ 30  Iji gbochie mkpụrụ obi ya ịba n’olulu,+ Ka ìhè nke ndị dị ndụ wee nye ya ìhè.+ 31  Ṅaa ntị, Job! Gee m ntị! Dere duu, mụ onwe m ga na-ekwukwa ihe m na-ekwu. 32  Ọ bụrụ na i nwere ihe ọ bụla ị ga-asa m, saa m ya; Kwuo okwu, n’ihi na ezi omume gị na-atọ m ụtọ. 33  Ọ bụrụ na ọ dịghị ihe ị ga-asa m, gee m ntị;+ Dere duu, m ga-akụzikwara gị amamihe.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji