Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Job 31:1-40

31  “Mụ na anya m agbawo ndụ.+ Oleezi otú m ga-esi nwee mmasị n’ebe nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nọ?+   Oleekwa òkè Chineke nke bi n’elu ga-ekenye m,+ Ma ọ bụ, olee ihe nketa Onye Pụrụ Ime Ihe Niile nke nọ n’elu ga-enye m?   Ọ́ bụghị onye na-eme ihe ọjọọ ka ọdachi na-adakwasị,+ Ọ́ bụghịkwa ndị na-akpa arụ ka ihe ọjọọ na-adabara?   Ọ̀ bụ na ya onwe ya adịghị ahụ ụzọ m,+ Na-agụkwa ọbụna nzọụkwụ m niile ọnụ?   Ọ bụrụ na mụ na ndị na-adịghị eme ihe n’eziokwu na-eje ije,+ Ọ bụrụkwa na ụkwụ m na-eme ngwa ịgbaga n’aghụghọ,+   Ọ ga-eji ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ziri ezi tụọ m,+ Chineke ga-amarakwa na m na-eguzosi ike n’ezi ihe.+   Ọ bụrụ na ụkwụ m agahie ụzọ,+ Ma ọ bụ, ọ bụrụ na obi m ejesowo naanị ihe anya m na-ahụ,+ Ma ọ bụ, ọ bụrụ na ntụpọ ọ bụla araparawo n’ọbụ aka m,+   Ka m kụọ mkpụrụ, ma ka onye ọzọ rie ya,+ Ka e fopụkwa ụmụ m.   Ọ bụrụ na a ratawo obi m iche banyere nwaanyị ọzọ,+ M wee nọrọ n’ọnụ ụzọ mmadụ ibe m chebiri ya,+ 10  Ka nwunye m gweere nwoke ọzọ nri, Ka ndị ikom ọzọ gbaakwa agada n’elu ya.+ 11  N’ihi na nke ahụ ga-abụ omume rụrụ arụ, Nke ahụ ga-abụkwa mmejọ nke ndị ikpe ga-elebara anya.+ 12  N’ihi na nke ahụ bụ ọkụ ga-erepịa ihe ruo ná mbibi,+ Ọ ga-agbanyekwa mgbọrọgwụ n’etiti ihe niile m rụpụtara. 13  Ọ bụrụ na m na-ajụbu ime ka ohu m nwoke Ma ọ bụ ohu m nwaanyị nweta ikpe ziri ezi n’okwu ikpe ha nwere megide m, 14  Gịnịzi ka m ga-eme mgbe Chineke biliri ọtọ? Mgbe ọ ga-achọ ka m zaa ajụjụ, gịnị ka m ga-aza ya?+ 15  Ọ́ bụghị Onye ahụ kere m n’afọ kere ya,+ Ọ́ bụghịkwa otu Onye ahụ kere mụ na ya n’ime afọ? 16  Ọ bụrụ na m na-egbochibu ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha inweta ihe na-atọ ha ụtọ,+ Ọ bụrụkwa na m na-eme ka anya nwaanyị di ya nwụrụ gharakwa ịhụ ụzọ,+ 17  Ọ bụrụkwa na ọ bụ naanị m na-eribu obere nri m, Ma nwa na-enweghị nna esoghị m rie ya+ 18  (N’ihi na ọ nọ n’aka m too dị ka à ga-asị na m bụ nna ya malite m n’oge m bụ nwata, Ọ bụkwa malite n’afọ nne m ka m nọ na-edu ya); 19  Ọ bụrụ na m na-ahụbu onye ọ bụla ka ọ na-anwụ n’ihi enweghị uwe,+ Ma ọ bụ, na onye dara ogbenye enweghị uwe; 20  Ọ bụrụ na úkwù ya agọzighị m,+ Ma ọ bụ, ọ bụrụ na o jighị ajị a kpachapụtara+ n’ụmụ ebule m mee ka ahụ́ kporo ya ọkụ; 21  Ọ bụrụ na m ji iwe na-atụ nwa na-enweghị nna aka,+ Mgbe m hụrụ ka ọ nọ n’ọnụ ụzọ ámá na-achọ enyemaka m,+ 22  Ka ọkpụkpụ ubu m chikwapụ, Ka ogwe aka m kwokapụkwa na nkwonkwo ubu m. 23  N’ihi na ọdachi nke si n’aka Chineke mere ka ụjọ jide m, Apụghịkwa m iguzogide ebube ya.+ 24  Ọ bụrụ na mụ emewo ka ọlaedo bụrụ obi ike m, Ma ọ bụ na asịwo m ọlaedo, ‘Ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi!’+ 25  Ọ bụrụ na m na-aṅụrịbu ọṅụ n’ihi na ihe onwunwe m bara ụba,+ Nakwa n’ihi na aka m enwetawo ọtụtụ ihe;+ 26  Ọ bụrụ na m na-ahụbu ìhè ma o nwuo, Ma ọ bụ ọnwa dị ebube mgbe ọ na-aga,+ 27  E wee malite ịra obi m ụrà na nzuzo,+ M wee susuo aka m ọnụ, 28  Nke ahụkwa ga-abụ mmejọ nke ndị ikpe ga-eleba anya, N’ihi na ọ ga-apụta na mụ agọnahụwo ezi Chineke bi n’elu. 29  Ọ bụrụ na m na-aṅụrịbu ọṅụ mgbe e bibiri onye kpọrọ m oké asị,+ Ma ọ bụ na m nwere obi ụtọ n’ihi na ihe ọjọọ dakwasịrị ya— 30  Ekweghịkwa m ka okpo ọnụ m mehie Site n’ikwu ka ọ ṅụọ iyi ga-emegide mkpụrụ obi ya.+ 31  Ọ bụrụ na ndị bi n’ụlọikwuu m asịghị, ‘Ònye ga-amụ onye ọ bụla nke nri ya na-ejughị afọ?’+ 32  Ọ dịghị mbịarambịa nke na-arahụ n’èzí;+ Eghewere m ọnụ ụzọ m oghe maka ndị njem. 33  Ọ bụrụ na mụ ekpuchie njehie m dị ka mmadụ na-eme+ Site n’izo mmejọ m n’ime akpa uwe m— 34  N’ihi na m na-ama jijiji n’ihi oké ìgwè mmadụ, Ma ọ bụ, n’ihi na nlelị a na-elelị ezinụlọ dị iche iche na-emenye m ụjọ, M wee gba nkịtị, esighịkwa m n’ụlọ m pụọ. 35  A sị nnọọ na m nwere onye na-ege m ntị,+ Nakwa na Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ga-aza m dị ka aka m bịanyere si dị!+ Ma ọ bụkwanụ, a sị na onye mụ na ya nwere okwu ikpe nwere ihe o dere n’akwụkwọ! 36  N’ezie, m gaara eburu ya n’ubu m; M gaara eke ya n’isi m ka ọ dị ka nnukwu okpueze. 37  M gaara agwa ya ole nzọụkwụ m dị;+ M gaara agakwuru ya dị ka onye ndú. 38  Ọ bụrụ na ala m etie mkpu enyemaka megide m, Ọ bụrụkwa na ebe niile a kọrọ akọ akwaa ákwá n’otu mgbe; 39  Ọ bụrụ na mụ erie mkpụrụ ya n’akwụghị ụgwọ,+ Meekwa ka mkpụrụ obi nke ndị nwe ya sụọ ude,+ 40  Ka ahịhịa ogwu pulite n’ọnọdụ ọka wit,+ Ka ahịhịa na-esi ísì puokwa n’ọnọdụ ọka bali.” Okwu Job agwụla.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji