Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Job 3:1-26

3  Ọ bụ mgbe nke a gasịrị ka Job meghere ọnụ ya wee malite ịkọcha ụbọchị a mụrụ ya.+  Job wee sị:   “Ka ụbọchị a mụrụ m laa n’iyi,+ Ọbụna abalị ahụ mmadụ sịrị, ‘A tụrụwo ime nwa nwoke!’   Ka ụbọchị ahụ ghọọ ọchịchịrị. Ka Chineke ghara isi n’elu jụọ ase ya, Ka ìhè gharakwa inwu n’ụbọchị ahụ.   Ka ọchịchịrị na oké itiri weghara ya. Ka ígwé ojii nke mmiri ozuzo kpuchie ya. Ka ihe ndị na-eme ka ụbọchị gbaa ọchịchịrị menye ya oké ụjọ.+   Ka itiri weghara abalị ahụ;+ Ka ọ ghara iso ụbọchị ndị ọzọ dị n’afọ ṅụrịa ọṅụ; Ka a ghara ịgụnye ya n’ọnwa ndị e nwere.   Lee! Ka abalị ahụ tọgbọrọ n’efu; Ka a ghara iti mkpu ọṅụ ọ bụla na ya.+   Ka ndị na-abụ ụbọchị ọnụ kọchaa ya, Bụ́ ndị dị njikere ịkpọte Agụ Iyi.*+   Ka kpakpando chi ọbụbọ ya gbaa ọchịchịrị; Ka o chere ìhè, ma ka ìhè ghara ịdị; Ka ọ gharakwa ịhụ ìhè chi ọbụbọ. 10  N’ihi na o mechighị ụzọ afọ nne m,+ Wee gbochie anya m ịhụ nsogbu. 11  Gịnị mere anwụghị m n’afọ?+ Gịnị mere ekubighị m ume ozugbo m pụtasịrị n’afọ? 12  Gịnị mere ikpere ji nabata m, Gịnịkwa mere e ji nwee ara+ m ṅụrụ? 13  N’ihi na ugbu a m gaara edinarawo ala, ghara inwe nsogbu;+ M gaara arahụwo ụra; m gaara anọ na-ezu ike,+ 14  Mụ na ndị eze na ndị ndụmọdụ nke ụwa,+ Ndị na-ewuru onwe ha ebe tọgbọrọ n’efu,+ 15  Ma ọ bụ, mụ na ndị isi bụ́ ndị nwere ọlaedo, Ndị na-ekpoju ọlaọcha n’ụlọ ha; 16  Ma ọ bụ, dị ka ime pụrụ apụ+ na nzuzo, agaraghị m adị ndụ, Dị ka ụmụaka na-ahụtụghị ìhè.+ 17  N’ebe ahụ ka ndị ajọ omume na-adịkwaghị enwe nchegbu,+ N’ebe ahụkwa ka ndị ike gwụrụ nọ na-ezu ike.+ 18  Ndị mkpọrọ niile na-enwekwa ntụsara ahụ́; Ha adịghị anụ olu onye na-amanye ha ịrụ ọrụ.+ 19  Onye ukwu na onye nta bụ otu ihe ahụ n’ebe ahụ,+ A na-emekwa ka ohu nwere onwe ya n’aka nna ya ukwu. 20  Gịnị mere o ji enye onye nọ ná nsogbu ìhè, Na-enyekwa ndị ihe na-ewute ná mkpụrụ obi+ ndụ? 21  Gịnị mere e ji nwee ndị na-echere ọnwụ, ma ọ dịghị abịara ha,+ Ọ bụ ezie na ha na-egwu ala maka ya karịa ka ha na-egwu maka akụ̀ zoro ezo? 22  Ndị na-aṅụrị ọṅụ ruo n’ite egwú ọṅụ, Ha na-enwe aṅụrị n’ihi na ha nwetara ili. 23  Gịnị mere o ji enye mmadụ ìhè, bụ́ onye e zochiri ụzọ ya ezochi,+ Onye Chineke gbachibidokwara ogige?+ 24  N’ihi na m na-ama ọsụ tupu mụ erie nri,+ Mkpu ákwá m na-eti na-ezo dị ka mmiri;+ 25  N’ihi na atụwo m ihe na-emenye ụjọ egwu, ọ na-adakwasịkwa m; Ihe m na-atụ egwu na-abịakwara m.+ 26  Ọ dịghị mgbe m na-enweghị nchegbu, ọ dịghịkwa mgbe obi ruru m ala, Ọ dịghịkwa mgbe m zuru ike, ma nsogbu na-abịa.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Job 3:8*  N’asụsụ Hibru, ‘Levayatan.’