Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Job 27:1-23

27  Job wee jiri ilu malite ikwu okwu+ ọzọ, sị:   “Dị nnọọ ka Chineke dị ndụ,+ bụ́ onye wepụworo ikpe ziri ezi m,+ Dị nnọọ ka Onye Pụrụ Ime Ihe Niile dị ndụ, bụ́ onye meworo ka mkpụrụ obi m dị ilu,+   Mgbe ume m ka zuru ezu n’ime m, Mgbe mmụọ Chineke ka dịkwa n’oghere imi m,+   Egbugbere ọnụ m agaghị ekwu okwu ọ bụla na-ezighị ezi, Ire m agaghịkwa ekwu okwu aghụghọ ọ bụla!   Tụfịakwa! Agaghị m akpọ unu ndị ezi omume!+ Ruo mgbe m kubiri ume, m gaghị akwụsị iguzosi ike n’ezi ihe!+   Ejidesiwo m ezi omume m aka ike, agaghịkwa m ahapụ ya;+ Ọ dịghị ụbọchị ndụ m ọ bụla obi m ga-ata m ụta maka ya.+   Ka onye iro m bụrụ onye ajọ omume n’ụzọ niile,+ Ka onye na-emegide m bụrụkwa onye na-eme ihe ọjọọ n’ezie.   N’ihi na olee olileanya dịịrị onye si n’ezi ofufe dapụ ma ọ bụrụ na Chineke ebipụ ya,+ Ma ọ bụrụ na Chineke anapụ ya mkpụrụ obi ya?+   Chineke ọ̀ ga-anụ mkpu ákwá ya Ma ọ bụrụ na ahụhụ adakwasị ya?+ 10  Ka ihe Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ọ̀ ga-atọ ya ụtọ nke ukwuu? Ọ̀ ga na-akpọku Chineke mgbe niile? 11  M ga-esi n’aka Chineke zie unu ihe; M gaghịkwa ezo ụzọ nke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ezo.+ 12  Lee! Unu niile n’otu n’otu ahụwo ọhụụ; Gịnịzi mere isi unu ji tọgbọrọ chakoo?+ 13  Nke a bụ òkè onye ajọ omume ga-eketa n’aka Chineke;+ Ọ bụkwa ihe nketa nke ndị na-achị n’aka ike ka ha ga-enweta n’aka Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. 14  Ọ bụrụ na ụmụ ya adị ọtụtụ, a ga-eji mma agha gbuo ha;+ Ụmụ ụmụ ya agaghịkwa enwe nri ga-ezuru ha. 15  A ga-eli ndị ya fọrọ ndụ n’oge e nwere ihe otiti na-egbu mmadụ, Ụmụ nwaanyị ha ndị di ha nwụrụ agaghịkwa akwa ákwá.+ 16  Ọ bụrụ na o kpokọba ọlaọcha dị ka ájá, Ọ bụrụkwa na o nwejuo uwe ebe niile dị ka ájá ụrọ, 17  Ọ ga-enweju uwe ebe niile, ma, ọ bụ onye ezi omume ga-eyi ha,+ Ọ bụkwa onye aka ya dị ọcha ga-eketa òkè n’ọlaọcha ya. 18  O wuwo ụlọ ya dị ka nla efu, Nakwa dị ka ụlọ ndò+ nke onye nche wuru. 19  Ọ ga-abụ ọgaranya wee dinara ala, ma ọ gaghị achịkọta ihe ọ bụla; O meghewo anya ya, ma ọ dịghị ihe ọ hụrụ.+ 20  Ụjọ mberede ga-eri ya dị ka mmiri;+ Oké ifufe mmiri ga-ebufu ya n’abalị. 21  Ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ ga-eburu ya,+ bufuo ya, Ọ ga-esikwa n’ebe ọ nọ bupụ ya.+ 22  Ọ ga-efekwasị ya, ọ gaghị enwe ọmịiko;+ Ọ ga-anwakwa ịgbanahụ ike ya.+ 23  Mmadụ ga-akụrụ ya aka ịkwa emo,+ Nọrọkwa n’ebe ọ nọ fụọrọ ya mkpọrọhịhị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji