Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Job 20:1-29

20  Zofa onye Neama wee zaa, sị:   “Ọ bụ ya mere obi m nke na-ezughị ike ji na-azaghachi m, Ọbụna n’ihi nchegbu m na-enwe.   Ihe m na-anụ bụ ndụmọdụ mkparị; Mmụọ nke na-aza m bụ mmụọ nke na-enweghị nghọta m nwere.   Ị̀ maara nke a site ná mmalite, Kemgbe e mere ka mmadụ nọrọ n’elu ụwa,+   Na mkpu ọṅụ nke ndị ajọ omume na-adịru nwa oge,+ Nakwa na ọṅụ nke onye si n’ezi ofufe dapụ na-adịru naanị otu ntabi anya?   Ọ bụrụgodị na ebube ya eruo n’eluigwe,+ Isi ya emetụkwa n’ígwé ojii,   Ọ ga-ala n’iyi ruo mgbe ebighị ebi dị ka nsị ya;+ Ndị na-ahụ ya ga-asị, ‘Olee ebe ọ nọ?’+   Ọ ga-efepụ dị ka nrọ, a gaghịkwa ahụ ya; A ga-achụpụkwa ya dị ka ọhụụ nke abalị.+   Anya hụrụ ya agaghị ahụ ya ọzọ,+ Ebe o bi agakwaghị ahụ ya.+ 10  Ụmụ ya ga-arịọ ka ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha meere ha amara, Ọ ga-ejikwa aka ya nyeghachi ndị ọzọ akụ̀ ha.+ 11  Ọkpụkpụ ya jupụtara n’ike okorobịa, Ma ọ ga-ebu ya dinaa n’ájá nkịtị.+ 12  Ọ bụrụ na ihe ọjọọ atọọ ya ụtọ n’ọnụ, Ọ bụrụ na o mee ka ọ gbarie n’okpuru ire ya, 13  Ọ bụrụ na ọ na-atọ ya ụtọ nke na ọ hapụghị ya, Ọ bụrụkwa na ọ kpụgidesie ya ike n’ọnụ, 14  A ga-agbanwe nri ya n’ime eriri afọ ya; Ọ ga-aghọ elò agwọ ubí n’ime ya. 15  O lodawo akụ̀, ma ọ ga-agbọpụta ya; Chineke ga-eme ka o si n’afọ ya pụta. 16  Elò agwọ ubí ka ọ ga-amịrị; Ire ajụala ga-egbu ya.+ 17  Ọ gaghị ahụ ọwa mmiri ma ọlị,+ Bụ́ mmanụ aṅụ na mmiri ara ehi rahụrụ arahụ nke na-asọ ka iyi. 18  Ọ ga-eweghachi akụ̀ ọ kpatara, ọ gaghị eri ya; Dị ka akụ̀ ọ kpatara n’azụmahịa ya, nke ọ na-agaghị eri.+ 19  N’ihi na o gwepịawo ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha, ọ gbahapụwo ha; Ọ napụwo mmadụ ụlọ ọ na-abụghị ya wuru.+ 20  N’ihi na afọ agaghị ezu ya ike ma ọlị; Ihe dị oké ọnụ ahịa o nwere agaghị eme ka ọ lanahụ.+ 21  E nweghị ihe fọdụụrụ ya ọ ga-eripịa; Ọ bụ ya mere na ihe ịga nke ọma ya agaghị adịgide. 22  Ọ ga na-enwe nchegbu ọbụna mgbe akụ̀ ya juru ebe niile;+ Ihe ndabara ọjọọ ga-eji ike ya dum bịakwasị ya. 23  Ka ọ bụrụ na, iji mee ka afọ ju ya, Chineke ga-eweso ya iwe dị ọkụ,+ Ọ ga-emekwa ka o zokwasị ya, banye ya n’afọ. 24  Ọ ga-agbanahụ+ ihe agha e ji ígwè mee; Ụta e ji ọla kọpa mee ga-agbagbu ya. 25  A ga-agba ya akụ́ ụta, o wee si ya n’azụ pụta, Ngwá ọgụ nke na-egbu maramara ga-agbapukwa akpa ilu ya;+ Ihe ndị na-emenye ụjọ ga-abịakwasị ya.+ 26  Oké ọchịchịrị ga-erikpu akụ̀ ya; Ọkụ nke ọ na-enweghị onye fụnwuru ya ga-erepịa ya;+ Ọ ga-adịrị onye fọrọ ndụ n’ụlọikwuu ya njọ. 27  Eluigwe ga-ekpughe njehie ya,+ Ụwa ga-emegidekwa ya. 28  Oké mmiri ozuzo ga-ebupụ ụlọ ya; A ga-awụpụ ihe niile n’ụbọchị iwe Chineke.+ 29  Nke a bụ òkè onye ajọ omume ga-eketa n’aka Chineke,+ Bụ́ ihe nketa Chineke kwuru na ọ ga-enweta.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji