Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Job 2:1-13

2  E mesịa, o ruru otu ụbọchị, ụmụ ezi Chineke bịara guzo n’ihu Jehova, Setan batakwara kpọmkwem n’etiti ha iguzo n’ihu Jehova.+  Jehova wee sị Setan: “Olee ebe i si bịa?” Setan wee zaa Jehova, sị: “E si m n’ịwagharị n’ụwa nakwa n’ijegharị n’ime ya.”+  Jehova wee gaa n’ihu ịsị Setan: “Ì tinyewo obi gị n’ebe ohu m bụ́ Job nọ,+ na e nweghị onye dị ka ya n’ụwa, ọ bụ nwoke na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta, bụrụkwa onye ezi omume,+ ọ na-atụ egwu Chineke,+ ọ naghịkwa etinye aka n’ihe ọjọọ?+ Ọ ka na-eguzosi ike n’ezi ihe,+ ọ bụ ezie na ị na-akpali+ m imegide ya ka m loda ya n’enweghị ihe o mere.”+  Ma Setan+ zara Jehova, sị: “Akpụkpọ ahụ́ laara akpụkpọ ahụ́, ọ bụkwa ihe ọ bụla mmadụ nwere ka ọ ga-enye n’ọnọdụ mkpụrụ obi ya.+  Iji nwee ihe dị iche, biko, matịa aka gị metụ ọbụna ọkpụkpụ ya na anụ ahụ́ ya, lee ma ọ́ gaghị akọcha gị n’ihu gị.”+  Jehova wee sị Setan: “Lee, ọ nọ gị n’aka! Naanị kpachara anya maka mkpụrụ obi ya!”  Setan wee si n’ihu Jehova pụọ+ ma mee ka etuto ọjọọ too Job,+ malite n’ọbụ ụkwụ ya ruo n’opu isi ya.  O wee were ibe eju ọ ga-eji na-akọ ọkọ; ọ bụkwa n’ime ntụ ka ọ na-anọdụ ala.+  N’ikpeazụ, nwunye ya sịrị ya: “Ị̀ ka nọ na-eguzosi ike n’ezi ihe?+ Kọchaa Chineke nwụọ!” 10  Ma ọ sịrị ya: “Dị ka otu n’ime ụmụ nwaanyị nzuzu+ si ekwu okwu, otú ahụ ka gị onwe gị na-ekwukwa. Ọ̀ bụ naanị ihe ọma ka anyị ga na-anara n’aka ezi Chineke ma ghara ịnara ihe ọjọọ?”+ N’ihe a niile, Job ejighị egbugbere ọnụ ya mehie.+ 11  Ndị enyi Job atọ wee nụ ọdachi a dum dakwasịrị ya. Onye ọ bụla n’ime ha wee si n’ebe o bi bịa, Elifaz onye Timan+ na Bildad onye si n’agbụrụ Shua+ nakwa Zofa onye Neama.+ Ha wee zukọta n’oge ha kara aka+ ka ha bịa sị ya ndo ma kasie ya obi.+ 12  Mgbe ha nọ n’ebe dị anya lepụ anya, ha amatakwaghị onye ọ bụ. Ha wee bewe ákwá n’olu dara ụda. Onye nke ọ bụla wee dọwaa+ uwe elu ya na-enweghị aka ma kpolie uzuzu elu wụkwasị n’isi ya.+ 13  Ha wee soro ya nọrọ ọdụ+ n’ala nkịtị ruo ụbọchị asaa, ehihie na abalị, ọ dịghịkwa onye tụpụụrụ ya ọnụ, n’ihi na ha hụrụ na ọ nọ n’oké ihe mgbu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji