Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Job 18:1-21

18  Bildad onye si n’agbụrụ Shua wee zaa, sị:   “Olee mgbe unu ga-akwụsị okwu a unu na-ekwu? Unu kwesịrị ịghọta, ka anyị kwutụkwanụ.   Gịnị mere unu ga-eji were anyị ka anụ ọhịa,+ Anyị dịkwa ka ndị na-adịghị ọcha n’anya unu?   Ọ na-adọrisị mkpụrụ obi ya n’iwe ya. À ga-ekwo gị gbahapụ ụwa, Ka oké nkume ọ̀ ga-esi n’ebe ọ dị pụọ?   A ga-emekwa ka ìhè ndị ajọ omume nyụọ ka ọkụ,+ Ikerike ọkụ ya agaghịkwa enwu.   Ìhè ga-aghọ ọchịchịrị n’ụlọikwuu ya,+ N’ime ya ka a ga-emenyụkwa oriọna ya.   A ga-akpara ụkwụ ọ na-azọ ike ike ókè. Ọbụna atụmatụ ya ga-ajụ ya.+   N’ihi na ụkwụ ya ga-eduba ya n’ime ụgbụ, Ọ ga-agara banye n’ọnyà.+   Ọnyà ga-ama ya n’ikiri ụkwụ;+ Ọnyà+ ga-ejide ya. 10  Ọ bụ n’ala ka e zoro ụdọ a ga-eji jide ya, Ọ bụkwa n’ụzọ o si aga ka e siiri ya ọnyà. 11  Ụjọ mberede nke gbara ya gburugburu na-eme ka ọ tụwa egwu,+ Na-achụ ya ọsọ ụkwụ eru ala. 12  Ike na-agwụcha ya, Ọdachi+ ejikerewo ime ka o tewe ụkwụ. 13  Ọ ga-eri iberibe akpụkpọ ahụ́ ya; Nwa mbụ nke ọnwụ ga-eri aka ya na ụkwụ ya. 14  A ga-esi n’ụlọikwuu ya wepụ ihe ahụ na-enye ya obi ike,+ Ọ ga-emekwa ka ọ zọrọ ije gakwuru eze nke ihe egwu. 15  Ihe na-abụghị nke ya ga-ebi n’ụlọikwuu ya; A ga-awụsasị sọlfọ+ n’ebe obibi ya. 16  Mgbọrọgwụ ya ga-akpọ nkụ n’ime ala,+ N’elu, alaka ya ga-akpọnwụkwa. 17  A ga-akwụsị ịkpọtụ aha ya n’ụwa,+ Ọ gaghịkwa enwe aha n’okporo ámá. 18  Ha ga-esi n’ìhè kwaba ya n’ọchịchịrị, Ha ga-achụpụkwa ya n’elu ala. 19  Ọ gaghị enwe ụmụ na ụmụ ụmụ n’etiti ndị ya,+ Ọ dịghịkwa onye ga-afọdụ ndụ n’ebe o bi dị ka mbịarambịa. 20  N’ụbọchị ya, ndị nọ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ ga-ekporopụ anya, Ọbụna ndị nọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ ga na-ama jijiji. 21  Ma nke a bụ ihe na-eme ụlọikwuu nke onye na-eme ihe ọjọọ, Nke a bụkwa otú ọ na-adị onye na-amaghị Chineke.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji