Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Job 13:1-28

13  “Lee! Anya m ahụwo ihe a dum, Ntị m anụwo ya ma na-atụle ya.   Mụ onwe m makwa nke ọma ihe unu ma; Unu akaghị m.+   Otú ọ dị, mụ onwe m ga-agwa Onye Pụrụ Ime Ihe Niile okwu,+ Ọ ga-atọkwa m ụtọ ka mụ na Chineke rụrịta ụka.   Ma unu na-aghagide m ụgha;+ Unu bụcha ndị dibịa na-abaghị uru.+   A sị nnọọ na unu ga-agbachi nkịtị, Ka o wee bụrụ na unu nwere amamihe!+   Biko, nụrụnụ ihe m ga-aza,+ Ṅaakwanụ ntị n’arịrịọ m ji egbugbere ọnụ m na-arịọ.   Ùnu ga-ekwu ihe na-ezighị ezi iji gbachitere Chineke, Ka ùnu ga-ekwu okwu aghụghọ+ iji kwuchitere ya?   Ùnu ga-asọ ya anya,+ Ka ùnu ga-ekpechitere ezi Chineke ọnụ ya?   Ọ̀ ga-adịrị unu mma ma o nyochaa unu?+ Ka ùnu ga-eji ya gwurie egwu dị ka mmadụ si eji mmadụ efu egwuri egwu? 10  Ọ ghaghị ịbara unu mba+ Ma ọ bụrụ na unu asọọ ya anya na nzuzo;+ 11  Ebube ya ọ́ gaghị eme ka unu tụwa ụjọ, Meekwa ka ụjọ ya jide unu?+ 12  Okwu ilu unu enweghị isi na ọdụ;* Ọta unu bụ ọta ụrọ.+ 13  Derenụ duu n’ihu m, ka m kwuo okwu. Ka ihe ọ bụla ga-adakwasị m dakwasịwa m! 14  Gịnị mere m ji tagide anụ ahụ́ m ezé, Tinyekwa mkpụrụ obi m n’ihe ize ndụ?+ 15  Ọ bụrụgodị na ọ ga-egbu m egbu, ḿ gaghị echere?+ Ọ bụ naanị na m ga-azara ọnụ m n’ihu ya banyere ụzọ m. 16  Ọ ga-abụkwa nzọpụta m,+ N’ihi na ọ dịghị onye si n’ezi ofufe dapụ nke ga-abata n’ihu ya.+ 17  Geenụ ntị nke ọma n’ihe m na-ekwu,+ Ka ihe m na-ekwu baakwa unu ntị. 18  Lee! Biko, ewetawo m okwu ikpe;+ Amaara m nke ọma na m bụ onye ziri ezi. 19  Ònye ga-agbagha ihe m na-ekwu?+ N’ihi na ọ bụrụ na mụ agbachie nkịtị, m ga-ekubi ume! 20  Ọ dị ihe abụọ m na-arịọ ka ị ghara ime m; Mgbe ahụ, agaghị m ezo n’ihi gị;+ 21  Wepụ aka gị n’ahụ́ m ma mee ka ọ dị anya n’ebe m nọ, Ụjọ gị—ya ejidekwala m.+ 22  Kpọọ m ka m za; Ma ọ bụkwanụ ka m kwuo okwu ka ị zaa m. 23  Olee otú m si jehie ma mehie? Mee ka m mara nnupụisi m na mmehie m. 24  Gịnị mere i ji ewepụ ihu gị+ Ma na-ewere m dị ka onye iro gị?+ 25  Ị̀ ga-eme ka mkpá akwụkwọ nke ifufe na-ebugharị maa jijiji, Ka ị̀ ga na-achụso ahịhịa ọka kpọrọ nkụ? 26  N’ihi na ị nọ na-ede ihe ndị dị ilu megide m,+ Ị na-emekwa ka m taa ahụhụ n’ihi ihe m metara n’oge okorobịa.+ 27  Ị na-etinyekwa ụkwụ m n’ọtọsị,+ Ị na-enyochakwa ụzọ m niile; Ị na-akpakwara ọbụ ụkwụ m ókè. 28  Adị m* dị ka ihe rere ure nke na-emebisị emebisị;+ Dị ka uwe nke nla riri.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Job 13:12*  Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ ‘bụ ilu ntụ.’
Job 13:28*  Ma ọ bụ, ‘Nwoke a.’ N’asụsụ Hibru, ‘Ọ,’ ya bụ, Job.