Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Job 12:1-25

12  Job wee zaa, sị:   “N’ikwu eziokwu, unu bụ ọkaibe, Amamihe ga-eso unu nwụọ!+   Mụ onwe m nwekwara obi na-aghọta+ ihe dị ka unu nwere. Unu akaghị m,+ Olee onye na-amaghị ihe ndị a?   Aghọworo m mmadụ ibe m ihe ọchị,+ Bụrụkwa onye na-akpọku Chineke ka ọ za ya.+ Onye ezi omume, nke a na-apụghịkwa ịta ụta, aghọọla ihe ọchị.   Onye na-enweghị nchegbu na-elelị ọdachi anya,+ Na-eche na ọ bụ ndị ụkwụ ha na-ama jijiji ka a kwadebeere ya.+   Ụlọikwuu nke ndị na-ebukọrọ ihe mmadụ na-adị jụụ,+ Ndị na-akpasu Chineke iwe na-anọkwa n’udo, Bụ́ udo nke onye ji aka ya meere onwe ya chi na-enwe.+   Otú ọ dị, biko jụọ anụ ụlọ, ha ga-ezikwa gị ihe;+ Jụọkwa anụ ufe nke eluigwe, ha ga-akọkwara gị.+   Ma ọ bụ, gosi mmasị n’ebe ụwa dị, ọ ga-ezikwa gị ihe;+ Azụ̀ ndị dị n’oké osimiri+ ga-akọkwara gị ya.   Olee nke n’ime ihe ndị a niile nke na-amaghị nke ọma Na ọ bụ aka Jehova mere ihe a,+ 10  Onye mkpụrụ obi nke onye ọ bụla dị ndụ dị n’aka ya,+ Tinyere mmụọ nke anụ ahụ́ niile bụ́ mmadụ?+ 11  Ntị ọ̀ dịghị anwale okwu+ Dị ka okpo ọnụ+ si anụ ụtọ ihe oriri? 12  Ọ̀ bụ na amamihe adịghị n’etiti ndị agadi,+ Ọ̀ bụ na nghọta adịghịkwa n’ogologo ndụ? 13  Amamihe na ike dị n’aka ya;+ Ndụmọdụ na nghọta bụkwa nke ya.+ 14  Lee! Ọ na-akwatu ihe, a ghara iwulite ya;+ Ọ na-emechibido mmadụ ụzọ, a ghara imeghe ya.+ 15  Lee! Ọ na-akpara mmiri ókè, ha ewee takọọ;+ Ọ na-ezipụkwa ha, ha ewee gbanwee ala.+ 16  Ike na ezi amamihe dị ya n’aka;+ Ọ bụ ya nwe onye na-emehie ihe nakwa onye nduhie;+ 17  Ọ na-eme ka ndị ndụmọdụ gbara ụkwụ ọtọ,+ Ọ na-emekwa ka ndị ikpe na-ezuzu ezuzu. 18  Ọ na-atọpụ agbụ ndị eze,+ Ọ na-ekekwa ha ájị̀ n’úkwù. 19  Ọ na-eme ka ndị nchụàjà gbara ụkwụ ọtọ,+ Ọ na-akwatukwa ndị nọsiri ike;+ 20  Ọ na-anapụ ndị a tụkwasịrị obi okwu, Ọ na-anapụkwa ndị agadi ezi uche ha; 21  Ọ na-eleda ndị a ma ama anya,+ Ọ na-eme ka ihe ndị dị ike kere n’úkwù ghara isikwa ike; 22  Ọ na-esi n’ọchịchịrị kpughee ihe omimi,+ Ọ na-emekwa ka ìhè nwuo n’ebe gbara oké ọchịchịrị; 23  Ọ na-eme ka mba dị iche iche dị ukwuu, ka o wee bibie ha;+ Ọ na-emekwa ka mba dị iche iche gbasaa, ka o wee chịrị ha pụọ; 24  Ọ na-anapụ ndị isi nke ndị nọ n’elu ala uche ha, Ka o wee mee ka ha wagharịa n’ọzara,+ n’ebe ụzọ na-adịghị. 25  Ha na-asọ ìsì n’ọchịchịrị,+ n’ebe ìhè na-adịghị, Ka o wee mee ka ha na-adagharị dị ka onye mmanya na-egbu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji