Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Job 11:1-20

11  Zofa onye Neama+ wee zaa, sị:   “À ga-ahapụ ọtụtụ okwu n’azaghị ha aza, Ka onye na-etu ọnụ ọ̀ ga-abụ onye ziri ezi?   Okwu na-abaghị uru ị na-ekwu ọ̀ ga-emechi ndị mmadụ ọnụ, Ị̀ ga na-akwa emo n’enweghị onye baara gị mba?+   Ị sịkwara, ‘Ihe m na-ezi+ dị ọcha, Adịkwa m nnọọ ọcha+ n’anya gị.’   Ma, a sị nnọọ na Chineke ga-ekwu okwu Wee meghee egbugbere ọnụ ya gwa gị okwu!+   Ọ gaara agwa gị ihe nzuzo nke amamihe, N’ihi na ihe ezi amamihe dị na ha dị ọtụtụ. Ị gaara amatakwa na Chineke kwere ka e chefuoro gị ụfọdụ n’ime njehie gị.+   Ị̀ ga-achọpụtali ihe omimi nke Chineke,+ Ka ị̀ ga-achọpụtali ebe ịdị ukwuu nke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile jedebere?   Ọ dị elu karịa eluigwe. Gịnị ka ị ga-emeli? O miri emi karịa Shiol.+ Gịnị ka ị ga-amatali?   Ọ dị ogologo karịa ụwa ma a tụọ ya atụ̀, Ọ sakwara mbara karịa oké osimiri. 10  Ọ bụrụ na ọ gafee ma tinye mmadụ n’ụlọ mkpọrọ Ma kpọọ nnọkọ ikpe, ònye pụrụ igbochi ya? 11  N’ihi na ya onwe ya maara ndị na-adịghị eme ihe n’eziokwu.+ Ọ bụrụ na ọ hụ ihe ọjọọ, ọ́ gaghị elebara ya anya? 12  Ọbụna onye na-adịghị eche echiche ga-enwe uche Ngwa ngwa a mụrụ ịnyịnya ibu ọhịa o wee bụrụ mmadụ. 13  Ọ bụrụ na gị onwe gị akwadebe obi gị Ma gbasapụrụ ya ọbụ aka gị,+ 14  Ọ bụrụ na ihe ọjọọ dị n’aka gị, wepụ ya n’ebe dị anya, Ka ajọ omume ọ bụla gharakwa ibi n’ụlọikwuu gị. 15  N’ihi na mgbe ahụ ka ị ga-eweli ihu gị n’enweghị ntụpọ,+ Ị ga-akwụsi ike, ị gaghịkwa atụ egwu. 16  N’ihi na gị onwe gị ga-echefu ahụhụ; Ị ga-echeta ya dị ka mmiri nke sọfere asọfe. 17  Oge ndụ gị ga-enwupụ enwupụ karịa etiti ehihie;+ Ọchịchịrị ga-adị ka ụtụtụ.+ 18  Ị ga-enwe nchekwube n’ihi na olileanya dị; Ị ga-elegharị anya nke ọma—ị ga-edina ala n’obi iru ala.+ 19  Ị ga-edina ala n’enweghị onye ga-eme ka ị maa jijiji. Ọtụtụ ndị ga-emekwa ka obi jụrụ gị;+ 20  Anya ndị ajọ omume agakwaghị ahụ ụzọ;+ Ebe mgbaba ha ga-ala n’iyi,+ Olileanya ha ga-abụkwa mkpụrụ obi ha ikubi ume.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji