Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Job 10:1-22

10  “Mkpụrụ obi m akpọwo ndụ m asị.+ M ga-ekwupụta nchegbu m na-enwe banyere onwe m. M ga-ekwu okwu dị ka o si ewute mkpụrụ obi m!   M ga-asị Chineke, ‘Akpọla m onye ajọ omume. Mee ka m mara ihe mere i ji na-esesa m okwu.   Ọ̀ dị mma ka i mee ihe ọjọọ,+ Ka ị jụ ihe aka gị rụsiri ọrụ ike wee rụpụta,+ Ka i mee ka ìhè gị na-enwukwasị atụmatụ ndị ajọ omume?   Ọ̀ bụ anya+ mmadụ ka i nwere, Ka ọ̀ bụ dị ka mmadụ efu si ahụ ihe ka ị na-ahụ?+   Ụbọchị gị ọ̀ dị ka ụbọchị mmadụ efu,+ Ka afọ ndụ gị ọ̀ dị ka ụbọchị mmadụ,   Nke na ị ga-anwa ịchọpụta njehie m, Na ị ga na-achọ mmehie m?+   N’agbanyeghị na ị ma na ọ dịghị ihe m mejọrọ,+ Ọ dịghịkwa onye na-anapụta m n’aka gị?+   Ọ bụ aka gị kpụrụ m wee kee m,+ I kere ahụ́ m dum, ma ị na-aga iloda m.   Biko, cheta na ọ bụ ụrọ+ ka i ji kpụọ m, Ọ bụkwa n’ájá ka ị ga-eme ka m laghachi.+ 10  Ọ́ bụghị dị ka mmiri ara ehi ka ị wụpụrụ m, Meekwa ka m kpụkọọ dị ka mmiri ara ehi kpụkọrọ akpụkọ?+ 11  I wee yiwe m akpụkpọ ahụ́ na anụ ahụ́ dị ka uwe, Jirikwa ọkpụkpụ na akwara jikọta m.+ 12  I nyewo m ndụ, gosikwa m obiọma;*+ Nlekọta ị na-elekọta m+ echebewo mmụọ m. 13  Ihe ndị a ka i zobere n’obi gị. Amaara m nke ọma na ihe ndị a dị n’ebe ị nọ. 14  Ọ bụrụ na mụ emehiewo, i wee nọrọ na-ele m,+ Ị dịghịkwa agụ m n’onye aka ya dị ọcha ná njehie m;+ 15  Ọ bụrụ na m mejọrọ n’ezie, nke m agwụla!+ Ọ bụrụ na mụ emeghị ihe ọjọọ, agaghị m ebuli isi m elu,+ N’ihi na ihere na nhụsianya zuru m ahụ́.+ 16  Ọ bụrụkwa na ọ dị mpako,+ ị ga-achụ nta m+ dị ka nwa ọdụm si achụ nta anụ, Ị ga-egosikwa ọzọ na ị dị ebube n’ihe banyere m. 17  Ị ga-akpọta ndị akaebe ọhụrụ gị n’ihu m, Ị ga-emekwa ka iwe ị na-eweso m dịkwuo ukwuu; Ihe isi ike zuru m ahụ́. 18  Ya mere, gịnị mere i ji mee ka m si n’afọ pụta?+ A sị nnọọ na m kubiri ume, ka a ghara inwe anya hụrụ m, 19  N’ebe ahụ, m gaara adị ka onye ọ na-enweghị mgbe ọ dịrị ndụ; A gaara esi n’afọ kuru m gaa n’ili.’ 20  Ọ̀ bụ na ụbọchị ndụ m adịghị ole na ole?+ Ya hapụwa, Ya wepụ anya ya n’ebe m nọ, ka m gbasapụtụ ihu+ 21  Tupu mụ agawa—agaghịkwa m alaghachite+ N’ala ọchịchịrị na nke itiri,+ 22  N’ala gbachiri agbachi dị ka ọchịchịrị, n’ala nke oké ọchịchịrị Na ọgba aghara, n’ebe ìhè ya dị ka ọchịchịrị.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Job 10:12*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”