Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jeremaya 9:1-26

9  A sị nnọọ na isi m bụ mmiri, anya m abụrụ isi iyi nke na-agbapụta anya mmiri!+ M gaara akwara ndị e gburu egbu n’etiti ada bụ́ ndị m ákwá ehihie na abalị.+  A sị nnọọ na m nwere ebe ndị njem na-arahụ n’ala ịkpa!+ M gaara ahapụ ndị m, si n’ebe ha nọ pụọ, n’ihi na ha niile bụ ndị na-akwa iko,+ nzukọ ukwu nke ndị aghụghọ;+  ha na-ekwe ire ha dị ka ụta ikwu okwu ụgha;+ ma a bịa n’ikwesị ntụkwasị obi, ha adịghị ike n’ala a. “N’ihi na ha na-esi n’ihe ọjọọ banye n’ihe ọjọọ, ha leghaara ọbụna mụ onwe m anya,”+ ka Jehova kwuru.  “Onye ọ bụla n’ime unu kpachara anya n’ebe enyi ya nọ,+ unu atụkwasịkwala nwanne unu ọ bụla obi.+ N’ihi na nwanne ọ bụla ga-aghọ nwanne ya aghụghọ,+ enyi ọ bụla ga na-ejegharị dị ka onye nkwutọ,+  onye ọ bụla na-ejikwa enyi ya egwuri egwu;+ ha adịghị ekwu eziokwu ma ọlị. Ha akụziworo ire ha ikwu okwu ụgha.+ Ha emekatala ihe ọjọọ ike gwụ ha.+  “Ị nọ ọdụ n’ime aghụghọ.+ Ọ bụ aghụghọ mere ha ji jụ ịmara m,”+ ka Jehova kwuru.  Ya mere, nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru: “Lee, m na-agbaze ha, m ga-enyochakwa ha,+ n’ihi na olee otú ọzọ m ga-esi meso ada bụ́ ndị m ihe?+  Ire ha bụ akụ́ e ji agbagbu mmadụ.+ Ọ bụ aghụghọ ka o kwuworo. Mmadụ ji ọnụ ya na-agwa mmadụ ibe ya okwu udo; ma n’obi ya, o zoro chebiri ya.”+  “Ọ̀ bụ na mụ agaghị eme ka ha zaa ajụjụ n’ihi ihe ndị a?” ka Jehova kwuru. “Ka ọ̀ bụ na mkpụrụ obi m agaghị abọ ọbọ n’ahụ́ mba dị otú a?”+ 10  M ga-akwara ugwu ákwá, kwaakwara ya ákwá arịrị,+ m ga-abụrụ ala ịta ahịhịa ndị dị n’ala ịkpa abụ iru uju; n’ihi na a ga-agbaworị ha ọkụ+ nke na ọ dịghị onye ga-esi na ha gafere, ndị mmadụ agaghịkwa anụ mkpọtụ anụ ụlọ.+ Anụ ufe nke eluigwe ga-efepụ, anụ ọhịa ga-agbakwa ọsọ; ha agaghị anọkwa.+ 11  M ga-emekwa ka Jeruselem bụrụ ikpo nkume,+ ọgba nkịta ọhịa;+ m ga-emekwa ka obodo ndị dị na Juda bụrụ ebe tọgbọrọ n’efu, n’enweghị onye bi ha.+ 12  “Ònye maara ihe, ka o wee ghọta ihe a, ònyekwa ka Jehova ji ọnụ ya gwa okwu, ka onye ahụ wee kọọ ya?+ N’ihi gịnị ka ala a ga-eji laa n’iyi, e wee gbaa ya ọkụ dị ka ala ịkpa, n’enweghị onye na-esi na ya agafe?”+ 13  Jehova wee sị: “Ọ bụ n’ihi na ha hapụrụ iwu m nke m nyere ka ọ dịrị n’ihu ha, ọ bụkwa n’ihi na ha erubeghị isi n’ihe m kwuru, ha ejeghịkwa ije n’iwu m,+ 14  kama ha nọ na-eje ije dị ka isi ike nke dị n’obi ha si dị,+ na-esokwa ihe oyiyi Bel,+ nke ndị nna ha kụziiri ha;+ 15  ya mere, nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, ‘Lee, m na-eme ka ha, ya bụ, ndị a, taa ahịhịa ilu,+ m ga-emekwa ka ha ṅụọ mmiri e tinyere ihe na-egbu mmadụ;+ 16  m ga-achụsasịkwa ha ná mba ndị ha na ndị nna ha na-amaghị,+ m ga-emekwa ka mma agha na-achụ ha ruo mgbe m kpochapụrụ ha.’+ 17  “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘Jirinụ nghọta mee ihe, kpọọnụ ndị inyom na-abụ abụ iru uju+ ka ha bịa; zigaranụ ọbụna ndị inyom bụ́ ndị ọkwa ákwá ozi ka ha bịa,+ 18  ka ha bịa ọsọ ọsọ kwaara anyị ákwá arịrị. Ka anya mmiri si anyị n’anya na-asọdata, ka anya mmiri si n’anya anyị nke na-enwu gbaa na-agbapụta.+ 19  N’ihi na ọ bụ ákwá arịrị ka a nụrụ site na Zayọn, sị:+ “Lee otú e si bukọrọ ihe anyị nwere!+ Lee otú ihere si mee anyị! N’ihi na anyị ahapụwo ala anyị; n’ihi na ha akụtuwo ebe obibi anyị.”+ 20  Ma, nụrụnụ okwu Jehova, unu ndị inyom, ka ntị unu nụrụ okwu ọnụ ya. Mgbe ahụ, kụzierenụ ụmụ unu ndị inyom ákwá arịrị,+ ka nwaanyị ọ bụla kụziekwara nwaanyị ibe ya abụ iru uju.+ 21  N’ihi na ọnwụ esiwo na windo anyị bata; ọ batawo n’ụlọ elu anyị ka o gbuchapụ ụmụntakịrị anyị n’okporo ámá, gbuchapụkwa ụmụ okorobịa anyị n’ámá obodo.’+ 22  “Kwuo, sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Ozu ndị mmadụ ga-adị ka nsị anụ n’elu ala, dịkwa ka ùkwù ọka* onye na-ewe ihe ubi ka gbutusịrị egbutusị n’enweghị onye ga-achịkọta ha.”’”+ 23  Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Ka onye maara ihe ghara iji amamihe ya na-anya isi,+ ka dike ghara iji ike ya na-anya isi.+ Ka ọgaranya ghara iji akụnụba ya na-anya isi.”+ 24  “Ma, ka onye na-anya isi nyaa isi na o nwere nghọta+ banyere m, marakwa m, na mụ onwe m bụ Jehova,+ Onye na-egosi obiọma,* na-ekpekwa ikpe ziri ezi ma na-eme ezi omume n’ụwa;+ n’ihi na ọ bụ ihe ndị a na-atọ m ụtọ,”+ ka Jehova kwuru. 25  “Lee! Ụbọchị na-abịa,” ka Jehova kwuru, “mgbe m ga-eme ka ha zaa ajụjụ, ya bụ, ndị niile e biri úgwù ma ka bụrụ ndị a na-ebighị úgwù,+ 26  bụ́ Ijipt+ na Juda+ na Idọm+ na ụmụ Amọn+ na Moab+ na ndị niile na-akpụ ntutu dị n’agba ntị abụọ ha, bụ́ ndị bi n’ala ịkpa;+ n’ihi na mba niile bụ ndị a na-ebighị úgwù, ụlọ Izrel dum bụkwa ndị a na-ebighị úgwù n’obi.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Jer 9:22*  Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.
Jer 9:24*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”