Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jeremaya 52:1-34

52  Zedekaya+ gbara afọ iri abụọ na otu mgbe ọ malitere ịchị,+ ọ chịkwara afọ iri na otu na Jeruselem.+ Aha nne ya bụ Hamutal+ ada Jeremaya onye Libna.+  O wee na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova,+ dị ka ihe niile Jehoyakim+ mere si dị.  N’ihi na ihe mere na Jeruselem nakwa na Juda kpasuru Jehova iwe ruo mgbe o wepụrụ ha n’ihu ya.+ Zedekaya wee nupụrụ eze Babịlọn isi.+  N’ikpeazụ, o ruru n’afọ nke itoolu nke ọbụbụeze ya,+ n’ọnwa nke iri, n’abalị iri n’ọnwa ahụ, na Nebukadreza eze Babịlọn bịara, ya na ndị agha ya niile, ibuso Jeruselem agha,+ ha wee malite ịma ụlọikwuu ibuso ya agha na iwu mgbidi nnọchibido gburugburu ya.+  E wee nọchibido obodo ahụ ruo n’afọ nke iri na otu nke ọchịchị Eze Zedekaya.+  N’ọnwa nke anọ, n’abalị itoolu n’ọnwa ahụ,+ ụnwụ siri ike n’obodo ahụ, ndị ala ahụ enweghị ihe oriri ọ bụla.+  N’ikpeazụ, a kwaturu mgbidi obodo ahụ;+ ma ndị agha niile malitere ịgba ọsọ+ wee si n’ọnụ ụzọ ámá nke dị n’agbata mgbidi abụọ ndị dị n’akụkụ ubi eze na-agbapụ n’obodo ahụ n’abalị,+ ka ndị Kaldia gbara obodo ahụ gburugburu ibuso ya agha; ha wee na-agbaga n’ụzọ gara Araba.+  Ndị agha ndị Kaldia wee chụwa eze,+ ha wee chụkwute Zedekaya+ na mbara ọzara Jeriko; ndị agha ya niile wee hapụ ya gbasasịa.+  Ha wee jide eze kpụrụ ya bịakwute eze Babịlọn+ n’ime Ribla,+ n’ala Hemat,+ ka o kpee ya ikpe.+ 10  Eze Babịlọn wee gbuo ụmụ ndị ikom Zedekaya n’ihu ya,+ o gbukwara ndị isi niile nke Juda n’ime Ribla.+ 11  Ọ rụkpọsịkwara Zedekaya anya,+ e mesịa, ọ tụrụ ya ịgà e ji ọla kọpa mee wee kpụta ya Babịlọn+ ma tụba ya n’ụlọ mkpọrọ ruo ụbọchị ọ nwụrụ. 12  N’ọnwa nke ise, n’abalị iri n’ọnwa ahụ, ya bụ, n’afọ nke iri na itoolu nke ọchịchị Eze Nebukadreza,+ bụ́ eze Babịlọn, Nebuzaradan+ onyeisi ndị nche, bụ́ onye na-eguzo n’ihu eze Babịlọn, batara na Jeruselem. 13  O wee gbaa ụlọ Jehova+ na ụlọ eze na ụlọ niile dị na Jeruselem ọkụ;+ ọ gbakwara nnukwu ụlọ niile ọkụ.+ 14  Ndị agha niile nke ndị Kaldia, bụ́ ndị ha na onyeisi ndị nche ahụ so, kwaturu mgbidi dum gbara Jeruselem gburugburu.+ 15  Nebuzaradan onyeisi ndị nche dọọrọ ụfọdụ n’ime ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha n’agha, tinyere ndị ọzọ fọdụrụ n’obodo ahụ+ na ndị chịliri aka elu gbakwuru eze Babịlọn nakwa ndị ọzọ fọdụrụ bụ́ ndị ọkà.+ 16  Nebuzaradan onyeisi ndị nche hapụrụ ụfọdụ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha n’ala ahụ ka ha fọdụ wee bụrụ ndị ọrụ ubi vaịn na ndị a na-amanye ịrụ ọrụ.+ 17  Ndị Kaldia kụrisịkwara ogidi ọla kọpa+ ndị dị n’ụlọ Jehova nakwa ihe ndị e ji ebu ihe+ na oké osimiri e ji ọla kọpa rụọ+ bụ́ nke dị n’ụlọ Jehova ma buru ọla kọpa dum e ji rụọ ha laa Babịlọn.+ 18  Ha bukọkwaara ite na shọvel+ na ihe ndị e ji emenyụ ọkụ+ na ọkwá+ na iko na arịa niile e ji ọla kọpa rụọ bụ́ ndị ha jibu na-eje ozi.+ 19  Onyeisi ndị nche ahụ bukọọrọ+ efere ukwu+ na ihe ịgụ ọkụ na ọkwá+ na ite na ihe ndọba oriọna+ na iko na ọkwá ndị e ji ezigbo ọlaedo mee+ na ndị nke e ji ezigbo ọlaọcha mee.+ 20  Ma ogidi abụọ ahụ,+ oké osimiri ahụ,+ oké ehi iri na abụọ ahụ e ji ọla kọpa kpụọ+ bụ́ ndị dị n’okpuru oké osimiri ahụ, ihe ndị e ji ebu ihe, bụ́ ndị Eze Sọlọmọn mere maka ụlọ Jehova,+ a tụghị ịdị arọ nke ọla kọpa e ji kpụọ ha niile atụ̀.+ 21  Nke ọ bụla n’ime ogidi ndị ahụ dị kubit iri na asatọ n’ịdị elu,+ eriri nke dị kubit iri na abụọ ga-aga ya gburugburu;+ igbidi ya dị uhiè mkpịsị aka anọ, ime ya ghekwara oghe. 22  E jikwa ọla kọpa kpụọ ihe a kpụkwasịrị n’elu ogidi ahụ,+ otu n’ime ihe ahụ a kpụkwasịrị n’elu ogidi ahụ dị kubit ise n’ịdị elu;+ e ji naanị ọla kọpa kpụọ ihe a kpara akpa nakwa mkpụrụ pọmigranet ndị e ji gbaa ihe a kpụkwasịrị n’elu ogidi ahụ gburugburu;+ ogidi nke abụọ nwekwara ihe ndị a, tinyere mkpụrụ pọmigranet ndị ahụ.+ 23  Mkpụrụ pọmigranet ndị dị ya gburugburu dị iri itoolu na isii, mkpụrụ pọmigranet niile ndị dị n’ihe ahụ a kpara akpa gbaa gburugburu dị otu narị.+ 24  Onyeisi ndị nche kpụkwaara Seraya+ bụ́ onyeisi nchụàjà na Zefanaya+ onye nchụàjà na-esote ya nakwa mmadụ atọ bụ́ ndị nche ọnụ ụzọ,+ 25  o sikwa n’obodo ahụ kpụrụ otu onye na-eje ozi n’obí eze bụ́ onye na-elekọta ndị agha, nakwa ndị ikom asaa n’ime ndị na-abịa n’ihu eze mgbe niile,+ bụ́ ndị nọ n’obodo ahụ, na odeakwụkwọ onyeisi ndị agha, bụ́ onye na-akpọkọta ndị ala ahụ maka ibu agha, nakwa ndị ikom iri isii n’ime ndị ala ahụ bụ́ ndị nọ n’obodo ahụ.+ 26  Nebuzaradan+ onyeisi ndị nche wee kpụrụ ndị a bịakwute eze Babịlọn n’ime Ribla.+ 27  Eze Babịlọn wee gbuo ha+ n’ime Ribla,+ n’ala Hemat.+ E wee si otú a dọrọ Juda n’agha pụọ n’ala ya.+ 28  Ndị a bụ ndị Nebukadreza dọọrọ n’agha: n’afọ nke asaa, ọ dọọrọ puku ndị Juu atọ na iri abụọ na atọ n’agha.+ 29  N’afọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Nebukadreza,+ o si na Jeruselem dọrọ narị mkpụrụ obi asatọ na iri atọ na abụọ n’agha. 30  N’afọ nke iri abụọ na atọ nke ọchịchị Nebukadreza, Nebuzaradan onyeisi ndị nche dọọrọ ndị Juu dị narị mkpụrụ obi asaa na iri anọ na ise n’agha.+ Mkpụrụ obi niile ahụ dị puku anọ na narị isii. 31  O wee ruo n’afọ nke iri atọ na asaa mgbe a dọrọsịịrị Jehoyakin+ eze Juda n’agha, n’ọnwa nke iri na abụọ, n’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa ahụ, na Ivil-merodak eze Babịlọn, n’afọ ọ ghọrọ eze, kpọpụtara+ Jehoyakin eze Juda wee mee ka o si n’ụlọ mkpọrọ pụta. 32  O wee malite ịgwa ya okwu ọma, meekwa ka ocheeze ya dị elu karịa ocheeze ndị eze ndị ọzọ ya na ha nọ na Babịlọn.+ 33  O wee yipụ ya uwe mkpọrọ,+ o wee na-eri ihe+ n’ihu ya mgbe niile n’ụbọchị niile nke ndụ ya.+ 34  A bịa n’ihe a na-enye ya, a na-esi n’ihe eze Babịlọn nwere enye ya ihe mgbe niile, kwa ụbọchị dị ka o kwesịrị, n’ụbọchị niile nke ndụ ya ruo ụbọchị ọ nwụrụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji