Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jeremaya 50:1-46

50  Nke a bụ ihe Jehova kwuru site n’ọnụ Jeremaya onye amụma banyere Babịlọn,+ banyere ala ndị Kaldia:+  “Kọọnụ ya n’etiti mba dị iche iche, kwusaakwanụ ya.+ Gwunyenụ ihe mgbaàmà;+ kwusaanụ ya. Unu ezola ihe ọ bụla ezo. Sịnụ, ‘E wegharawo Babịlọn.+ E menyewo Bel ihere.+ Ụjọ ejidela Merodak. E menyewo ihe oyiyi ya niile ihere.+ Ụjọ ejidela arụsị ya niile na-asọ oyi ka nsị.’  N’ihi na otu mba esiwo n’ebe ugwu bịa buso ya agha.+ Ọ bụ mba ahụ mere ka ala ya bụrụ ihe ijuanya, nke mere na ọ dịghị onye bi n’ime ya.+ Ma mmadụ ma anụ ụlọ agbalagawo.+ Ha agbafuola.”+  “N’ụbọchị ndị ahụ nakwa n’oge ahụ,”+ ka Jehova kwuru, “ụmụ Izrel na ụmụ Juda ga-abịa.+ Ha ga na-aga, bere ákwá na-aga,+ ha ga-achọ Jehova bụ́ Chineke ha.+  Ha ga na-ajụ ajụjụ ụzọ e si aga Zayọn, ha ga-eche ihu n’ụzọ ahụ,+ na-asị, ‘Bịanụ ka anyị na Jehova gbaa ndụ nke ga-adịru mgbe ebighị ebi, nke a na-agaghịkwa echefu echefu.’+  Ndị m aghọwo ìgwè atụrụ na-ala n’iyi.+ Ndị na-azụ ha emewo ka ha na-awagharị.+ Ha eduruwo ha gaa n’elu ugwu.+ Ha esiwo n’otu ugwu gaa n’ugwu ọzọ. Ha echefuwo ebe izu ike ha.+  Ndị niile hụrụ ha eripịawo ha,+ ndị iro ha asịwo,+ ‘Ikpe agaghị ama anyị,+ n’ihi na ha emehiewo Jehova bụ́ ebe obibi nke ezi omume+ na olileanya nke ndị nna nna ha,+ bụ́ Jehova.’”  “Sinụ n’ime Babịlọn gbapụ, sikwanụ n’ala ndị Kaldia pụọ,+ dịrịnụ ka mkpi ma ọ bụ ebule nke na-ebutere ìgwè ewu ma ọ bụ ìgwè atụrụ ụzọ.+  N’ihi na, lee, m ga-akpali ìgwè mba ukwu ndị si n’ala dị n’ebe ugwu,+ kpọtakwa ha ka ha bịa buso Babịlọn agha, ha ga-ahazi onwe ha buso ya agha.+ A ga-esi ebe ahụ weghara ya.+ Akụ́ ha yiri nke dike nke na-agbawa ndị mụrụ ụmụ aka ụmụ, nke na-adịghị alọta n’emezughị ihe ọ gara.+ 10  Kaldia ga-aghọ ihe a kwatara n’agha.+ Afọ ga-eju ndị niile ga-akwakọrọ ihe dị n’ime ya,”+ ka Jehova kwuru. 11  “N’ihi na unu nọ na-aṅụrị ọṅụ,+ n’ihi na unu nọ na-enwe obi ụtọ mgbe unu nọ na-apụnara ihe nketa m ihe.+ N’ihi na unu nọ na-awụgharị dị ka nwa ehi nke nọ n’ebe ahịhịa puru ọhụrụ,+ unu wee na-ebe ubé dị ka oké ịnyịnya.+ 12  Ihere emewo nne unu nke ukwuu.+ E mechuwo nwaanyị mụrụ unu ihu.+ Lee! Ọ bụ ya dịkarịsịrị ala n’ime mba niile, ọ bụ ala ịkpa mmiri na-adịghị nakwa mbara ọzara.+ 13  Mmadụ agaghị ebi n’ime ya n’ihi iwe Jehova,+ ọ ga-aghọ ebe tọgbọrọ n’efu kpamkpam.+ Onye ọ bụla na-agafere Babịlọn ga-ekporopụ anya na-ele ya ma fụọ mkpọrọhịhị n’ihi ihe otiti niile e tiri ya.+ 14  Hazienụ onwe unu buso Babịlọn agha n’akụkụ niile,+ unu ndị niile na-ekwe ụta.+ Gbaanụ ya ụta.+ Unu agbafọkwala akụ́ ọ bụla, n’ihi na ọ bụ Jehova ka o mehiere.+ 15  Nọrọnụ n’akụkụ niile tie mkpu agha megide ya.+ Ọ chịliwo aka elu.+ Ogidi ya niile adawo. A kwatuwo mgbidi ya niile.+ N’ihi na ọ bụ ịbọ ọbọ Jehova.+ Bọọnụ ọbọ n’ahụ́ ya. Meenụ ya ihe o mere ndị ọzọ.+ 16  Gbuonụ onye na-agha mkpụrụ na Babịlọn,+ tinyere onye ji mma na-ewe ihe ubi n’oge owuwe ihe ubi. N’ihi mma agha nke na-emesi ha ike, onye ọ bụla n’ime ha ga-alakwuru ndị ya, onye ọ bụla n’ime ha ga-agbala n’ala ya.+ 17  “Izrel bụ atụrụ a chụsasịrị achụsasị.+ Ọ bụ ọdụm chụsasịrị ha.+ Eze Asiria ripịara ha na nke mbụ.+ Nebukadreza eze Babịlọn tara ọkpụkpụ ha na nke ikpeazụ a.+ 18  Ya mere, nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, ‘Lee, m ga-elebara eze Babịlọn na ala ya anya, otú ahụ m si lebara eze Asiria anya.+ 19  M ga-akpọghachite Izrel n’ala ịta ahịhịa ya,+ ọ ga-atakwa nri n’ugwu Kamel+ nakwa na Beshan;+ afọ ga-ejukwa mkpụrụ obi ya n’ógbè Ifrem+ na Gilied+ ndị bụ́ ugwu ugwu.’” 20  “N’ụbọchị ndị ahụ nakwa n’oge ahụ,”+ ka Jehova kwuru, “a ga-achọ njehie Izrel,+ ma ọ gaghị adị; a ga-achọkwa mmehie Juda,+ ma a gaghị ahụ ya, n’ihi na m ga-agbaghara ndị m hapụrụ ka ha fọdụ.”+ 21  “Buso ala Merateyim agha,+ busokwa ndị bi na Pikọd agha.+ Ka e gbuchapụ ha, laakwa ha n’iyi,” ka Jehova kwuru, “meekwa ihe niile m nyere gị n’iwu.+ 22  A na-anụ mkpọtụ agha n’ala ahụ, e nwekwara oké mbibi.+ 23  Lee nnọọ ka e si gbujie ma gbajie+ hama e ji akpụ ụ́zụ́+ nke ụwa dum! Lee nnọọ ka Babịlọn si ghọọ naanị ihe ijuanya n’etiti mba niile!+ 24  M siiri gị ọnyà, ọ matawo gị, gị Babịlọn, ma ị maghị.+ A chọtara gị ma jide gị, n’ihi na ọ bụ Jehova ka ị lụsoro ọgụ.+ 25  “Jehova emeghewo ụlọ nkwakọba ihe ya, ọ na-ewepụtakwa ngwá agha amamikpe ya.+ N’ihi na ọ dị ọrụ Ọkaakaa+ Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, ga-arụ n’ala ndị Kaldia.+ 26  Si n’ebe kasị anya bịa wakpo ya.+ Meghee ebe ọ na-echekwa mkpụrụ.+ Kpokọta ya dị ka e si ekpokọta mkpụrụ,+ bibie ya.+ Ka ọ ghara inwe onye ga-afọdụ n’ime ya.+ 27  Gbuo ụmụ oké ehi ya niile.+ Ka e gbuo ha.+ Ahụhụ ga-adịrị ha n’ihi na ụbọchị ha, bụ́ oge a ga-elebara ha anya, eruwo!+ 28  “A na-anụ mkpọtụ nke ndị na-agba ọsọ nakwa nke ndị si n’ala Babịlọn na-agbapụ+ ka ha gaa Zayọn kọsaa ọbọ Jehova bụ́ Chineke anyị bọrọ,+ ya bụ, ọbọ ọ bọrọ n’ihi ụlọ nsọ ya.+ 29  “Kpọkọọnụ ndị na-agba ụta, ndị niile na-ekwe ụta,+ ka ha buso Babịlọn agha. Maanụ ụlọikwuu gburugburu ya. Ka onye ọ bụla ghara isi na ya gbapụ.+ Kwụọnụ ya ụgwọ dị ka omume ya si dị.+ Meenụ ya dị ka ihe niile o mere si dị.+ N’ihi na ọ bụ Jehova, bụ́ Onye Nsọ Izrel, ka o mesoro omume mpako.+ 30  Ya mere, ụmụ okorobịa ya ga-ada n’ámá ya dị iche iche,+ a ga-egbukwa ndị agha ya niile n’ụbọchị ahụ,”+ ka Jehova kwuru. 31  “Lee! M na-emegide gị,+ gị Mpako,”+ ka Ọkaakaa+ Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, kwuru, “n’ihi na ụbọchị gị ga-abịa, bụ́ oge m ga-elebara gị anya. 32  Mpako ga-asụ ngọngọ wee daa,+ ọ gaghị enwe onye ga-eme ka o bilie.+ M ga-esunye obodo ya niile ọkụ, ọ ga-erepịakwa ebe niile gbara ya gburugburu.”+ 33  Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru: “A na-emegbu ụmụ Izrel na ụmụ Juda, ndị niile dọọrọ ha n’agha ejichiwo ha.+ Ha ajụwo ịhapụ ha ka ha laa.+ 34  Onye Mgbapụta ha dị ike,+ aha ya bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha.+ Ọ ghaghị ikpechite ọnụ ha,+ ka o wee mee ka ala ha zuru ike,+ meekwa ka ndị bi na Babịlọn maa jijiji.”+ 35  “Mma agha ga-egbu ndị Kaldia+ na ndị bi na Babịlọn+ na ndị isi ya+ na ndị amamihe ya,”+ ka Jehova kwuru. 36  “Mma agha ga-egbu ndị na-etu ọnụ,+ ha ga na-ezuzukwa nzuzu.+ Mma agha ga-egbu ndị dike ya,+ ụjọ ga-ejidekwa ha.+ 37  Mma agha ga-egbu ịnyịnya ha,+ bibie ụgbọ ịnyịnya agha ha, gbuokwa ìgwè mmadụ niile gwara ọgwa nọ n’ime ya,+ ha ga-aghọkwa ndị inyom.+ Mma agha ga-ebibi akụ̀ ya,+ a ga-ebukọrọkwa ya. 38  A ga-ala mmiri ya niile n’iyi, ha ga-atakwa.+ N’ihi na ọ bụ ala ihe oyiyi a pịrị apị,+ ha na-eme ara ara n’ihi ọhụụ na-emenye ụjọ ha na-ahụ. 39  Ya mere, anụ ọhịa ndị bi n’ebe mmiri na-adịghị na anụ ndị na-agbọ ụja ga-ebi, enyí nnụnụ ga-ebikwa na ya;+ mmadụ agaghị ebi n’ime ya ọzọ, ọ gaghịkwa adị site n’otu ọgbọ ruo n’ọgbọ ọzọ.”+ 40  “Dị nnọọ ka ọ dị mgbe Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra+ na obodo ndị dị ya nso,”+ ka Jehova kwuru, “ọ dịghị onye ga-ebi n’ebe ahụ, ọ dịghị nwa nke mmadụ ga-ebi na ya dị ka ọbịa.+ 41  “Lee! Otu ndị si n’ebe ugwu na-abịa; a ga-esi n’ime ime ụwa+ kpalie otu mba ukwu+ na ndị eze ukwu.+ 42  Ha na-eji ụta na árọ̀.+ Obi tara ha mmiri, ha agaghịkwa eme ebere.+ Mkpọtụ ha dị ka nke ebili mmiri nke oké osimiri,+ ha ga-agbarakwa ịnyịnya bịa;+ ha jikọrọ aka ibuso gị agha, gị ada bụ́ Babịlọn.+ 43  “Eze Babịlọn anụwo akụkọ banyere ha,+ aka ya wee kụda.+ Nsogbu dị! Ọ nọ n’oké ihe mgbu, dị nnọọ ka nwaanyị na-amụ nwa.+ 44  “Lee! Otu onye ga-abịa dị ka ọdụm nke si n’obere ọhịa tojuru etoju, nke dị n’akụkụ Jọdan, banye n’ebe ịta nri nke na-adịte aka,+ ma, m ga-eme ka ha si n’ebe ahụ gbaa ọsọ n’otu ntabi anya.+ M ga-eme ka onye m họọrọ bụrụ onye na-elekọta ya.+ N’ihi na ònye dị ka m,+ ònye ga-amakwa m aka,+ ònyekwa bụ onye ọzụzụ atụrụ nke pụrụ iguzo n’ihu m?+ 45  Ya mere, nụrụnụ ihe Jehova kpebiri+ ime Babịlọn,+ na ihe o bu n’uche ime ala ndị Kaldia.+ N’ezie, a ga na-adọkpụrụ ụmụ atụrụ si n’ìgwè atụrụ ha.+ N’ezie, ọ ga-eme ka ebe ịta nri ha tọgbọrọ n’efu n’ihi ha.+ 46  Mkpọtụ nke ga-eme mgbe a ga-eweghara Babịlọn ga-eme ka ụwa maa jijiji,+ a ga-anụkwa mkpu ákwá n’etiti mba dị iche iche.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji