Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jeremaya 45:1-5

45  Nke a bụ okwu Jeremaya onye amụma gwara Barọk+ nwa Neraya n’oge o dere ihe ndị a Jeremaya+ kwuru n’akwụkwọ n’afọ nke anọ nke ọchịchị Jehoyakim+ nwa Josaya, bụ́ eze Juda, sị:  “Nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru banyere gị, Barọk,  ‘Ị sịwo: ‘Efuola m,+ n’ihi na Jehova atụkwasịwo iru uju n’ihe mgbu m! Ike agwụwo m n’ihi ude m na-asụ, enweghịkwa m ebe izu ike.”’+  “Gwa ya, sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Lee! M ga-etida ihe m wuru, m ga-efopụkwa ihe m kụrụ, bụ́ ala a dum.+  Ma gị onwe gị, ị na-achọrọ onwe gị ihe ukwu.+ Kwụsị ịchọ ya.”’+ “‘N’ihi na, lee, m ga-eme ka ọdachi dakwasị anụ ahụ́ niile,’+ ka Jehova kwuru, ‘ma m ga-enye gị mkpụrụ obi gị ka ọ bụụrụ gị ihe nkwata n’ebe niile ị ga-aga.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji