Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jeremaya 44:1-30

44  Nke a bụ okwu ruru Jeremaya ntị maka ndị Juu niile bi n’ala Ijipt,+ bụ́ ndị bi na Migdọl+ na Tapanhis+ na Nọf+ nakwa n’ala Patrọs,+ sị:  “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, ‘Unu onwe unu hụrụ ọdachi dum m mere ka ọ dakwasị Jeruselem+ na obodo niile dị na Juda, lee, taa, ha bụ ebe a lara n’iyi, ọ dịghịkwa onye bi n’ime ha.+  Ọ bụ n’ihi ihe ọjọọ ha mere iji kpasuo m iwe site n’ịga na-esurere chi ọzọ dị iche iche ihe nsure ọkụ+ ma na-efe ha ofufe, bụ́ chi dị iche iche ha onwe ha na unu onwe unu na nna nna unu hà na-amaghị.+  M wee na-ezitere unu ndị ohu m niile bụ́ ndị amụma, na-ebili n’isi ụtụtụ na-ezite ha,+ na-asị: “Biko, unu emela ụdị ihe arụ a m kpọrọ asị.”+  Ma ha egeghị ntị,+ ha atọghịkwa ntị n’ala ka ha wee hapụ ihe ọjọọ ha na-eme, site n’ịhapụ isurere chi ọzọ dị iche iche ihe nsure ọkụ.+  M wee wụpụ ọnụma m na iwe m, o wee na-ere ka ọkụ n’obodo ndị dị na Juda nakwa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem;+ ha wee ghọọ ebe a lara n’iyi, ebe tọgbọrọ n’efu, dị ka ọ dị taa.’+  “Ugbu a, nke a bụ ihe Jehova, Chineke nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, ‘Gịnị mere unu ji na-akpatara mkpụrụ obi unu oké ọdachi,+ ka e wee bipụ n’etiti unu nwoke na nwaanyị, nwatakịrị na nwa na-aṅụ ara,+ n’etiti Juda, ka unu ghara inwe ndị ga-afọdụrụ unu?  N’ihi na unu ji ọrụ aka unu na-akpasu m iwe site n’isurere chi ọzọ dị iche iche ihe nsure ọkụ+ n’ala Ijipt, bụ́ ebe unu na-abanye ka unu biri dị ka ndị ọbịa; ka unu wee mee ka e bipụ unu, ka unu wee ghọọkwa ihe ịbụ ọnụ na ihe nkọcha n’etiti mba niile nke ụwa.+  Ùnu echefuola omume ọjọọ nke nna nna unu hà+ na omume ọjọọ nke ndị eze Juda+ na omume ọjọọ nke ndị nwunye ha+ na omume ọjọọ nke unu onwe unu na omume ọjọọ nke ndị nwunye unu,+ bụ́ nke ha mere n’ala Juda nakwa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem? 10  O wuteghị ha ruo taa,+ ha atụghịkwa egwu,+ ha ejeghịkwa ije n’iwu m+ nakwa n’ụkpụrụ m ndị m nyere unu na nna nna unu hà.’+ 11  “Ya mere, nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, ‘Lee, m ga-eche ihu n’ebe unu nọ iwetara unu ọdachi na ibipụ Juda dum.+ 12  M ga-ejide ndị Juda fọdụrụ bụ́ ndị chere ihu ka ha banye n’ala Ijipt gaa biri n’ime ya dị ka ndị ọbịa,+ ha niile ga-anwụ n’ala Ijipt.+ Mma agha ga-egbu ha; ụnwụ ga-egbu ha,+ malite n’onye kasị nta ruo ọbụna n’onye kasị ukwuu; mma agha na ụnwụ ga-egbu ha. Ha ga-aghọ ihe a bụrụ ọnụ, ihe ijuanya na ihe nkọcha na ihe ịkwa emo.+ 13  M ga-eji mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe mee ka ndị bi n’ala Ijipt zaa ajụjụ, dị nnọọ ka m mere ka Jeruselem zaa ajụjụ.+ 14  A gaghị enwe onye ga-agbapụ ma ọ bụ onye ga-alanahụ n’ime ndị Juda fọdụrụ, bụ́ ndị na-abanye n’ala Ijipt ka ha biri n’ime ya dị ka ndị ọbịa.+ N’ezie, ha agaghị alọta n’ala Juda bụ́ ebe na-agụsi mkpụrụ obi ha agụụ ike ka ha laghachi gaa biri;+ n’ihi na ha agaghị alaghachi, ma e wezụga mmadụ ole na ole ndị ga-agbapụ.’” 15  Ndị ikom niile bụ́ ndị maara na ndị nwunye ha na-esurere chi ọzọ dị iche iche ihe nsure ọkụ+ nakwa ndị nwunye ha niile, bụ́ ọgbakọ dị ukwuu, tinyere ndị niile bi n’ala Ijipt,+ n’ime Patrọs,+ wee zaa Jeremaya, sị: 16  “Anyị agaghị ege ntị n’okwu ị gwara anyị n’aha Jehova;+ 17  kama anyị ga-eme ihe niile anyị ji ọnụ anyị kwuo,+ ya bụ, isurere ‘eze nwaanyị nke eluigwe’+ ihe nsure ọkụ na ịwụsara ya àjà ihe ọṅụṅụ+ dị nnọọ ka anyị onwe anyị+ na nna nna anyị hà+ na ndị eze anyị+ na ndị isi anyị mere n’obodo ndị dị na Juda nakwa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem, mgbe anyị na-eriju afọ, mgbe ihe dịkwaara anyị mma, anyị ahụghịkwa ọdachi ọ bụla ma ọlị.+ 18  Ma kemgbe anyị kwụsịrị isurere ‘eze nwaanyị nke eluigwe’+ ihe nsure ọkụ na ịwụsara ya àjà ihe ọṅụṅụ, ihe niile akọọla anyị, mma agha na ụnwụ egbuchawo anyị.+ 19  “Mgbe anyị na-esurere ‘eze nwaanyị nke eluigwe’+ ihe nsure ọkụ ma na-awụsara ya àjà ihe ọṅụṅụ,+ ọ̀ bụ na anyị adịghị agwa ndị di anyị mgbe anyị na-eme achịcha e ji achụrụ ya àjà, bụ́ ndị anyị na-akpụ n’oyiyi ya, nakwa mgbe anyị na-awụsara ya àjà ihe ọṅụṅụ?”+ 20  Ma mmadụ niile ahụ, bụ́ ndị dimkpa na ndị nwunye ha, ya bụ, mmadụ niile ahụ bụ́ ndị sara Jeremaya okwu, ọ gwara ha, sị: 21  “Ọ́ bụghị ihe nsure ọkụ ahụ unu surere n’obodo ndị dị na Juda nakwa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem,+ unu onwe unu+ na nna nna unu hà,+ ndị eze unu+ na ndị isi unu+ na ndị ala unu, ka Jehova chetara, ọ́ bụghịkwa ya batara ya n’obi?+ 22  N’ikpeazụ, Jehova enwekwaghị ike idi ya n’ihi omume ọjọọ unu, n’ihi ihe arụ unu mere,+ ala unu wee bụrụ ebe a lara n’iyi na ihe ijuanya na ihe a bụrụ ọnụ, n’enweghị onye bi ya, dị ka ọ dị taa.+ 23  N’ihi na unu surere ihe nsure ọkụ,+ mehiekwa Jehova+ wee ghara irube isi n’ihe Jehova kwuru,+ unu ejeghịkwa ije n’iwu ya+ nakwa n’ụkpụrụ ya nakwa n’ihe ncheta ya, ọ bụ ya mere ọdachi a ji dakwasị unu taa.”+ 24  Jeremaya wee gaa n’ihu ịgwa mmadụ niile, tinyere ndị inyom niile, sị: “Ndị Juda niile, bụ́ ndị nọ n’ala Ijipt, nụrụnụ ihe Jehova kwuru.+ 25  Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, ‘Unu onwe unu na ndị nwunye unu,+ unu ndị inyom jikwa ọnụ unu na-ekwu, (unu ejiriwokwa aka unu mezuo ya,) sị: “Anyị aghaghị imezu nkwa anyị kwere+ isurere ‘eze nwaanyị nke eluigwe’+ ihe nsure ọkụ na ịwụsara ya àjà ihe ọṅụṅụ.”+ Unu ndị inyom ga-emezurịrị nkwa unu, unu aghaghị imezu nkwa unu kwere.’ 26  “Ya mere, ndị Juda niile bi n’ala Ijipt,+ nụrụnụ okwu Jehova, ‘“Lee, mụ onwe m ejiriwo aha ukwu m ṅụọ iyi,”+ ka Jehova kwuru, “na ọ dịghị onye Juda ọ bụla ga-eji ọnụ ya kpọọ aha m n’ala Ijipt dum ọzọ,+ sị, ‘Dị nnọọ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị bụ́ Jehova dị ndụ!’+ 27  Lee, m mụ anya n’ebe ha nọ iji kpatara ha ọdachi, ọ bụghị imere ha ihe ọma;+ mma agha na ụnwụ ga-egbu ndị Juda niile fọdụrụnụ, ndị nọ n’ala Ijipt, ruo mgbe ha ga-agwụcha.+ 28  Ndị gbanahụrụ mma agha ga-esi n’ala Ijipt laghachi n’ala Juda, ha ga-adị ole na ole;+ ndị Juda niile fọdụrụ, bụ́ ndị na-abata n’ala Ijipt ka ha biri n’ime ya dị ka ndị ọbịa, ga-amata onye okwu ya ga-emezu, ihe m kwuru ka ọ̀ bụ ihe ha kwuru.”’”+ 29  “‘Nke a ga-abụrụ unu ihe ịrịba ama,’+ ka Jehova kwuru, ‘na m ga-elebara unu anya n’ebe a, ka unu wee mara na okwu m kwuru aghaghị imezu, ya bụ, na ọdachi ga-adakwasị unu:+ 30  Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Lee, m ga-enyefe Fero Họfra, bụ́ eze Ijipt,+ n’aka ndị iro ya nakwa n’aka ndị na-achọ mkpụrụ obi ya,+ dị nnọọ ka m nyefere Zedekaya eze Juda n’aka Nebukadreza eze Babịlọn, bụ́ onye iro ya na onye na-achọ mkpụrụ obi ya.”’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji