Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jeremaya 43:1-13

43  O wee ruo na ozugbo Jeremaya gwachara mmadụ niile ahụ ihe niile Jehova bụ́ Chineke ha kwuru, nke Jehova bụ́ Chineke ha gwara ya ka ọ gwa ha, bụ́ okwu a niile,+  Azaraya nwa Hoshaya+ na Johenan+ nwa Kariya na ndị ikom niile dị mpako+ sịrị Jeremaya: “Ọ bụ ụgha ka ị na-agha.+ Ọ bụghị Jehova bụ́ Chineke anyị ziri gị ka ị gwa anyị, sị, ‘Unu abanyela Ijipt gaa biri dị ka ndị ọbịa.’+  Kama ọ bụ Barọk+ nwa Neraya na-akpali gị imegide anyị iji nyefee anyị n’aka ndị Kaldia, ka ha gbuo anyị ma ọ bụ dọrọ anyị n’agha laa Babịlọn.”+  Johenan nwa Kariya na ndị ọchịagha niile na ndị ahụ niile erubeghị isi n’ihe Jehova kwuru,+ ya bụ, ibiri n’ala Juda.+  Johenan nwa Kariya na ndị ọchịagha niile ahụ wee kpọrọ ndị Juda niile fọdụrụ bụ́ ndị si ná mba niile a chụsasịrị ha lọta ka ha wee biri na Juda ruo nwa oge,+  ya bụ, ndị dimkpa na ndị nwunye ha na ụmụntakịrị ha na ụmụ nwaanyị eze mụrụ+ na mkpụrụ obi niile Nebuzaradan+ bụ́ onyeisi ndị nche hapụrụ ka ha na Gedalaya+ nwa Ahaịkam+ nwa Shefan+ nọrọ, tinyere Jeremaya onye amụma na Barọk+ nwa Neraya.  N’ikpeazụ, ha batara n’ala Ijipt,+ n’ihi na ha erubeghị isi n’ihe Jehova kwuru; ha wee bịarute Tapanhis.+  Okwu Jehova wee ruo Jeremaya ntị na Tapanhis, sị:  “Buru nkume ndị buru ibu, nọrọ n’ihu ndị Juu zoo ha n’ụrọ nke dị n’ebe e doro brik, nke dị n’ebe e si abanye n’ụlọ Fero n’obodo Tapanhis.+ 10  Sịkwa ha, ‘Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru: “Lee, m ga-ezi ozi, m ga-akpọrọ Nebukadreza eze Babịlọn,+ bụ́ ohu m,+ m ga-edebe ocheeze ya kpọmkwem n’elu nkume ndị a m zoro, ọ ga-agbasakwa ụlọikwuu ọma ya n’elu ha. 11  Ọ ga-abata bibie ala Ijipt.+ Onye ọ bụla ajọ ọrịa ga-egbu, ajọ ọrịa ga-egbu ya, onye ọ bụla a ga-adọrọ n’agha, a ga-adọrọ ya n’agha, onye ọ bụla mma agha ga-egbu, mma agha ga-egbu ya.+ 12  M ga-amụnye ụlọ chi niile nke Ijipt ọkụ;+ ọ ga-agba ha ọkụ ma buru ha laa, ọ ga-eyiri ala Ijipt, dị nnọọ ka onye ọzụzụ atụrụ na-eyiri uwe mwụda ya,+ ọ ga-esikwa na ya laa n’udo. 13  Ọ ga-akụrisị ogidi niile nke Bet-shimesh, nke dị n’ala Ijipt; ọ ga-agbakwa ụlọ chi niile nke Ijipt ọkụ.”’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji