Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jeremaya 39:1-18

39  N’afọ nke itoolu nke ọchịchị Zedekaya eze Juda, n’ọnwa nke iri,+ Nebukadreza eze Babịlọn na ndị agha ya niile bịara Jeruselem wee malite ịnọchibido ya.+  N’afọ nke iri na otu nke ọchịchị Zedekaya, n’ọnwa nke anọ, n’abalị itoolu n’ọnwa ahụ, a kwaturu mgbidi obodo ahụ.+  Ndị niile eze Babịlọn mere ndị isi, ya bụ, Negal-shariza, Samga-nibo, Sasekim, Rabsaris, Negal-shariza bụ́ Rabmag na ndị niile ọzọ eze Babịlọn mere ndị isi, wee bata nọdụ ala n’Ọnụ Ụzọ Ámá Etiti.+  O wee ruo na ozugbo Zedekaya eze Juda na ndị agha niile hụrụ ha, ha malitere ịgba ọsọ,+ ha wee si n’ụzọ e si aga n’ubi eze,+ n’ọnụ ụzọ ámá nke dị n’agbata mgbidi abụọ, na-agbapụ n’obodo ahụ n’abalị; ha wee na-agbaga n’ụzọ gara Araba.+  Ndị agha ndị Kaldia wee chụwa ha,+ ha wee chụkwute Zedekaya na mbara ọzara Jeriko.+ Ha wee kpụrụ ya bịakwute Nebukadreza eze Babịlọn n’ime Ribla,+ n’ala Hemat,+ ka o kpee ya ikpe.+  Eze Babịlọn wee nọrọ na Ribla gbuo+ ụmụ Zedekaya n’ihu ya,+ eze Babịlọn gbukwara ndị Juda niile a ma ama.+  Ọ rụkpọsịrị Zedekaya anya,+ e mesịa, ọ tụrụ ya ịgà e ji ọla kọpa mee, ka a kpụta ya Babịlọn.  Ndị Kaldia gbara ụlọ eze na ụlọ ndị mmadụ ọkụ,+ ha kwatukwara mgbidi Jeruselem.+  Nebuzaradan+ onyeisi ndị nche+ dọọrọ ndị fọdụrụ n’obodo ahụ n’agha laa Babịlọn,+ tinyere ndị chịliri aka elu wee gbakwute ya nakwa ndị ọzọ a hapụrụ ndụ. 10  Ma Nebuzaradan bụ́ onyeisi ndị nche hapụrụ ụfọdụ n’ime ha, bụ́ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha, ndị na-enweghị ihe ọ bụla, n’ala Juda;+ n’ụbọchị ahụ, o nyere ha ubi vaịn na ọrụ nke ọ manyere ha ka ha na-arụ.+ 11  Nebukadreza eze Babịlọn wee nye iwu banyere Jeremaya site n’ọnụ Nebuzaradan bụ́ onyeisi ndị nche, sị: 12  “Kpọrọ ya, ka anya gị dịrị n’ebe ọ nọ, emekwala ya ihe ọjọọ ọ bụla.+ Kama nke ahụ, meere ya ihe ọ bụla ọ gwara gị.”+ 13  Nebuzaradan+ onyeisi ndị nche na Nebushazban bụ́ Rabsaris, na Negal-shariza bụ́ Rabmag na ndị ikom niile welitere isi n’ọchịchị eze Babịlọn wee zie ozi; 14  ha ziri ozi, e wee kpọpụta Jeremaya n’Ogige Ndị Nche+ wee nyefee ya n’aka Gedalaya+ nwa Ahaịkam+ nwa Shefan,+ ka ọ kpọrọ ya laa n’ụlọ ya, ka o wee biri n’etiti ndị ya. 15  Okwu Jehova wee ruo Jeremaya ntị mgbe a kpọchiri ya n’Ogige Ndị Nche,+ sị: 16  “Gaa gwa Ibed-melek+ onye Itiopia, sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru: “Lee, m ga-eme ka ihe m kwuru banyere obodo a mezuo, ọ bụ ọdachi, ọ bụghị ihe ọma,+ ọ ga-eme n’ihu gị n’ụbọchị ahụ.”’+ 17  “‘M ga-anapụta gị n’ụbọchị ahụ,’+ ka Jehova kwuru, ‘a gaghị enyefe gị n’aka ndị ị na-atụ egwu.’+ 18  “‘N’ihi na m ga-emere gị ụzọ mgbapụ, mma agha agaghị egbu gị; mkpụrụ obi gị ga-abụrụ gị ihe nkwata,+ n’ihi na ị tụkwasịrị m obi,’+ ka Jehova kwuru.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji