Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jeremaya 35:1-19

35  Nke a bụ okwu Jehova nke ruru Jeremaya ntị n’ụbọchị Jehoyakim+ nwa Josaya, eze Juda, sị:  “Gaa n’ụlọ ndị Rikab,+ gwa ha okwu, kpọbatakwa ha n’ụlọ Jehova, n’otu n’ime ụlọ iri ihe; bunyekwa ha mmanya ka ha ṅụọ.”  M wee kpọrọ Jeazanaya nwa Jeremaya nwa Habazinaya na ụmụnne ya, na ụmụ ya niile, na ezinụlọ dum nke ndị Rikab,  kpọbata ha n’ụlọ Jehova, n’ụlọ iri ihe+ nke ụmụ Henan nwa Igdalaya, onye nke ezi Chineke, nke dị n’akụkụ ụlọ iri ihe nke ndị isi, nke dị n’elu ụlọ iri ihe Measaya nwa Shalọm,+ onye nche ọnụ ụzọ.  M wee dọba arịa dị iche iche mmanya juru, chịsakwa iko, n’ihu ndị si n’ụlọ Rikab wee sị ha: “Ṅụọnụ mmanya.”  Ma ha sịrị: “Anyị agaghị aṅụ mmanya, n’ihi na Jọnadab nwa Rikab,+ bụ́ nna nna anyị, nyere anyị iwu, sị, ‘Unu aṅụla mmanya, ma unu ma ụmụ unu, ruo mgbe a na-akaghị aka.+  Unu ewula ụlọ, unu aghakwala mkpụrụ; unu akọla ubi vaịn, unu enwekwala ubi vaịn. Kama ọ bụ n’ụlọikwuu ka unu ga-ebi n’ụbọchị unu niile, ka unu wee bie ogologo oge n’elu ala bụ́ ebe unu bi dị ka ndị ọbịa.’+  Anyị wee na-erubere Jehọnadab nwa Rikab bụ́ nna nna anyị isi n’ihe niile o nyere anyị n’iwu+ wee ghara ịṅụ mmanya ụbọchị anyị niile, ma anyị ma ndị nwunye anyị ma ụmụ anyị ndị ikom ma ụmụ anyị ndị inyom,+  gharakwa iwuru onwe anyị ụlọ obibi, ka anyị wee ghara inwe ubi vaịn ma ọ bụ ala ma ọ bụ mkpụrụ. 10  Anyị bi n’ụlọikwuu wee na-erube isi, na-emekwa ihe niile Jọnadab+ nna nna anyị nyere anyị n’iwu.+ 11  Ma o ruru na mgbe Nebukadreza eze Babịlọn gbagotere ibuso ala a agha,+ anyị malitere ịsị, ‘Bịanụ ka anyị banye Jeruselem n’ihi ndị agha ndị Kaldia nakwa n’ihi ndị agha ndị Siria, ka anyị biri na Jeruselem.’”+ 12  Okwu Jehova wee ruo Jeremaya ntị, sị: 13  “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, ‘Gaa gwa ndị Juda na ndị bi na Jeruselem, sị: “Ọ̀ bụ na a nọghị na-agba unu ume ka unu rube isi n’okwu m?”+ ka Jehova kwuru. 14  “E debewo ihe Jehọnadab nwa Rikab kwuru,+ bụ́ iwu o nyere ụmụ ya ka ha ghara ịṅụ mmanya, ha aṅụbeghịkwa mmanya ọ bụla ruo taa, n’ihi na ha na-erube isi n’iwu nna nna ha nyere ha.+ Ma mụ onwe m agwawo unu okwu, na-ebili n’isi ụtụtụ na-agwa unu okwu,+ ma unu adịghị erube isi.+ 15  Anọgidere m na-ezitere unu ndị ohu m niile, bụ́ ndị amụma,+ na-ebili n’isi ụtụtụ na-ezite ha, na-asị, ‘Biko, onye ọ bụla hapụ ụzọ ọjọọ ya,+ meenụ ka omume unu dị mma,+ unu esokwala chi ọzọ dị iche iche wee fee ha ofufe.+ Birikwanụ n’ala m nyere unu na nna nna unu hà.’+ Ma unu atọghị ntị n’ala, unu egeghịkwa m ntị.+ 16  Ma ụmụ Jehọnadab nwa Rikab+ edebewo ihe nna nna ha nyere ha n’iwu;+ ma ndị a adịghị ege m ntị.”’”+ 17  “Ya mere, nke a bụ ihe Jehova, Chineke nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, ‘Lee, m ga-eme ka ọdachi dum m kwuru na ọ ga-adakwasị Juda na ndị niile bi na Jeruselem dakwasị ha,+ n’ihi na m gwara ha okwu ma ha egeghị ntị, m nọkwa na-akpọ ha ma ha azaghị.’”+ 18  Ma, Jeremaya gwara ezinụlọ ndị Rikab, sị: “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, ‘Ebe ọ bụ na unu erubewo isi n’iwu Jehọnadab+ bụ́ nna nna unu, na-edebe ihe niile o nyere unu n’iwu, na-emekwa ihe niile ọ gwara unu mee,+ 19  ya mere, nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru: “Ọ dịghị mgbe a na-agaghị enwe onye si n’ụlọ Jọnadab nwa Rikab nke ga na-eguzo+ n’ihu m mgbe niile.”’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji