Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jeremaya 31:1-40

31  “N’oge ahụ,” ka Jehova kwuru, “m ga-abụrụ ezinụlọ niile nke Izrel Chineke; ha ga-abụkwa ndị m.”+  Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “E meere ndị mma agha na-egbughị amara n’ala ịkpa,+ mgbe Izrel nọ na-aga ka o nweta ebe izu ike.”+  Jehova si n’ebe dị anya pụta ìhè n’ihu m, sị: “Enwere m ịhụnanya na-adịru mgbe ebighị ebi n’ebe ị nọ.+ Ọ bụ ya mere m ji were obiọma* dọta gị.+  Gị nwa agbọghọ na-amaghị nwoke bụ́ Izrel, m ka ga-ewughachi gị,+ i wee bụrụ ebe e wughachiri ewughachi. Ị ga-eji obere ịgbà gị chọọ onwe gị mma ọzọ wee na-agba egwú dị ka ndị obi dị ụtọ.+  Ị ka ga-akọ ubi vaịn n’ugwu Sameria.+ Ndị na-akọ ya ga-akọ ya, malitekwa iri mkpụrụ ya.+  N’ihi na ụbọchị na-abịa mgbe ndị nche nọ n’ógbè Ifrem bụ́ ugwu ugwu ga-eti mkpu, sị, ‘Bilienụ, ka anyị gbagoo Zayọn, gakwuru Jehova bụ́ Chineke anyị.’”+  N’ihi na nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Jirinụ oké olu tikuo Jekọb mkpu ọṅụ, tisienụ mkpu ike dị ka ndị bụ́ ndị isi nke mba dị iche iche.+ Kọsaanụ ya.+ Nyenụ ya otuto, sị, ‘Jehova, zọpụta ndị gị, bụ́ ndị fọdụụrụ Izrel.’+  Lee, m ga-esi n’ala dị n’ebe ugwu kpọlata ha,+ m ga-esikwa n’ime ime ụwa kpọkọta ha.+ Ma onye ìsì ma onye ngwọrọ ma nwaanyị dị ime ma nwaanyị ime na-eme ga-eso ha.+ Ha ga-alọta ebe a dị ka ọgbakọ dị ukwuu.+  Ha ga-ebere ákwá lọta,+ m ga-akpọlata ha mgbe ha na-arịọ arịrịọ ka m meere ha amara. M ga-eme ka ha garuo n’iyi ndị dị na ndagwurugwu,+ n’ezi ụzọ nke a na-agaghị eme ka ha sụọ ngọngọ. N’ihi na aghọworo m Izrel Nna;+ Ifrem bụkwa ọkpara m.”+ 10  Nụrụnụ okwu Jehova, unu mba niile, kọsaanụ ya n’agwaetiti ndị dị anya,+ sị: “Onye chụsara Izrel ga-akpọkọta ha,+ ọ ga-echebe ha dị ka onye ọzụzụ atụrụ si echebe ìgwè atụrụ ya.+ 11  N’ihi na Jehova ga-agbapụta Jekọb,+ ọ ga-anapụtakwa ya n’aka onye ka ya ike.+ 12  Ha ga-abịa tie mkpu ọṅụ n’ebe dị elu na Zayọn,+ ihu ha ga na-egbuke egbuke n’ihi ịdị mma Jehova,+ n’ihi ọka* na mmanya ọhụrụ+ na mmanụ na ụmụ ìgwè ewu na atụrụ na ụmụ ehi.+ Mkpụrụ obi ha ga-adịkwa ka ubi mmiri na-ede nke ọma,+ ha agakwaghị ahụsi anya ọzọ.”+ 13  “N’oge ahụ, ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke na ụmụ okorobịa na ndị agadi ga-eji ọṅụ gbaa egwú.+ M ga-eme ka iru uju ha ghọọ ịṅụrị ọṅụ, m ga-akasi ha obi, meekwa ka ha ṅụrịa ọṅụ wee kwụsị iru uju.+ 14  M ga-eme ka ndị nchụàjà rijuo ezigbo nri afọ,+ m ga-eji ịdị mma m mee ka afọ ju ndị m,”+ ka Jehova kwuru. 15  “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘A na-anụ olu ákwá arịrị na ákwá dị ilu+ na Rema;+ Rechel+ na-akwara ụmụ ya ákwá.+ O kweghị ka a kasie ya obi n’ihi ụmụ ya,+ n’ihi na ha anọkwaghị.’”+ 16  Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “‘Ebezila ákwá, hichaa anya mmiri,+ n’ihi na ị ga-enweta ụgwọ ọrụ maka ọrụ gị,’ ka Jehova kwuru, ‘ha ga-esikwa n’ala ndị iro ha lọta.’+ 17  “‘Olileanya dịịrị gị n’ọdịnihu,’+ ka Jehova kwuru, ‘ụmụ gị ga-alọtakwa n’ókèala ha.’”+ 18  “Anụwo m ka Ifrem na-akwa ákwá arịrị,+ sị, ‘Ị gbaziwo m, ka m wee bụrụ onye a gbaziri agbazi,+ dị ka nwa ehi a na-azụghị azụ.+ Kpọghachite m, m ga-alọghachikwa,+ n’ihi na ị bụ Jehova bụ́ Chineke m.+ 19  N’ihi na m kwara ụta mgbe m lọghachiri;+ mgbe e mere ka m mara ihe, m tiri aka n’apata ụkwụ m.+ Ihere wee jide m, m wee bụrụ onye e mechuru ihu,+ n’ihi na eburuwo m nkọcha n’ihi ihe m mere n’oge m bụ okorobịa.’”+ 20  “Ọ̀ bụ na Ifrem abụghị nwa m hụrụ n’anya na nwa m na-apa apa?+ N’ihi na ruo n’ókè m kwuru okwu megide ya, ruo n’ókè ahụ ka m na-aghaghị icheta ya.+ Ọ bụ ya mere eriri afọ m ji eme mkpọtụ n’ihi ya.+ Aghaghị m inwere ya ọmịiko,”+ ka Jehova kwuru. 21  “Gwunye ihe ị ga-eji hụwa ụzọ ama. Guzobe ihe e ji ahụwa ụzọ ama.+ Mee ka obi gị dịrị n’okporo ụzọ ahụ, bụ́ ụzọ ị ga-eso.+ Gị nwa agbọghọ na-amaghị nwoke bụ́ Izrel, lọta. Lọta n’obodo gị ndị a.+ 22  Ruo ole mgbe ka ị ga na-agagharị,+ gị nwaanyị na-ekwesịghị ntụkwasị obi?+ N’ihi na Jehova ekewo ihe ọhụrụ n’ụwa: Nwaanyị ga na-agba nwa okorobịa gburugburu.” 23  Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru: “Ha ka ga-ekwu okwu a n’ala Juda nakwa n’obodo ndị dị n’ime ya, mgbe m ga-akpọkọta ndị ha a dọọrọ n’agha, sị, ‘Ka Jehova gọzie gị,+ gị ebe obibi ezi omume,+ gị ugwu nsọ.’+ 24  Juda na obodo ya niile ga-ebikọ ọnụ, ma ndị ọrụ ubi ma ndị chị ìgwè ewu na atụrụ pụta.+ 25  N’ihi na m ga-eme ka mkpụrụ obi ike gwụrụ nwee ume, m ga-emekwa ka afọ ju mkpụrụ obi niile ike gwụrụ.”+ 26  M wee teta meghee anya m; ụra m rahụrụ tọrọ m ụtọ. 27  “Lee! Oge na-abịa,” ka Jehova kwuru, “mgbe m ga-agha mkpụrụ nke bụ́ mmadụ na mkpụrụ nke bụ́ anụ ụlọ n’ụlọ Izrel nakwa n’ụlọ Juda.”+ 28  “Ọ ga-erukwa na dị nnọọ ka m mụ anya n’ebe ha nọ+ ifopụ ha, kwatuo ha, tida ha, laa ha n’iyi, bibiekwa ha,+ otú ahụ ka m ga-amụ anya n’ebe ha nọ iwulite ha, kụọkwa ha dị ka mkpụrụ,”+ ka Jehova kwuru. 29  “N’oge ahụ, ha agakwaghị asị, ‘Ọ bụ nna anyị hà rachara mkpụrụ vaịn na-achaghị acha, ma, ọ bụ ụmụ ha ka ezé na-eri izizi.’+ 30  Ma, onye nke ọ bụla ga-anwụ n’ihi njehie nke ya.+ Onye ọ bụla rachara mkpụrụ vaịn na-achaghị acha, ọ bụ ya ka ezé ga-eri izizi.” 31  “Lee! Oge na-abịa,” ka Jehova kwuru, ‘mgbe mụ na ụlọ Izrel+ na ụlọ Juda+ ga-agba ọgbụgba ndụ ọhụrụ,+ 32  ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ ahụ mụ na ndị nna nna ha gbara n’ụbọchị m seere ha n’aka si n’ala Ijipt kpọpụta ha,+ ‘bụ́ ọgbụgba ndụ m nke ha onwe ha mebiri,+ ọ bụ ezie na m bụ di nwe+ ha,’ ka Jehova kwuru.” 33  “N’ihi na nke a bụ ọgbụgba ndụ+ mụ na ụlọ Izrel ga-agba mgbe ụbọchị ndị ahụ gasịrị,”+ ka Jehova kwuru. “M ga-etinye iwu m n’ime ha,+ m ga-edekwa ya n’obi ha.+ M ga-abụ Chineke ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.”+ 34  “Onye ọ bụla n’ime ha agakwaghị akụziri enyi ya na nwanne ya,+ sị, ‘Maranụ Jehova!’+ n’ihi na ha niile ga-amara m, malite n’onye kasị nta n’ime ha ruo n’onye kasị ukwuu n’ime ha,”+ ka Jehova kwuru. “N’ihi na m ga-agbaghara ha njehie ha, agakwaghị m echeta mmehie ha.”+ 35  Nke a bụ ihe Jehova kwuru, bụ́ Onye mere ka e nwee anyanwụ nke na-enye ìhè n’ehihie,+ meekwa ka e nwee ụkpụrụ+ nke na-achị ọnwa+ na kpakpando ndị na-enye ìhè n’abalị,+ Onye na-akpasu oké osimiri ka ebili mmiri ya mewe mkpọtụ,+ Onye aha ya bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha:+ 36  “‘Ọ bụrụ na a pụrụ iwepụ ụkpụrụ ndị a n’ihu m,’+ ka Jehova kwuru, ‘ndị bụ́ mkpụrụ Izrel pụkwara ịkwụsị ịbụ mba n’ihu m mgbe niile.’”+ 37  Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “‘Ọ bụrụ na a pụrụ ịtụ eluigwe atụ̀, ọ bụrụkwa na a pụrụ ịchọpụta ntọala ụwa,+ mụ onwe m pụkwara ịjụ mkpụrụ Izrel dum n’ihi ihe niile ha mere,’+ ka Jehova kwuru.” 38  “Lee! Oge na-abịa,” ka Jehova kwuru, “mgbe a ga-ewuru Jehova obodo+ malite n’Ụlọ Elu Hananel+ ruo n’Ọnụ Ụzọ Ámá Nkuku.+ 39  A ga-agbatị ụdọ e ji atụ̀ ihe+ ruo n’ugwu Gereb, ọ ga-agakwa gburugburu ruo Goa. 40  Ndagwurugwu ozu+ dum na ndagwurugwu a na-awụnye ntụ+ ya na abụba gwakọtara nakwa mbara ala niile ruo na ndagwurugwu Kidrọn,+ ruo n’akụkụ Ọnụ Ụzọ Ámá Ịnyịnya+ nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ, ga-abụ ihe dị nsọ nye Jehova.+ A gaghị efopụ ya efopụ, a gaghịkwa etida ya ọzọ ruo mgbe a na-akaghị aka.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Jer 31:3*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”
Jer 31:12*  Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.