Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jeremaya 3:1-25

3  A na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na nwoke achụpụ nwunye ya, nwaanyị ahụ ahapụ ya gaa lụọ di ọzọ, nwoke ahụ ò kwesịrị ịkpọrọ nwaanyị ahụ ọzọ?”+ Ọ̀ bụ na e merụbeghị ala ahụ?+ “Gị na ọtụtụ ndị enyi gị akwawo iko;+ ị̀ ka ga-alaghachikwute m?”+ ka Jehova kwuru.  “Lelie anya hụrụ ụzọ ndị e ji ụkwụ waa.+ Olee ebe a na-anọbeghị dinaa gị n’ike?+ N’akụkụ ụzọ ka ị nọdụrụ ala na-eche ha, dị ka onye Arebia nke nọ n’ala ịkpa;+ i wee jiri akwụna ị na-agba na ihe ọjọọ ị na-eme na-emerụ ala a.+  N’ihi ya, a kwụsịwo oké mmiri ozuzo,+ e nweghịkwa ụla mmiri.+ Egedege ihu gị aghọọla egedege ihu nke nwunye na-agba akwụna. Ihere adịghị eme gị.+  Ị̀ malitewo ugbu a na-akpọku m, sị, ‘Nna m,+ ị bụ enyi ọma m nwere n’oge m bụ nwa agbọghọ?+  Ị̀ ga-ebu iwe n’obi ruo mgbe ebighị ebi, ma ọ bụ nọrọ na-ele mmehie anyị ruo mgbe ebighị ebi?’+ Lee! I kwuwo okwu, i wee na-eme ihe ọjọọ, na-enwekwa ihe ịga nke ọma.”+  Jehova wee gwa m n’ụbọchị Josaya bụ́ eze, sị:+ “‘Ị̀ hụwo ihe Izrel na-ekwesịghị ntụkwasị obi mere?+ Ọ na-agbago n’ugwu ọ bụla dị elu,+ na-agakwa n’okpuru osisi ọ bụla jupụtara n’akwụkwọ ndụ,+ ka o wee gbaa akwụna n’ebe ahụ.+  Mgbe o mesịrị ihe ndị a, m nọ na-agwa ya ka ọ lọghachikwute m,+ ma ọ lọghachikwuteghị m; Juda wee na-ekiri nwanne ya nwaanyị nke na-aghọ aghụghọ.+  Mgbe m hụrụ ihe o mere, ebe ọ bụ na Izrel, bụ́ onye na-ekwesịghị ntụkwasị obi, akwawo iko, m chụpụrụ+ ya wee nye ya akwụkwọ m ji gbaa ya alụkwaghịm kpamkpam,+ ma nwanne ya nwaanyị nke na-aghọ aghụghọ bụ́ Juda atụghị egwu, kama ya onwe ya malitere ịga na-agba akwụna.+  Ọ na-agba akwụna n’ihi ụzọ iberiibe o si ele ihe anya, o wee na-emerụ ala ya,+ ya na nkume na osisi wee na-akwa iko;+ 10  n’agbanyeghị ihe a dum, nwanne ya nwaanyị nke na-aghọ aghụghọ bụ́ Juda ejighị obi ya dum lọghachikwute m,+ kama o ji aghụghọ lọghachikwute m,’+ ka Jehova kwuru.” 11  Jehova wee sị m: “Izrel bụ́ onye na-ekwesịghị ntụkwasị obi mere ezi omume karịa Juda nke na-aghọ aghụghọ.+ 12  Gaa kọsaa okwu ndị a n’ebe ugwu,+ sị: “‘“Lọghachi, gị Izrel bụ́ onye nnupụisi,” ka Jehova kwuru.’+ ‘“Agaghị m agbarụrụ unu ihu,+ n’ihi na ana m eguzosi ike n’ihe,”+ ka Jehova kwuru.’ ‘“Agaghị m ebu iwe n’obi ruo mgbe ebighị ebi.+ 13  Ma chebara njehie gị echiche, n’ihi na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka i mehiere.+ I wee na-eme ka ụzọ gị wasaara ndị mba ọzọ+ n’okpuru osisi ọ bụla jupụtara n’akwụkwọ ndụ,+ ma unu egeghị ntị n’olu m,” ka Jehova kwuru.’” 14  “Lọghachinụ, unu ụmụ na-enupụ isi,”+ ka Jehova kwuru. “N’ihi na mụ onwe m bụ di nwe unu;+ m ga-akpọrọ unu, otu onye n’otu obodo, kpọrọkwa mmadụ abụọ n’otu ezinụlọ, wee kpọta unu na Zayọn.+ 15  M ga-eji obi m nye unu ndị ọzụzụ atụrụ,+ ha ga-eme ka unu nwee ihe ọmụma na nghọta.+ 16  Ọ ga-erukwa na unu ga-adị ọtụtụ wee mụọ ọmụmụ n’ala unu n’oge ahụ,” ka Jehova kwuru.+ “Ha agakwaghị asị, ‘Igbe ọgbụgba ndụ Jehova!’+ ọ gaghị abatakwa ha n’obi, ha agaghịkwa echeta ya,+ ọ gaghịkwa agụ ha agụụ, a gaghịkwa arụ ya ọzọ. 17  N’oge ahụ, ha ga-akpọ Jeruselem ocheeze Jehova;+ a ga-akpọkọta+ mba niile n’ime Jeruselem+ ka ha too aha Jehova n’ebe ahụ, ha agakwaghị eje ije dị ka isi ike nke dị n’ajọ obi ha si dị.”+ 18  N’oge ahụ, ụlọ Juda na ụlọ Izrel+ ga-ejekọ+ ije, ha niile ga-esoro si n’ala dị n’ebe ugwu pụta wee banye n’ala m nyere nna nna unu hà ka ọ bụrụ ihe nketa ha.+ 19  Mụ onwe m asịwo, ‘Lee otú m si kpọbata gị n’etiti ụmụ m wee nye gị ala ahụ dị mma,+ bụ́ ihe nketa mara mma n’anya ìgwè mba dị iche iche!’ M wee kwuokwa, sị, ‘Unu ga-akpọ m “Nna m!”+ unu agaghịkwa akwụsị iso m.’ 20  ‘N’ezie, dị ka nwunye nke ji aghụghọ hapụ di ya,+ otú ahụ ka unu, bụ́ ụlọ Izrel, ghọworo m aghụghọ,’+ ka Jehova kwuru.” 21  A nụwo mkpọtụ, ịkwa ákwá, na arịrịọ ụmụ Izrel na-arịọ n’ụzọ ndị e ji ụkwụ waa. N’ihi na ha emewo ka ụzọ ha gbagọọ agbagọ;+ ha echefuwo Jehova bụ́ Chineke ha.+ 22  “Lọghachinụ, unu ụmụ na-enupụ isi.+ M ga-agwọ nnupụisi unu.”+ “Lee anyị! Anyị abịakwutewo gị, n’ihi na ọ bụ gị, Jehova, bụ Chineke anyị.+ 23  N’ezie, ugwu nta na ọgba aghara nke dị n’ugwu ukwu+ dị iche iche bụ ụgha.+ N’ezie, nzọpụta Izrel dị n’aka Jehova bụ́ Chineke anyị.+ 24  Ma ihe ihere+ eripịawo ihe nna nna anyị hà dọgbuuru onwe ha n’ọrụ malite mgbe anyị bụ ụmụaka, bụ́ ìgwè ewu na atụrụ ha, ìgwè ehi ha, na ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom. 25  Anyị na-edina ala n’ihere anyị,+ mmechuihu anyị kpataara onwe anyị ekpuchiwo anyị;+ n’ihi na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke anyị ka anyị mehiere,+ anyị onwe anyị na nna anyị hà, malite mgbe anyị bụ ụmụaka ruo taa,+ anyị erubeghịkwa isi n’ihe Jehova bụ́ Chineke anyị kwuru.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji