Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jeremaya 27:1-22

27  Ná mmalite ọchịchị Jehoyakim nwa Josaya,+ bụ́ eze Juda, okwu a si n’ọnụ Jehova ruo Jeremaya ntị, sị:  “Nke a bụ ihe Jehova gwara m, ‘Meere onwe gị agbụ na osisi yok,+ nyara ha n’olu.+  Were ha nye ndị ozi na-abịa Jeruselem ịhụ Zedekaya bụ́ eze Juda ka ha were ha gaa nye eze Idọm+ na eze Moab+ na eze ụmụ Amọn+ na eze Taya+ na eze Saịdọn.+  Nye ha iwu ha ga-enye ndị nna ha ukwu, sị: “‘“Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel,+ kwuru; ihe a ka unu ga-agwa ndị nna unu ukwu,  ‘Ọ bụ m ji ike m dị ukwuu+ na ogwe aka m gbatịrị agbatị+ kee ụwa,+ mmadụ+ na anụmanụ+ ndị nọ n’elu ụwa; enyewokwa m ya onye ziri ezi n’anya m.+  Ma ugbu a, enyefewo m ala a niile n’aka Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn,+ bụ́ ohu m;+ enyefewo m ọbụna anụ ọhịa n’aka ya ka ha jeere ya ozi.+  Mba niile ga-ejere ya na nwa ya na nwa nwa ya ozi+ ruo mgbe oge nke ala ya ruru,+ ọtụtụ mba na ndị eze ukwu ga-erigbukwa ya dị ka ohu.’+  “‘“‘Ọ ga-erukwa na mba na alaeze nke na-ejereghị ya ozi, ya bụ, Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn, nke na-anyaraghị yok eze Babịlọn n’olu, m ga-eji mma agha+ na ụnwụ+ na ọrịa na-efe efe+ lebara mba ahụ anya,’ ka Jehova kwuru, ‘ruo mgbe m mere ka ha gwụ site n’aka ya.’+  “‘“‘Ma unu egela ndị amụma unu+ na ndị na-agbara unu afa na ndị ọrọ nrọ unu+ na ndị na-emere unu anwansi na ndị dibịa afa unu,+ ntị, bụ́ ndị na-asị unu: “Unu agaghị ejere eze Babịlọn ozi.”+ 10  N’ihi na ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu, ka e wee si n’ala unu kpọga unu n’ebe dị anya; m wee chụsaa unu, unu ewee laa n’iyi.+ 11  “‘“‘Ma mba nke ga-anyara yok eze Babịlọn n’olu wee jeere ya ozi, m ga-eme ka o zuru ike n’ala ya,’ ka Jehova kwuru, ‘ọ ga-akọkwa ihe na ya, birikwa na ya.’”’”+ 12  M gwara Zedekaya+ bụ́ eze Juda okwu a niile,+ sị: “Nyaranụ yok eze Babịlọn n’olu, jeekwaranụ ya na ndị ya ozi ka unu wee dịrị ndụ.+ 13  Gịnị mere gị na ndị gị ga-eji bụrụ ndị mma agha,+ ụnwụ+ na ọrịa na-efe efe+ ga-egbu dị ka Jehova gwara mba na-ejereghị eze Babịlọn ozi? 14  Unu egela ndị amụma ntị, bụ́ ndị na-asị unu, ‘Unu agaghị ejere eze Babịlọn ozi,’+ n’ihi na ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu.+ 15  “‘N’ihi na edunyeghị m ha,’ ka Jehova kwuru, ‘kama ha na-ebu amụma ụgha n’aha m, ka m wee chụsaa unu,+ unu ewee laa n’iyi,+ unu onwe unu na ndị amụma bụ́ ndị na-eburu unu amụma.’”+ 16  M gwara ndị nchụàjà na ndị a niile, sị: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Unu egela ntị n’ihe ndị amụma na-eburu unu amụma na-ekwu, sị: “Lee! A ga-esi na Babịlọn bulata arịa ụlọ Jehova n’oge na-adịghị anya!”+ N’ihi na ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu.+ 17  Unu egela ha ntị. Jeerenụ eze Babịlọn ozi ka unu wee dịrị ndụ.+ Gịnị mere obodo a ga-eji bụrụ ebe a lara n’iyi?+ 18  Ma ọ bụrụ na ha bụ ndị amụma, ọ bụrụkwa na Jehova na-agwa ha okwu, biko, ka ha rịọ Jehova nke ụsụụ ndị agha arịrịọ+ ka a ghara iburu arịa ndị fọdụrụ n’ụlọ Jehova nakwa n’ụlọ eze Juda nakwa na Jeruselem buga Babịlọn.’ 19  “N’ihi na nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru banyere ogidi ndị ahụ+ na oké osimiri ahụ+ na ihe ndị ahụ e ji ebu ihe+ na arịa ndị fọrọ afọ, bụ́ ndị fọdụrụ n’obodo a,+ 20  bụ́ ndị Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn na-eburughị mgbe o si na Jeruselem dọrọ Jekonaya+ nwa Jehoyakim, bụ́ eze Juda, na ndị niile a ma ama na Juda nakwa na Jeruselem, n’agha laa Babịlọn;+ 21  n’ihi na nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru banyere arịa ndị fọdụrụ n’ụlọ Jehova nakwa n’ụlọ eze Juda nakwa na Jeruselem,+ 22  ‘“A ga-eburu ha laa Babịlọn,+ ọ bụkwa n’ebe ahụ ka ha ga-adị ruo mgbe m ga-elebara ha anya,”+ ka Jehova kwuru. “M ga-ebugote ha wee bulata ha ebe a.”’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji