Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jeremaya 26:1-24

26  Ná mmalite ọchịchị Jehoyakim+ nwa Josaya, bụ́ eze Juda, Jehova kwuru, sị:  “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Gaa guzoro n’ogige ụlọ Jehova,+ kwuo okwu niile m ga-enye gị iwu ka i kwuo+ banyere ndị obodo niile dị na Juda, ndị na-abata n’ụlọ Jehova ịkpọ isiala. Ewepụkwala ya ihe.+  Ikekwe, ha ga-ege ntị, onye ọ bụla n’ime ha ewee hapụ ụzọ ọjọọ ya,+ m ga-agbanwekwa obi m banyere ọdachi m bu n’obi ime ka ọ dakwasị ha n’ihi omume ọjọọ ha.+  Sị ha: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Ọ bụrụ na unu egeghị m ntị site n’ije ije n’iwu m+ nke m nyere unu,+  site n’ige ntị n’ihe ndị ohu m bụ́ ndị amụma na-ekwu, ndị m na-ezitere unu, ọbụna na-ebili n’isi ụtụtụ na-ezite ha, ndị unu na-adịghị ege ntị,+  m ga-eme ka ụlọ a dị ka nke ahụ dị na Shaịlo,+ m ga-emekwa ka obodo a ghọọ ihe a bụrụ ọnụ n’anya mba niile.’”’”+  Ndị nchụàjà na ndị amụma na mmadụ niile wee malite ịnụ ka Jeremaya na-ekwu okwu ndị a n’ụlọ Jehova.+  O wee ruo na mgbe Jeremaya kwuchara ihe niile Jehova nyere ya iwu ka ọ gwa mmadụ niile, ndị nchụàjà na ndị amụma na mmadụ niile ahụ jidere ya, sị: “Ị ga-anwụrịrị.+  Gịnị mere i ji buo amụma n’aha Jehova, sị, ‘Ụlọ a ga-adị ka nke ahụ dị na Shaịlo,+ nakwa na a ga-ebibi obodo a ka ọ ghara inwe onye bi n’ime ya’? Mmadụ niile wee na-ezukọta. Ha wee gbaa Jeremaya gburugburu n’ụlọ Jehova. 10  Ka oge na-aga, ndị isi Juda nụrụ ihe ndị a, ha wee si n’ụlọ eze bịa n’ụlọ Jehova+ ma nọdụ ala n’ebe e si abanye n’ọnụ ụzọ ámá ọhụrụ nke Jehova.+ 11  Ndị nchụàjà na ndị amụma wee malite ịgwa ndị isi na mmadụ niile, sị: “E kwesịrị ịma nwoke a ikpe ọnwụ,+ n’ihi na o buru amụma ihe unu ji ntị unu nụ banyere obodo a.”+ 12  Jeremaya wee gwa ndị isi niile na mmadụ niile, sị: “Ọ bụ Jehova zitere m ka m buo amụma ihe niile unu nụrụ banyere ụlọ a na obodo a.+ 13  Ma ugbu a, meenụ ka ụzọ unu na omume unu dị mma,+ rubekwanụ isi n’ihe Jehova bụ́ Chineke unu kwuru, Jehova ga-agbanwekwa obi ya n’ọdachi ahụ o kwuru ga-adakwasị unu.+ 14  Ma, lee, anọ m n’aka unu.+ Meenụ m ihe ọ bụla dị mma ma zie ezi n’anya unu.+ 15  Ma, ya doo unu anya na ọ bụrụ na unu egbuo m, ọ bụ ọbara na-emeghị ihe ọjọọ ka unu na-eme ka ọ dịrị n’isi unu nakwa n’isi obodo a nakwa n’isi ndị bi na ya,+ n’ihi na n’eziokwu, ọ bụ Jehova ziri m ka m bịakwute unu kwuo ihe a niile ná ntị unu.”+ 16  Ndị isi+ na mmadụ niile wee gwa ndị nchụàjà na ndị amụma, sị: “E kwesịghị ịma nwoke a ikpe ọnwụ,+ n’ihi na ọ bụ n’aha Jehova bụ́ Chineke anyị ka ọ gwara anyị okwu.”+ 17  Ụfọdụ n’ime ndị okenye ala ahụ bilikwara malite ịgwa ìgwè mmadụ ahụ dum,+ sị: 18  “Maịka+ onye Moreshet+ nọ na-ebu amụma n’ụbọchị Hezekaya bụ́ eze Juda+ wee na-agwa ndị Juda niile, sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru: “A ga-akọ Zayọn dị ka ubi,+ Jeruselem ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe,+ ugwu nke Ụlọ Nsọ ga-adị ka ebe ndị dị elu dị n’oké ọhịa.”’+ 19  Hezekaya bụ́ eze Juda na ndị Juda niile hà gburu ya? Ọ́ tụghị egwu Jehova wee mee ka obi Jehova jụrụ,+ nke mere na Jehova gbanwere obi ya n’ọdachi o kwuru ga-adakwasị ha?+ Ya mere, anyị na-akpatara mkpụrụ obi anyị oké ọdachi.+ 20  “E nwekwara nwoke nọ na-ebu amụma n’aha Jehova, ya bụ, Yuraịja nwa Shemaya onye Kiriat-jierim.+ Ọ nọ na-ebu amụma ihe a ga-eme obodo a na ala a dị ka ihe niile Jeremaya kwuru si dị. 21  Eze Jehoyakim+ na ndị dike ya niile na ndị niile o mere ndị isi nụrụ ihe ọ nọ na-ekwu, eze wee chọwa igbu ya.+ Mgbe Yuraịja nụrụ ya, ọ tụrụ egwu+ ozugbo wee gbapụ gbaga Ijipt. 22  Ma Eze Jehoyakim zigara ndị mmadụ Ijipt, o zigara Elnetan nwa Akbọ+ na ndị ọzọ Ijipt. 23  Ha wee kpọpụta Yuraịja n’Ijipt wee kpọrọ ya kpọtara Eze Jehoyakim, o wee jiri mma agha gbuo ya,+ liekwa ozu ya n’ebe a na-eli ndị nkịtị.” 24  Ọ bụkwa Ahaịkam+ nwa Shefan+ chebere Jeremaya ka a ghara inyefe ya n’aka ìgwè mmadụ ahụ ka ha gbuo ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji