Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jeremaya 21:1-14

21  Nke a bụ okwu+ Jehova nke ruru Jeremaya ntị mgbe Eze Zedekaya+ ziri Pash-họ+ nwa Malkaịja na Zefanaya+ nwa Measaya, bụ́ onye nchụàjà, ka ha gakwuru ya, sị ya:  “Biko, jụọrọ anyị Jehova ase,+ n’ihi na Nebukadreza bụ́ eze Babịlọn na-ebuso anyị agha.+ Ikekwe, Jehova ga-arụrụ anyị ọrụ ya dị ebube, nke ga-eme ka ọ hapụ anyị.”+  Jeremaya wee sị ha: “Nke a bụ ihe unu ga-agwa Zedekaya,  ‘Nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru: “Lee, m ga-eme ka ngwá agha unu ji tụgharịa megide unu, ya bụ, ngwá agha unu ji na-ebuso eze Babịlọn+ na ndị Kaldia+ nọchibidoro unu ná mpụga mgbidi unu agha, m ga-ekpokọta ha n’etiti obodo a.+  Mụ onwe m ga-eji aka a gbatịrị agbatị na ogwe aka dị ike na iwe na ọnụma na oké iwe+ buso unu agha.+  M ga-egbu ndị bi n’obodo a, ma mmadụ ma anụmanụ. Oké ọrịa na-efe efe ga-egbu ha.”’+  “‘“Mgbe nke ahụ gasịrị,” ka Jehova kwuru, “m ga-enyefe Zedekaya bụ́ eze Juda na ndị na-ejere ya ozi na ndị ya, tinyere ndị ọrịa na-efe efe na mma agha na ụnwụ gbufọrọ n’obodo a n’aka Nebukadreza bụ́ eze Babịlọn nakwa n’aka ndị iro ha nakwa n’aka ndị na-achọ mkpụrụ obi ha, ọ ga-ejikwa ihu mma agha gbuo ha.+ Ọ gaghị emere ha ebere, ọ gaghịkwa enwe ọmịiko ma ọ bụ nwee obi ebere n’ebe ha nọ.”’+  “Ị ga-agwakwa ndị a, sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Lee, m na-edebe ụzọ ndụ na ụzọ ọnwụ n’ihu unu.+  “Mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe ga-egbu onye nọdụrụ n’obodo a;+ ma onye pụrụ wee gbakwuru ndị Kaldia, bụ́ ndị nọchibidoro unu, ga-adị ndụ, mkpụrụ obi ya ga-abụrụ ya ihe nkwata.”’+ 10  “‘“N’ihi na echewo m ihu n’obodo a iwetara ya ọdachi, ọ bụghị imere ya ihe ọma,”+ ka Jehova kwuru. A ga-enyefe ya n’aka eze Babịlọn,+ ọ ga-agbakwa ya ọkụ.”+ 11  “‘Nụrụnụ ihe Jehova kwuru banyere ezinụlọ eze Juda.+ 12  Unu ụlọ Devid,+ nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Kpeenụ ikpe ziri ezi+ kwa ụtụtụ,+ napụtanụ onye a na-apụnara ihe n’aka onye na-erigbu ya,+ ka ọnụma m ghara inwuru dị ka ọkụ+ wee ree unu, n’enweghị onye ga-emenyụ ya n’ihi omume ọjọọ unu.”’+ 13  “‘Lee, m na-emegide gị, gị nwaanyị bi na ndagwurugwu,+ gị oké nkume nke dị n’ala dị larịị,’ ka Jehova kwuru. ‘Ma unu onwe unu ndị na-asị: “Ònye ga-arịdata imegide anyị? Ònye ga-abatakwa n’ebe anyị bi?”+ 14  M ga-emekwa ka unu zaa ajụjụ+ dị ka ihe unu metara si dị,’+ ka Jehova kwuru. ‘M ga-esunye oké ọhịa ya ọkụ,+ ọ ga-erepịakwa ihe niile gbara ya gburugburu.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji