Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jeremaya 19:1-15

19  Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Gaa weta ite ụrọ nke ọkpụite kpụrụ,+ kpọrọkwa ụfọdụ ndị okenye n’ime ndị m na ụfọdụ ndị okenye n’ime ndị nchụàjà.  Gaa na ndagwurugwu nwa Hinọm,+ nke dị n’ụzọ e si abanye n’Ọnụ Ụzọ Ámá Ibe Eju. Nọrọ n’ebe ahụ kwusaa okwu m ga-agwa gị.+  Kwuo, sị, ‘Nụrụnụ okwu Jehova, unu ndị eze Juda na unu ndị bi na Jeruselem.+ Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha,+ bụ́ Chineke Izrel, kwuru: “‘“Lee, m ga-eme ka ọdachi dakwasị obodo a, nke ọ ga-abụ mgbe onye ọ bụla nụrụ ya, ntị ya ga-azụ wuruwuru;+  n’ihi na ha ahapụwo m,+ meekwa ka a ghara ịmatakwa ebe a,+ nọrọkwa n’ime ya na-esurere chi ọzọ dị iche iche ihe nsure ọkụ, bụ́ chi ha na ndị nna nna ha na ndị eze Juda na-amaghị;+ ha emewo ka ọbara ndị aka ha dị ọcha jupụta n’ebe a.+  Ha wukwaara Bel ebe ndị dị elu ka ha wee na-esure ụmụ ha ndị ikom n’ọkụ ka ha bụrụ àjà a na-esurecha n’ọkụ nye Bel,+ nke bụ́ ihe m na-enyeghị n’iwu,+ nke m na-ekwuteghịkwa okwu ya, ọ bataghịkwa m n’obi.”’+  “‘“Ya mere, lee! oge na-abịa,” ka Jehova kwuru, “mgbe a na-agakwaghị akpọ ebe a Tofet+ nakwa ndagwurugwu nwa Hinọm,+ kama, a ga na-akpọ ya ndagwurugwu igbu mmadụ.  M ga-emekwa ka atụmatụ Juda na Jeruselem bụrụ ihe efu n’ebe a,+ m ga-eme ka ndị iro ha jiri mma agha gbuo ha, meekwa ka ndị na-achọ mkpụrụ obi ha gbuo ha.+ M ga-ewere ozu ha nye anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa nke ụwa ka ha rie.+  M ga-eme ka obodo a bụrụ ihe ijuanya na ihe a ga-afụrụ mkpọrọhịhị.+ Onye ọ bụla nke na-agafere ya ga-ekporopụ anya na-ele ya ma fụọ mkpọrọhịhị n’ihi ihe otiti niile e tiri ya.+  M ga-eme ka ha rie anụ ụmụ ha ndị ikom na anụ ụmụ ha ndị inyom; onye ọ bụla n’ime ha ga-eri anụ mmadụ ibe ya, n’ihi otú nnọchibido ndị iro ha na ndị na-achọ mkpụrụ obi ha ga-anọchibido ha ga-esi siere ha ike ma nye ha nsogbu.”’+ 10  “Kụwaa ite ahụ n’ihu ndị ikom ahụ ga-eso gị gaa. 11  Sị ha, ‘Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru: “Dị ka mmadụ si akụwa ite ọkpụite kpụrụ nke na a pụghị imezi ya emezi, otú ahụ ka m ga-esi kụọ ndị a na obodo a righirighi;+ a ga-elikwa ha na Tofet+ ruo mgbe a na-agakwaghị enwe ebe a ga-eli ha.”’+ 12  “‘Ọ bụ otú ahụ ka m ga-eme ebe a,’ ka Jehova kwuru, ‘meekwa ndị bi ya, ọbụna mee ka obodo a dị ka Tofet.+ 13  Ụlọ ndị dị na Jeruselem na ụlọ ndị eze Juda, bụ́ ndị na-adịghị ọcha, ya bụ, ụlọ niile dị n’elu ụlọ bụ́ ebe ha na-esurere ìgwè ihe ndị dị n’eluigwe+ ihe nsure ọkụ ma na-awụsara chi ọzọ dị iche iche àjà ihe ọṅụṅụ,+ ga-adị ka Tofet.’”+ 14  Jeremaya wee si Tofet,+ bụ́ ebe Jehova zigara ya ka ọ gaa buo amụma, lọta. O wee guzoro n’ogige nke ụlọ Jehova gwa mmadụ niile,+ sị: 15  “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, ‘Lee, m ga-eme ka ọdachi niile m kwupụtara banyere obodo a dakwasị ya, ya na obodo nta ya niile, n’ihi na ha kwesiri olu ike ka ha ghara irube isi n’okwu m.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji