Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jeremaya 17:1-27

17  “E ji mkpịsị ígwè dee mmehie Juda.+ E ji mkpịsị dayamọnd kanye ya ná mbadamba nkume nke bụ́ obi ha,+ kanyekwa ya n’elu mpi ebe ịchụàjà ha.+  Ọbụna ụmụ ha na-echeta ebe ịchụàjà ha na ogwe osisi ha dị nsọ ndị dị n’akụkụ osisi jupụtara n’akwụkwọ ndụ, n’elu ugwu ndị dị elu,+  n’ugwu ndị dị n’ọhịa. M ga-eme ka e bukọrọ ihe onwunwe gị na akụ̀ gị niile dị oké ọnụ ahịa;+ m ga-eme ka e bukọrọ ihe dị n’ebe ndị dị elu gị, n’ihi mmehie ị na-eme n’ókèala gị niile.+  I ji aka gị gbahapụ ihe nketa gị, nke m nyere gị.+ M ga-emekwa ka i jeere ndị iro gị ozi n’ala ị na-amaghị;+ n’ihi na iwe m amụnyewo unu ọkụ.+ Ọ ga na-erekwa ruo mgbe a na-akaghị aka.”  Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Onye a bụrụ ọnụ ka dimkpa nke tụkwasịrị mmadụ obi bụ,+ nke dabeere n’ogwe aka bụ́ anụ ahụ́,+ nke wepụrụ obi ya n’ebe Jehova nọ.+  Ọ ga-adị ka osisi guzo naanị ya na mbara ọzara, ọ gaghị ahụ mgbe ihe ọma bịara;+ kama ọ ga-ebi n’ebe kpọrọ nkụ n’ala ịkpa, n’ala nnu nke ọ na-adịghị onye bi ya.+  Ngọzi na-adịrị dimkpa nke tụkwasịrị Jehova obi, onye Jehova bụ obi ike ya.+  Ọ ga-adị ka osisi a kụrụ n’akụkụ mmiri, nke gbanyere mgbọrọgwụ n’akụkụ ọwa mmiri; ọ gaghịkwa ahụ mgbe okpomọkụ bịara, kama akwụkwọ ya ga na-ama pokopoko.+ Ọ gaghị echegbu onwe ya n’afọ e nwere ụkọ mmiri ozuzo,+ ọ gaghịkwa akwụsị ịmị mkpụrụ.  “Obi dị aghụghọ karịa ihe ọ bụla ọzọ, o sikwara ike njite.+ Ònye pụrụ ịmara ya? 10  Mụ onwe m bụ́ Jehova na-enyocha obi,+ na-enyocha akụrụ,+ ọbụna ịkwụ onye ọ bụla ụgwọ dị ka ụzọ ya si dị,+ dị ka ihe o metara si dị.+ 11  Dị ka ọkwà nke kpokọtara àkwá ọ na-eyighị, otú ahụ ka onye ji ikpe na-ezighị ezi na-akpa akụ̀ dị.+ Ọ ga-ahapụ ya n’ọkara ndụ ya,+ n’ikpeazụ ya, ọ ga-abụ onye na-amaghị ihe.”+ 12  Ocheeze dị ebube dị n’elu site ná mmalite;+ ọ bụ ya bụ ebe nsọ anyị.+ 13  Jehova, olileanya Izrel,+ ihere ga-eme ndị niile hapụrụ gị.+ Ndị si n’ife m ofufe dapụ,+ a ga-ede aha ha n’ájá, n’ihi na ha ahapụwo isi iyi nke mmiri na-enye ndụ, bụ́ Jehova.+ 14  Jehova, biko, gwọọ m, m ga-abụkwa onye a gwọrọ.+ Zọpụta m, m ga-abụkwa onye a zọpụtara;+ n’ihi na ị bụ otuto m.+ 15  Lee! E nwere ndị na-asị m: “Olee ebe okwu Jehova dị?+ Biko, ya mezuo.” 16  Ma mụ onwe m emeghị ngwa ngwa kwụsị ịbụ onye ọzụzụ atụrụ nke na-eso gị, ụbọchị ọdachi agụghịkwa m agụụ. Gị onwe gị maara ihe egbugbere ọnụ m kwuru; ọ bụ n’ihu gị ka m kwuru ya. 17  Abụla ihe na-emenye m ụjọ.+ Ị bụ ebe mgbaba m n’ụbọchị ọdachi.+ 18  Ka ihere mee ndị na-akpagbu m,+ ma ekwela ka ihere mee m.+ Ka ọ bụrụ ha ka ụjọ ga-ejide, ma ekwela ka ụjọ jide m. Mee ka ụbọchị ọdachi bịakwasị ha,+ mee ka ọkpụkpụ ha gbajisịa ọbụna okpukpu abụọ.+ 19  Nke a bụ ihe Jehova gwara m: “Gaa guzoro n’ọnụ ụzọ ámá nke ụmụ ndị m, ebe ndị eze Juda na-esi abata ma na-apụ, nakwa n’ọnụ ụzọ ámá niile dị na Jeruselem.+ 20  Sịkwa ha, ‘Nụrụnụ okwu Jehova, unu ndị eze Juda na unu ndị Juda niile na unu niile ndị bi na Jeruselem, ndị na-esi n’ọnụ ụzọ ámá ndị a abata.+ 21  Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Lezienụ mkpụrụ obi unu anya,+ ọ bụrụgodị na unu nwere ibu ọ bụla unu ga-esirịrị n’ọnụ ụzọ ámá Jeruselem bubata, unu ebubatala ya n’ụbọchị izu ike.+ 22  Unu esikwala n’ụlọ unu bupụta ibu ọ bụla n’ụbọchị izu ike; unu arụkwala ọrụ ọ bụla.+ Doonụ ụbọchị izu ike nsọ, dị nnọọ ka m nyere nna nna unu hà n’iwu;+ 23  ma ha egeghị ntị, ha atọghịkwa ntị n’ala,+ ha wee kwesie olu ike+ ka ha ghara ige ntị, gharakwa ịnara ịdọ aka ná ntị.”’+ 24  “‘“Ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na unu erubere m nnọọ isi,”+ ka Jehova kwuru, “wee ghara isi n’ọnụ ụzọ ámá obodo a bubata ibu n’ụbọchị izu ike,+ dookwa ụbọchị izu ike nsọ site n’ịhapụ ịrụ ọrụ ọ bụla na ya,+ 25  ndị eze ga-esi n’ọnụ ụzọ ámá obodo a na-abata,+ ha na ndị ha mere ndị isi. Ha ga-anọkwasị n’ocheeze Devid,+ nọrọkwa n’ụgbọ ịnyịnya nakwa n’elu ịnyịnya, ha na ndị ha ji mere ndị isi, ndị ikom Juda na ndị bi na Jeruselem; a ga-ebikwa n’obodo a ruo mgbe e bighị ebi. 26  Ndị mmadụ ga-esi n’obodo ndị dị na Juda, sikwa na gburugburu Jeruselem nakwa n’ala Benjamin+ nakwa n’ala dị larịị+ nakwa n’ógbè bụ́ ugwu ugwu+ nakwa na Negeb+ na-eweta àjà a na-esurecha n’ọkụ+ na àjà nkịtị+ na àjà ọka*+ na frankinsens,+ wetakwa àjà ekele n’ụlọ Jehova.+ 27  “‘“Ma ọ bụrụ na unu erubereghị m isi site n’ido ụbọchị izu ike nsọ, gharakwa ibu ibu,+ ma unu eburu ya na-abata n’ọnụ ụzọ ámá Jeruselem n’ụbọchị izu ike, m ga-esunye ọnụ ụzọ ámá ya niile ọkụ,+ ọ ga-erepịa ụlọ elu ndị dị na Jeruselem,+ a gaghịkwa emenyụ ya emenyụ.”’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Jer 17:26*  Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.