Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jeremaya 16:1-21

16  Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị:  “Alụla nwaanyị, amụkwala ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom n’ebe a.+  N’ihi na nke a bụ ihe Jehova kwuru banyere ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom a na-amụ n’ebe a, nakwa banyere nne ha bụ́ ndị na-amụ ha nakwa banyere nna ha bụ́ ndị mụrụ ha n’ala a,+  ‘Ọrịa dị iche iche ga-egbu ha.+ A gaghị akwara ha ákwá arịrị,+ a gaghịkwa eli ha eli.+ Ha ga-aghọ nsị anụ n’elu ala;+ mma agha na ụnwụ ga-ala ha n’iyi,+ ozu ha ga-abụrụ anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa nke ụwa ihe oriri.’+  “N’ihi na nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Abanyela n’ụlọ ebe ndị na-eru uju na-eri oriri, agala ịkwa ákwá arịrị, asịkwala ha ndo.’+ “‘N’ihi na ewepụwo m udo m n’ebe ndị a nọ,’ ka Jehova kwuru, ‘wepụkwa obiọma* m na ebere m.+  Ha ga-anwụ n’ala a, ma ndị ukwu ma ndị nta. A gaghị eli ha eli,+ ndị mmadụ agaghịkwa etiri ha aka n’obi, ọ dịghịkwa onye ga-ebekasị onwe ya ahụ́+ ma ọ bụ kwọchaa isi n’ihi ha.+  A gaghịkwa enye ha ihe oriri iji kasie ha obi n’ihi uju ha na-eruru ndị nwụrụ anwụ;+ a gaghịkwa ebunye ha iko ngụgụ obi ka ha ṅụọ n’ihi nna ha nakwa n’ihi nne ha.+  Abanyela n’ụlọ oriri ọ bụla ka i soro ha nọrọ na-eri ihe ma na-aṅụ ihe ọṅụṅụ.’+  “N’ihi na nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, ‘Lee, m ga-eme ka a ghara ịnụkwa olu aṅụrị na olu obi ụtọ, olu nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ na olu nwaanyị a na-alụ ọhụrụ, n’ebe a, n’ihu unu nakwa n’ụbọchị unu.’+ 10  “Ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na ị gwa ndị a okwu a niile, ma ha asị gị, ‘Gịnị mere Jehova ji kwuo na oké ọdachi a dum ga-adakwasị anyị, olee otú anyị si jehie, oleekwa mmehie anyị mere Jehova Chineke anyị?’+ 11  Sị ha, ‘“Ọ bụ n’ihi na nna unu hà hapụrụ m,”+ ka Jehova kwuru, “ha wee na-eso chi ọzọ dị iche iche, na-efe ha ma na-akpọrọ ha isiala.+ Ma, ọ bụ m ka ha hapụrụ, ha edebeghịkwa iwu m.+ 12  Unu onwe unu emewokwa omume ọjọọ karịa nna unu hà,+ lee, onye ọ bụla n’ime unu na-eje ije dị ka isi ike+ nke dị n’ajọ obi ya si dị wee ghara irubere m isi.+ 13  M ga-esi n’ala a tụga unu n’ala unu na-amaghị,+ nke nna unu hà na-amaghịkwa,+ n’ebe ahụ ka unu ga-efe chi ọzọ dị iche iche+ ehihie na abalị, n’ihi na agaghị m emere unu amara.”’ 14  “‘N’ihi na, lee! ụbọchị na-abịa,’+ ka Jehova kwuru, ‘mgbe a na-agakwaghị asị: “Dị nnọọ ka Jehova dị ndụ, bụ́ onye si n’ala Ijipt kpọpụta ụmụ Izrel!”+ 15  kama a ga-asị: “Dị nnọọ ka Jehova dị ndụ, bụ́ onye si n’ala dị n’ebe ugwu nakwa n’ala niile ọ chụsasịrị ha kpọpụta ha!” m ga-akpọlata ha n’ala ha, nke m nyere ndị nna nna ha.’+ 16  “‘Lee, m na-ezi ozi ka ọtụtụ ndị na-akụ azụ̀ bịa,’ ka Jehova kwuru, ‘ha ga-akụta ha dị ka azụ̀; e mesịakwa, m ga-ezi ozi ka ọtụtụ ndị dinta bịa,+ ha ga-achụ nta ha n’ugwu ukwu ọ bụla nakwa n’ugwu nta ọ bụla nakwa n’ebe ndị gbawara agbawa na nkume dị elu.+ 17  N’ihi na anya m na-ahụ ụzọ ha niile. E zoghị ha ezo n’ihu m, e zopụghịkwa njehie ha n’anya m.+ 18  Ma, m ga-ebu ụzọ kwụzuo ha ụgwọ njehie ha+ na ụgwọ mmehie ha, n’ihi na ha merụrụ ala m.+ Ha emewo ka ozu ihe arụ ha na nke ihe ha jọgburu onwe ha jupụta n’ihe nketa m.’”+ 19  Jehova, ike m na ebe m e wusiri ike na ebe mgbaba m n’oge ahụhụ,+ ọ bụ gị ka mba dị iche iche ga-abịakwute site na nsọtụ niile nke ụwa,+ ha ga-asịkwa: “N’ezie, ihe nna nna anyị hà ketara bụ okwu ụgha+ na ihe efu na ihe ndị na-enweghị uru ha bara.”+ 20  Mmadụ ọ̀ pụrụ imere onwe ya chi dị iche iche mgbe ha na-abụghị chi?+ 21  “Ya mere, lee, m ga-eme ka ha mara; n’otu oge ahụ, m ga-eme ka ha hụ aka m na ike m,+ ha ga-amarakwa na aha m bụ Jehova.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Jer 16:5*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”