Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jeremaya 14:1-22

14  Nke a bụ okwu Jehova nke ruru Jeremaya ntị banyere ụkọ mmiri ozuzo:+  Juda na-eru uju,+ ọnụ ụzọ ámá ya niile emebiwo.+ Ha adaruwo ala ná mwute,+ Jeruselem etiwokwa mkpu ákwá.+  Ndị ukwu ha ezipụwo ndị nta ha ka ha gaa kute mmiri.+ Ha agawo n’olulu mmiri. Ha ahụghị mmiri.+ Ha eburuwo okpokoro ite lọta. E menyewo ha ihere,+ mechuokwa ha ihu, ha ekpuchiwo isi ha.+  Ihere emewo ndị ọrụ ubi n’ihi na ala agbawasịwo maka na mmiri ezobeghị n’ala;+ ha ekpuchiwo isi ha.+  N’ihi na ọbụna nne ele nke nọ n’ọhịa amụwo nwa ma hapụ ya maka na ahịhịa ndụ adịghị.  Ịnyịnya ọhịa+ eguzorowo otu ebe n’elu ugwu nta ndị ọhịa na-adịghị; ha ekuwo ume ọkụ ọkụ dị ka nkịta ọhịa; anya ha adịkwaghị ahụ ụzọ n’ihi na ahịhịa ndụ adịghị.+  Jehova, ọ bụrụgodị na njehie anyị na-agbagide anyị akaebe, biko, mee ihe n’ihi aha gị;+ n’ihi na ekwesịghị ntụkwasị obi anyị adịwo ukwuu;+ ọ bụ gị ka anyị mehiere.+  Gị olileanya Izrel,+ Onye zọpụtara ya+ mgbe ọ nọ n’ahụhụ,+ gịnị mere i ji nọrọ dị ka onye mbịarambịa n’ala a, dị ka onye ije nke banyere n’ebe ọ ga-arahụ?+  Gịnị mere i ji nọrọ ka nwoke ihe juru anya, dị ka dike nke na-enweghị ike ịzọpụta ndị ya?+ Ma gị onwe gị, Jehova, nọ n’etiti anyị,+ ọ bụkwa anyị ka a kpọkwasịrị aha gị.+ Emechula anyị ihu. 10  Nke a bụ ihe Jehova kwuru banyere ndị a: “Otú a ka ha hụrụ mwagharị n’anya;+ ha adịghị edebe ụkwụ ha otu ebe.+ Ya mere, ihe ha adịghị atọ Jehova ụtọ.+ Ọ ga-echeta njehie ha, ọ ga-elebakwara mmehie ha anya.”+ 11  Jehova wee sị m: “Ekperela ndị a ekpere ka ihe ọma ọ bụla meere ha.+ 12  Ha buo ọnụ, agaghị m ege ntị n’ákwá ha na-ebesara m;+ ha chụọ àjà a na-esurecha n’ọkụ na àjà ọka,* ha agaghị atọ m ụtọ;+ n’ihi na m ga-eji mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe laa ha n’iyi.”+ 13  M wee sị: “Ewoo, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova! Lee, ndị amụma na-asị ha, ‘Unu agaghị ahụ mma agha ọ bụla, ụnwụ agaghịkwa ada n’ala unu, kama, m ga-eme ka unu nwee ezi udo n’ebe a.’”+ 14  Jehova wee sị m: “Ọ bụ amụma ụgha ka ndị amụma na-ebu n’aha m.+ Ọ bụghị m dunyere ha, enyeghịkwa m ha iwu, agwaghịkwa m ha okwu.+ Ọhụụ ụgha na ịgba afa na ihe na-abaghị uru+ na aghụghọ nke dị n’obi ha ka ha ji na-eburu unu amụma.+ 15  Ya mere, nke a bụ ihe Jehova kwuru banyere ndị amụma ahụ na-ebu amụma n’aha m, ndị mụ onwe m na-edunyeghị, ndị na-asị na mma agha agaghị abịakwasị ala a, na ụnwụ agaghịkwa ada na ya, ‘A ga-eji mma agha na ụnwụ laa ndị amụma ahụ n’iyi.+ 16  A ga-atụpụ ndị ahụ ha na-eburu amụma n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem n’ihi ụnwụ na mma agha, ọ dịghị onye ga-eli ha—ha onwe ha, ndị nwunye ha na ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom.+ M ga-awụkwasị ha ọdachi ha.’+ 17  “Gwa ha, sị: ‘Ka anya mmiri na-agbapụta m n’anya n’akwụsịghị akwụsị abalị na ehihie,+ n’ihi na ada na-amaghị nwoke bụ́ ndị m adawo ajọ ọdịda wee gbajie ọkpụkpụ,+ ahụ́ o merụrụ dị oké njọ.+ 18  Ọ bụrụ na mụ abanye n’ọhịa, lee, e nwere ndị mma agha gburu!+ Ọ bụrụkwa na mụ abata n’ime obodo, lee, ụnwụ akpatawokwa ọrịa!+ N’ihi na ma ndị amụma ma ndị nchụàjà awagharịwo banye n’ala ha na-amaghị.’”+ 19  Ị̀ jụwo Juda kpamkpam,+ ka mkpụrụ obi gị ọ̀ kpọwo Zayọn asị?+ Gịnị mere i ji tie anyị ihe nke na a pụghị ịgwọta anyị agwọta?+ Anyị nọ na-atụ anya udo, ma e nweghị ihe ọma merenụ; anyị nọ na-atụ anya ọgwụgwọ, ma, lee! oké ụjọ bịara!+ 20  Jehova, anyị kwetara ajọ omume anyị na njehie nna nna anyị hà,+ n’ihi na anyị emehiewo gị.+ 21  N’ihi aha gị,+ eledala anyị anya; elelịkwala ocheeze gị dị ebube.+ Cheta; emebila ọgbụgba ndụ anyị na gị.+ 22  Ò nwere nke ọ bụla n’ime arụsị na-abaghị uru+ nke mba dị iche iche pụrụ ime ka mmiri zoo, ka eluigwe ọ̀ pụrụ ime ka oké mmiri zoo?+ Ọ́ bụghị gị, Jehova bụ́ Chineke anyị, bụ Onye pụrụ ime ya?+ Anyị nwere olileanya n’ebe ị nọ, n’ihi na ọ bụ gị mere ihe a niile.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Jer 14:12*  Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.