Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jeremaya 11:1-23

11  Nke a bụ okwu Jehova nke ruru Jeremaya ntị, sị:  “Nụrụnụ okwu ọgbụgba ndụ a! “Gwa ya+ ndị Juda na ndị bi na Jeruselem,  sị ha, ‘Nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru: “Onye a bụrụ ọnụ ka onye na-adịghị ege ntị n’okwu ọgbụgba ndụ a bụ,+  nke m gwara nna nna unu hà n’ụbọchị m kpọpụtara ha n’ala Ijipt,+ n’oké ọkụ e ji agbaze ígwè,+ wee sị, ‘Rubenụ isi n’ihe m kwuru, meekwanụ ihe niile m nyere unu n’iwu;+ unu ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke unu,+  ka m wee mezuo iyi m ṅụụrụ nna nna unu hà,+ inye ha ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,+ dị ka ọ dị taa.’”’” M wee zaa, sị: “Amen, Jehova.”  Jehova wee sị m: “Kọsaa okwu a niile n’obodo ndị dị na Juda nakwa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem,+ sị, ‘Nụrụnụ okwu ọgbụgba ndụ a, meekwanụ ya.+  N’ihi na m dụsiri nna nna unu hà ọdụ ike n’ụbọchị m si n’ala Ijipt+ kpọpụta ha ọbụna ruo taa, na-ebili n’isi ụtụtụ na-adụ ha ọdụ, sị: “Rubenụ isi n’ihe m kwuru.”+  Ma ha egeghị ntị, ha atọghịkwa ntị n’ala,+ kama onye ọ bụla n’ime ha nọ na-eje ije dị ka isi ike nke dị n’ajọ obi ya si dị;+ m wee mee ka ihe niile e kwuru n’ọgbụgba ndụ a mezuo n’isi ha, bụ́ ihe m nyere ha n’iwu ka ha na-eme, ma ha emeghị ya.’”  Jehova sịkwara m: “A chọpụtawo na ndị Juda na ndị bi na Jeruselem gbara izu ọjọọ.+ 10  Ha alaghachiwo ná njehie ndị nna nna ha,+ ndị nke mbụ, ndị jụrụ irube isi n’ihe m kwuru, kama ha sooro chi ọzọ dị iche iche ka ha wee fee ha.+ Ụlọ Izrel na ụlọ Juda emebiwo ọgbụgba ndụ m nke mụ na ndị nna nna ha gbara.+ 11  Ya mere, nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Lee, m ga-eme ka ọdachi+ nke ha na-enweghị ike isi n’ime ya pụta+ dakwasị ha; ha ga-akpọku m ka m nyere ha aka, ma agaghị m ege ha ntị.+ 12  Obodo ndị dị na Juda na ndị bi na Jeruselem ga-aga kpọkuo chi niile ha na-esurere ihe nsure ọkụ ka ha nyere ha aka,+ bụ́ ndị na-agaghị azọpụta ha mgbe ọdachi dakwasịrị ha.+ 13  N’ihi na chi gị adịwo ọtụtụ dị ka obodo ndị dị n’ime gị, gị Juda;+ unu arụworo ihe ihere+ ọtụtụ ebe ịchụàjà dị ka e nwere ọtụtụ okporo ámá na Jeruselem, bụ́ ebe ịchụàjà maka isurere Bel ihe nsure ọkụ.’+ 14  “Ma gị onwe gị, ekpela ekpere n’ihi ndị a, ebesarala m ákwá n’ihi ha ma ọ bụ kpeere ha ekpere,+ n’ihi na agaghị m ege ntị mgbe ha ga na-akpọku m n’ihi ọdachi ha.+ 15  “Gịnị gbasara onye m hụrụ n’anya na ụlọ m,+ ebe ọ bụ na ọtụtụ n’ime ha na-eme ihe a,+ ya bụ, atụmatụ ọjọọ a?+ Hà ga-eji anụ dị nsọ mee ka ọ ghara ịbịakwasị gị,+ mgbe ọdachi dakwasịrị gị? Ị̀ ga-aṅụrị ọṅụ n’oge ahụ?+ 16  ‘Osisi oliv nke jupụtara n’akwụkwọ ndụ, nke mkpụrụ ya na ọdịdị ya mara mma,’ bụ aha Jehova kpọrọ gị.+ O jiriwo oké mkpọtụ mụnye ọkụ na-ere ya, ha agbajiwokwa alaka ya.+ 17  “Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Onye kụrụ gị,+ ekwuwo na ọdachi ga-adakwasị gị n’ihi ihe ọjọọ nke ụlọ Izrel+ na ụlọ Juda mere iji kpasuo m iwe site n’isurere Bel ihe nsure ọkụ.”+ 18  Jehova agwawo m ka m wee mara. N’oge ahụ, i mere ka m hụ ihe ha na-eme.+ 19  Adị m ka nwa ebule dị nwayọọ, nke a kpụtara n’ebe a ga-egbu ya,+ amaghị m na ọ bụ m ka ha mere atụmatụ imegide, sị:+ “Ka anyị laa osisi a na mkpụrụ ya n’iyi, ka anyị gbupụ ya n’ala ndị dị ndụ,+ ka a ghara icheta aha ya ọzọ.” 20  Ma Jehova nke ụsụụ ndị agha na-ekpe ikpe n’ezi omume;+ ọ na-enyocha akụrụ na obi.+ Biko, ka m jiri anya m hụ ọbọ ị ga-abọ n’ahụ́ ha, n’ihi na ọ bụ gị ka m kọsaara okwu ikpe m.+ 21  Ya mere, nke a bụ ihe Jehova kwuru megide ndị Anatọt+ bụ́ ndị na-achọ mkpụrụ obi m, ndị na-asị: “Ebula amụma n’aha Jehova,+ ka ị ghara ịnwụ n’aka anyị”; 22  ya mere, nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru: “Lee, m ga-elebara ha anya. Mma agha ga-egbu ụmụ okorobịa ha.+ Ụnwụ ga-egbu ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom.+ 23  E nweghị ndị ga-afọdụrụ ha, n’ihi na m ga-eme ka ọdachi dakwasị ndị Anatọt,+ n’afọ a ga-elebara ha anya.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji