Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jeremaya 10:1-25

10  Nụrụnụ okwu Jehova kwuru megide unu, unu ụlọ Izrel.  Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Unu amụtala ụzọ mba dị iche iche ma ọlị,+ unu atụla ọbụna ihe ịrịba ama ndị si n’eluigwe ụjọ, n’ihi na mba dị iche iche na-atụ ihe ndị a ụjọ.+  N’ihi na omenala nke ndị dị iche iche+ bụ naanị ume e kupụrụ ekupụ, n’ihi na ọ bụ osisi nkịtị+ dị n’ọhịa ka mmadụ gbuturu, bụ́ nke omenkà ji mma ịkwa osisi kwaa.+  Mmadụ na-eji ọlaọcha na ọlaedo chọọ ya mma.+ Ha na-eji ntu na hama kụgide ha, ka ọ ghara inwe nke ga-ete kweke kweke.+  Ha dị ka ihe e ji achụ anụmanụ n’ubi kukumba, ha apụghị ikwu okwu.+ A na-ebu ha ebu, n’ihi na ha apụghị ịga ije.+ Atụla egwu n’ihi ha, n’ihi na ha apụghị iweta ọdachi ọ bụla, ha adịghịkwa eme ihe ọma ọ bụla.”+  Jehova, o nwetụdịghị onye dị ka gị.+ Ị dị ukwuu, aha gị dị ukwuu, dịkwa ike.+  Ọ̀ dị onye na-agaghị atụ egwu gị,+ gị Eze mba niile?+ N’ihi na ọ bụ gị ka e kwesịrị ịtụ egwu; n’ihi na o nwetụdịghị onye dị ka gị n’etiti ndị niile maara ihe ná mba dị iche iche nakwa n’alaeze ha niile.+  Ha niile bụ ndị na-adịghị eche echiche, bụrụkwa ndị nzuzu.+ Naanị ihe osisi na-eme bụ ịgba ndị mmadụ ume ịchụso ihe efu.+  E si ọbụna Tashish bute ọlaọcha a kụrụ ka ha dị mbadamba,+ sikwa na Yufaz bute ọlaedo,+ bụ́ ndị omenkà na onye na-eji ígwè akpụ ihe kpụrụ; e ji eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ e sijiri odo odo mee ákwà ha. Ha niile bụ ọrụ aka nke ndị nwere nkà.+ 10  Ma, Jehova bụ Chineke n’eziokwu.+ Ọ bụ Chineke dị ndụ,+ bụrụkwa Eze ruo mgbe ebighị ebi.+ Ụwa ga-ama jijiji n’ihi iwe ya,+ ọ dịghịkwa mba ga-eguzo mgbe ọ ga-eweta amamikpe ya.+ 11  Nke a bụ ihe unu ga-asị ha: “Chi niile+ ọ na-abụghị ha kere eluigwe na ụwa ga-ala n’iyi wee pụọ n’ụwa,+ pụọkwa n’okpuru eluigwe a.” 12  Ọ bụ ya bụ Onye ji ike ya kee ụwa,+ Onye jikwa amamihe ya mee ka elu ala guzosie ike,+ Onye jikwa nghọta ya setịa eluigwe.+ 13  Olu ya na-eme ka mmiri dị n’eluigwe mee mkpatụ.+ Ya onwe ya na-emekwa ka alụlụụ si na nsọtụ ụwa kwụgoo.+ O meworo mmiri ozuzo oghere,+ ọ na-esikwa n’ụlọ nkwakọba ihe ya eme ka ifufe pụta.+ 14  Mmadụ niile emewo ihe n’echeghị echiche nke na amaghị ihe ha apụtawo ìhè.+ Ihere ihe oyiyi a pịrị apị ga-eme onye ọ bụla nke na-eji ígwè akpụ ihe;+ n’ihi na ihe oyiyi ya a wụrụ awụ bụ ihe ụgha,+ mmụọ adịghịkwa n’ime ya.+ 15  Ha bụ ihe efu, ihe ịkwa emo.+ N’oge a ga-elebara ha anya, ha ga-ala n’iyi.+ 16  Òkè Jekọb+ adịghị ka ihe ndị a, n’ihi na ọ bụ ya bụ Onye kpụrụ ihe niile,+ Izrel bụ mkpara nke ihe nketa ya.+ Jehova nke ụsụụ ndị agha bụ aha ya.+ 17  Kwakọta ngwongwo gị dị n’ala,+ gị nwaanyị nke nọ n’ahụhụ.+ 18  N’ihi na nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Lee, m ga-agbapụ ndị bi n’ụwa dị ka nkume n’oge a,+ m ga-akpatara ha ahụhụ ka ha wee hụ ya.”+ 19  Efuola m, n’ihi ọkpụkpụ m nke gbajiri agbaji!+ Ahụ́ e merụrụ m adịwo oké njọ. Mụ onwe m asịwo: “N’ezie, ihe a bụ ọrịa na-arịa m, m ga-eburukwa ya.+ 20  E bibiwo ụlọikwuu m, e gbubiwokwa ụdọ ụlọikwuu m niile.+ Ụmụ m esiwo n’ebe m nọ pụọ, ha anọkwaghị.+ Ọ dịkwaghị onye na-agbasa ụlọikwuu m, ọ dịkwaghị onye na-eweli ákwà ụlọikwuu m elu. 21  N’ihi na ndị na-azụ atụrụ emewo ihe n’echeghị echiche,+ ha achọghị Jehova.+ Ọ bụ ya mere ha ejighị nghọta mee ihe, a chụsasịwokwa anụmanụ ha niile ndị nọ n’ebe ịta ahịhịa.”+ 22  Geenụ ntị! Akụkọ dị! Lee, o rutewo, tinyere oké mkpọtụ nke si n’ala dị n’ebe ugwu,+ iji mee ka obodo ndị dị na Juda ghọọ ebe tọgbọrọ n’efu, ọgba nkịta ọhịa.+ 23  Jehova, amaara m nke ọma na ụzọ mmadụ adịghị ya n’aka. Ọ dịrịghị mmadụ nke na-eje ije ọbụna iduzi nzọụkwụ ya.+ 24  Jehova, jiri ikpe ziri ezi gbazie m;+ ejila iwe gbazie m,+ ka ị ghara ime ka m ghọọ ihe efu.+ 25  Wụkwasị mba ndị na-eleghara gị anya+ ọnụma gị,+ wụkwasịkwa ezinụlọ ndị na-adịghị akpọku aha gị ọnụma gị.+ N’ihi na ha eripịawo Jekọb.+ Ee, ha eripịawo ya, ha nọkwa na-ekpochapụ ya;+ ha emewokwa ka ebe obibi ya tọgbọrọ n’efu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji