Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jenesis 37:1-36

37  Jekọb wee na-ebi n’ala dị iche iche nna ya biri dị ka ọbịa,+ n’ala Kenan.+  Nke a bụ akụkọ banyere Jekọb. Mgbe Josef+ gbara afọ iri na asaa, ọ nọ na-elekọta atụrụ, ya na ụmụnne ya,+ ma ebe ọ bụ nwata, ọ bụ ya na ụmụ Bilha+ na ụmụ Zilpa+ bụ́ ndị nwunye nna ya nọ. Josef wee kọọrọ nna ha ihe ọjọọ ha mere.+  Izrel hụrụ Josef n’anya karịa ụmụ ya niile ndị ọzọ,+ n’ihi na ọ bụ nwa ọ mụrụ n’agadi; ọ kwakwaara ya uwe mwụda nwegasịrị akara.+  Mgbe ụmụnne ya hụrụ na nna ha hụrụ ya n’anya karịa ụmụnne ya niile, ha malitere ịkpọ ya asị,+ ha enweghịkwa ike iji obiọma na-agwa ya okwu.+  E mesịa, Josef rọrọ nrọ wee kọọrọ ya ụmụnne ya,+ ha wee hụkwuo ihe mere ha ga-eji kpọ ya asị.  Ọ sịrị ha: “Biko, geenụ ntị ná nrọ a m rọrọ.+  Lee, anyị nọ na-eke ọka* n’ùkwù n’ùkwù n’etiti ubi mgbe ùkwù ọka m biliri guzo ọtọ, ma, lee, ùkwù ọka unu gbara ùkwù ọka m gburugburu ma kpọọrọ ya isiala.”+  Ụmụnne ya wee malite ịsị ya: “Ị̀ ga-abụnụ eze anyị?+ ka ị̀ ga-achịnụ anyị?”+ Ha wee hụ ihe ọhụrụ mere ha ga-eji kpọ ya asị, n’ihi nrọ ndị ọ rọrọ nakwa n’ihi ihe ndị o kwuru.  E mesịa, ọ rọkwara nrọ ọzọ, o wee kọọrọ ya ụmụnne ya, sị: “Lee, arọrọ m nrọ ọzọ, anyanwụ na ọnwa na kpakpando iri na otu nọ na-akpọrọ m isiala.”+ 10  O wee kọọrọ ya nna ya, kọọkwara ya ụmụnne ya, nna ya wee bawara ya mba wee sị ya:+ “Gịnị ka nrọ a ị rọrọ pụtara? Mụ onwe m na nne gị na ụmụnne gị ànyị ga-akpọrọ gị isiala?” 11  Ụmụnne ya wee nwewere ya anyaụfụ,+ ma nna ya tinyere okwu ahụ n’obi ya.+ 12  Ụmụnne ya wee gaa inye ìgwè anụ ụlọ nna ha nri n’ebe dị nso na Shikem.+ 13  Mgbe nwa oge gasịrị, Izrel gwara Josef, sị: “Ọ̀ bụ na ụmụnne gị anọghị na-elekọta ìgwè anụ ụlọ n’ebe dị nso na Shikem? Bịa ka m ziga gị ka ị gakwuru ha.” O wee sị ya: “Lee m!”+ 14  O wee sị ya: “Biko, gawa. Mata ma ahụ́ ọ̀ dịkwa ụmụnne gị, matakwa ma ìgwè anụ ụlọ ahụ hà nọkwa nke ọma, bịakwa kọọrọ m.”+ O wee si na ndagwurugwu Hibrọn+ zipụ ya, o wee gawa Shikem. 15  E mesịa, otu nwoke hụrụ ya ka ọ nọ na-awagharị n’ọhịa. Nwoke ahụ wee jụọ ya, sị: “Gịnị ka ị na-achọ?” 16  O wee sị: “Ọ bụ ụmụnne m ka m na-achọ. Biko, gwa m, Olee ebe ha nọ na-elekọta ìgwè anụ ụlọ?” 17  Nwoke ahụ wee gaa n’ihu ịsị: “Ha esiwo ebe a pụọ, n’ihi na anụrụ m ka ha na-ekwu, sị, ‘Ka anyị gaanụ Dotan.’” Josef wee chọrọ ụmụnne ya gawa wee hụ ha na Dotan. 18  Ha wee hụ ya ka ọ nọ n’ebe dị anya, tupu ya erute ha nso, ha malitere ịkpa nkata aghụghọ ka ha gbuo ya.+ 19  Ha wee gwa ibe ha, sị: “Lee! Ọrọ nrọ abịawala.+ 20  Bịanụ ka anyị gbuo ya ma tụba ya n’otu olulu mmiri;+ anyị ga-asịkwa na ajọ anụ ọhịa eriwo ya.+ Ka anyị hụzie otú nrọ ya ga-esi mezuo.” 21  Mgbe Ruben nụrụ ihe a, ọ nwara ịnapụta ya n’aka ha.+ O wee sị: “Ka anyị ghara igbu ya egbu.”+ 22  Ruben wee gaa n’ihu ịsị ha: “Unu awụfula ọbara.+ Tụbanụ ya n’olulu mmiri a nke dị n’ala ịkpa, unu emerụla ya ahụ́.”+ O bu n’obi ịnapụta ya n’aka ha ka o wee kpọghachiri ya nna ya. 23  O wee ruo na ozugbo Josef bịakwutere ụmụnne ya, ha yipụrụ Josef uwe mwụda ya, ya bụ, uwe mwụda nwegasịrị akara nke o yi;+ 24  e mesịa, ha kpọọrọ ya tụba n’olulu mmiri ahụ.+ N’oge ahụ, ọ dịghị ihe dị n’olulu ahụ; mmiri adịghị ya. 25  Ha wee nọdụ ala ka ha rie ihe oriri.+ Mgbe ha lepụrụ anya, lekwa ìgwè ndị njem bụ́ ndị Ishmel+ si Gilied na-abịa, kamel ha bukwa mmanụ labdanọm na mmanụ bọlsọm na ụgbụgbọ osisi nke nwere esó,+ ha bu ha na-aga Ijipt. 26  Juda wee sị ụmụnne ya: “Olee uru ọ ga-aba ma anyị gbuo nwanne anyị ma kpuchie ọbara ya?+ 27  Bịanụ ka anyị resị ya ndị Ishmel,+ ka aka anyị gharakwa imetụ ya.+ E kwuwerị, ọ bụ nwanne anyị, anyị na ya bụ otu anụ ahụ́.” Ha wee gee nwanne ha ntị.+ 28  Ndị ahịa bụ́ ndị Midian+ wee na-agafe. Ha wee dọpụta Josef n’olulu mmiri+ ahụ, ha wee resị ndị Ishmel Josef, ha rere ya mkpụrụ ego ọlaọcha iri abụọ.+ E mesịa, ndị ahụ kpọọrọ Josef bata n’Ijipt. 29  Mgbe e mesịrị, Ruben gaghachiri n’olulu mmiri ahụ, lee, Josef anọghị n’olulu mmiri ahụ. O wee dọwaa uwe ya.+ 30  Mgbe ọ gaghachikwuuru ụmụnne ya ndị ọzọ, o tiri mkpu, sị: “Nwatakịrị ahụ anọkwaghị n’ebe ahụ! Mụ onwe m kwa—gịnịzi ka m ga-eme?”+ 31  Otú ọ dị, ha chịịrị uwe mwụda Josef, gbuo otu mkpi wee bịanye uwe mwụda ahụ n’ọbara ya ugboro ugboro.+ 32  E mesịa, ha zigara uwe mwụda ahụ nwegasịrị akara wee mee ka o ruo nna ha aka wee sị: “Nke a bụ ihe anyị hụrụ. Biko, leruo ya anya+ mara ma ọ̀ bụ uwe mwụda nwa gị ma ọ bụ na ọ bụghị.”+ 33  O wee leruo ya anya ma tie mkpu, sị: “Ọ bụ uwe mwụda nwa m! Ọ ghaghị ịbụ na ajọ anụ ọhịa eriwo ya!+ Ọ ghaghị ịbụ na anụ ọhịa adọriwo Josef!”+ 34  Jekọb wee dọwaa ákwà mgbokwasị ya ma kee ákwà iru uju n’úkwù ya wee na-eruru nwa ya uju ruo ọtụtụ ụbọchị.+ 35  Ụmụ ya ndị ikom niile na ụmụ ya ndị inyom niile wee na-ebili ịkasi ya obi,+ ma ọ nabataghị obi a na-akasi ya, na-asị:+ “N’ihi na m ga-eruwere nwa m uju ruo Shiol!” Nna ya wee na-akwara ya ákwá. 36  Otú ọ dị, ndị Midian rere ya n’Ijipt, resị ya Pọtịfa bụ́ onyeisi ndị nche,+ onye na-eje ozi n’obí eze Fero.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Je 37:7*  Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.