Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jenesis 33:1-20

33  Ka oge na-aga, Jekọb lepụrụ anya, ma, lee, Isọ nọ na-abịa, ya na narị ndị ikom anọ.+ N’ihi ya, ọ kpọọrọ ụmụ ya ụfọdụ kpọnye Lia, kpọrọ ụfọdụ kpọnye Rechel, kpọrọkwa ụfọdụ kpọnye ndị inyom abụọ ahụ na-ejere ya ozi,+  o wee mee ka ndị inyom ahụ na-eje ozi na ụmụ ha nọrọ n’ihu ihu,+ Lia na ụmụ ya anọrọ ha n’azụ,+ Rechel na Josef anọrọkwa n’azụ azụ.+  Ya onwe ya wee gafee n’ihu ha wee kpọọ isiala ugboro asaa ruo mgbe o rutere nwanne ya nso.+  Isọ wee gbara ọsọ gaa izute ya,+ o wee makụọ+ ya ma dakwasị ya n’olu wee susuo ya ọnụ, ha wee malite ibe ákwá.  O wee lepụ anya hụ ndị inyom ahụ na ụmụ ha wee sị: “Ole ndị bụ ndị a so gị?” o wee sị: “Ha bụ ụmụ Chineke ji meere ohu gị amara.”+  Ndị inyom ahụ na-eje ozi wee bịarute, ha na ụmụ ha, wee kpọọ isiala;  Lia na ụmụ ya wee bịarute, ha wee kpọọ isiala, mgbe e mesịkwara, Josef na Rechel bịarutere, ha wee kpọọ isiala.+  O wee sị: “Gịnị mere i ji zite ìgwè ndị njem a dum m zuteworo?”+ O wee sị: “Ọ bụ iji nweta ihu ọma onyenwe m.”+  Isọ wee sị: “Nwanne m, enwere m nnọọ ọtụtụ ihe.+ Ka ihe gị bụrụwa nke gị.” 10  Otú ọ dị, Jekọb sịrị: “Ee e, biko. Ọ bụrụ na ihe m masịrị gị,+ ị ga-anara onyinye m na-enye gị, n’ihi na dị nnọọ ka ihe mere m ji na-enye gị ya si dị, ahụwo m ihu gị dị ka à ga-asị na m hụrụ ihu Chineke n’ihi na i ji obi ụtọ nabata m.+ 11  Biko, nara onyinye m wetara iji gọzie gị,+ n’ihi na Chineke egosiwo m ihu ọma, n’ihi na enwekwara m ihe niile.”+ O wee na-arịọsi ya ike, nke mere na ọ naara ya.+ 12  E mesịa, ọ sịrị: “Ka anyị kwalie lawa, ka m butekwara gị ụzọ.” 13  Ma ọ sịrị ya: “Onyenwe m maara na ụmụaka a esighị ike, m na-elekọtakwa atụrụ na ehi na-enye ụmụ ha ara,+ ọ bụrụkwa na a chịa ha n’ike ruo otu ụbọchị, ìgwè anụ ụlọ a dum ga-anwụ.+ 14  Biko, ka onyenwe m buru ohu ya ụzọ gawa, ma ka mụ onwe m gawa njem a nwayọọ nwayọọ dị ka ike kwere anụ ụlọ+ ndị a nọ m n’ihu nakwa dị ka ike kwere ụmụaka a+ ruo mgbe m ga-abịakwute onyenwe m na Sia.”+ 15  Isọ wee sị: “Biko, ka m kpọnye gị ụfọdụ n’ime ndị so m.” O wee sị: “Nke a ọ̀ bụ maka gịnị? Ka m nweta ihu ọma onyenwe m.”+ 16  Isọ wee tụgharịa lawa Sia n’ụbọchị ahụ. 17  Jekọb wee kwalie gawa Sọkọt,+ o wee wuoro onwe ya ụlọ, wuokwara ìgwè anụ ụlọ ya ụlọ ndò.+ Ọ bụ ya mere o ji kpọọ ebe ahụ Sọkọt. 18  Ka oge na-aga, Jekọb bịarutere n’obodo Shikem,+ nke dị n’ala Kenan,+ n’enweghị nsogbu ọ bụla, ka o si na Padan-eram+ na-alọta; o wee maa ụlọikwuu n’ihu obodo ahụ. 19  O wee zụọ ibé ala n’aka ụmụ Hemọ nna Shikem bụ́ ebe ọ mara ụlọikwuu ya, ọ zụrụ ya otu narị mkpụrụ ego.+ 20  E mesịa, o wuru ebe ịchụàjà n’ebe ahụ wee kpọọ ya Chineke bụ́ Chineke Izrel.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji