Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jenesis 32:1-32

32  Ma Jekọb gawara, ndị mmụọ ozi Chineke wee zute ya.+  Ozugbo Jekọb hụrụ ha, ọ sịrị: “Ihe a bụ ebe Chineke mara ụlọikwuu!”+ N’ihi ya, ọ kpọrọ ebe ahụ Mahaneyim.+  Jekọb wee zipụ ndị ozi+ ka ha buru ya ụzọ gakwuru Isọ nwanne ya n’ala Sia,+ n’ala Idọm,+  o wee nye ha iwu, sị: “Nke a bụ ihe unu ga-agwa onyenwe m,+ bụ́ Isọ, ‘Nke a bụ ihe ohu gị Jekọb kwuru: “Ebiwo m n’ụlọ Leban dị ka ọbịa, anọwokwa m ogologo oge ruo ugbu a.+  Enwewo m ehi na ịnyịnya ibu, atụrụ, na ndị ikom na-eje ozi na ndị inyom na-eje ozi,+ ọ masịrị m izi ozi iji gwa onyenwe m, ka m wee nweta ihu ọma gị.”’”+  Ka oge na-aga, ndị ozi ahụ lọghachikwutere Jekọb, sị: “Anyị gakwuuru nwanne gị Isọ, ọ na-abịakwa izute gị, ya na narị ndị ikom anọ.”+  Jekọb wee tụọ egwu nke ukwuu ma chegbuwe onwe ya.+ O wee kewaa ndị ya na ha so, nakwa ìgwè ewu na atụrụ ya, na ehi ya, na kamel ya ka ha dịrị ìgwè abụọ,+  o wee sị: “Ọ bụrụ na Isọ abịakwute otu ìgwè wakpo ya, a ghaghị inwe otu ìgwè nke ga-afọdụ ịgbalaga.”+  Jekọb wee sị: “Chineke nke nna m Ebreham na Chineke nke nna m Aịzik,+ Jehova, gị onye na-agwa m, sị, ‘Laghachi n’ala gị, laghachikwurukwa ndị ikwu gị, m ga-emesokwa gị ihe n’ụzọ dị mma,’+ 10  erughị m eru inweta obiọma* niile na ikwesị ntụkwasị obi niile i gosiworo ohu gị,+ n’ihi na ọ bụ naanị mkpara m ka m ji gafee Jọdan a, ugbu a, adịzi m ìgwè abụọ.+ 11  Ana m arịọ gị,+ napụta m n’aka nwanne m nwoke, n’aka Isọ, n’ihi na ana m atụ ya egwu na ọ pụrụ ịbịa wakpo m,+ ma nne ma ụmụ. 12  Gị onwe gị asịwokwa, ‘N’ezie, m ga-emeso gị ihe n’ụzọ dị mma, m ga-emekwa ka mkpụrụ gị baa ụba dị ka ájá dị n’oké osimiri, bụ́ nke a na-apụghị ịgụta ọnụ.’”+ 13  O wee rahụ n’ebe ahụ n’abalị ahụ. O wee si n’ihe ruru ya aka were onyinye ọ ga-enye Isọ nwanne ya:+ 14  narị nne ewu abụọ na mkpi iri abụọ, narị nne atụrụ abụọ na ebule iri abụọ, 15  kamel iri atọ ndị na-enye ụmụ ara na ụmụ ha, nne ehi iri anọ na oké ehi iri, nne ịnyịnya ibu iri abụọ na oké ịnyịnya ibu iri ndị tojuru etoju.+ 16  O wee nyefee ha n’ìgwè n’ìgwè n’aka ndị na-ejere ya ozi, ma gwa ndị na-ejere ya ozi ugboro ugboro, sị: “Burunụ m ụzọ gafere, unu ga-enyekwa ohere n’agbata otu ìgwè anụ na ibe ya.”+ 17  O nyekwara onye nke mbụ iwu, sị: “Ọ bụrụ na Isọ nwanne m ezute gị wee jụọ gị, sị, Ònye bụ onyenwe gị, ebeekwa ka ị na-aga, ònye nwekwa anụ ndị a na-aga n’ihu gị?’ 18  ị ga-asị, ‘Ọ bụ ohu gị Jekọb. Ọ bụ onyinye+ o ziteere onyenwe m+ Isọ, ma, lee! ya onwe ya na-abịa n’azụ anyị.’” 19  O wee nyekwa onye nke abụọ iwu, nyekwa onye nke atọ, nakwa ndị niile so ìgwè anụ ndị ahụ, sị: “Ọ bụ ihe a ka unu ga-agwa Isọ mgbe unu zutere ya.+ 20  Unu ga-asịkwa, ‘Ohu gị Jekọb na-abịa n’azụ anyị.’”+ N’ihi na ọ sịrị onwe ya: “Ma eleghị anya, m ga-eji onyinye+ m ga-ebu ụzọ zipụ mee ka obi jụrụ ya, e mesịakwa, m ga-ahụ ihu ya. Ikekwe, ọ ga-eji obiọma nabata m.”+ 21  Ha wee were onyinye ahụ buru ya ụzọ gafere, ma ya onwe ya rahụrụ n’ụlọikwuu n’abalị ahụ.+ 22  Mgbe e mesịrị n’abalị ahụ, o biliri kpọrọ ndị nwunye ya abụọ+ na ndị inyom abụọ na-ejere ya ozi+ na ụmụ ya iri na otu+ wee si n’ebe a na-eji ụkwụ agafe mmiri Jabọk gafee.+ 23  O wee kpọrọ ha kpọfee iyi ndagwurugwu ahụ,+ o wefetakwara ihe ndị o nwere. 24  N’ikpeazụ, Jekọb nọ naanị ya. Ya na otu nwoke wee malite ịgba mgba ruo mgbe chi bọrọ.+ 25  Mgbe ọ hụrụ na ya emerighị ya,+ ọ kpatụrụ ya aka n’isi ọkpụ ya; isi ọkpụ Jekọb wee chipụ ka ya na ya nọ na-agba mgba.+ 26  E mesịa, ọ sịrị: “Hapụ m ka m laa, n’ihi na chi abọọla.” O wee sị: “Agaghị m ahapụ gị ka ị laa ruo mgbe i bu ụzọ gọzie m.”+ 27  O wee sị ya: “Gịnị bụ aha gị?” o wee zaa, sị: “Jekọb.” 28  O wee sị: “Aha gị agakwaghị abụ Jekọb kama ọ ga-abụ Izrel,+ n’ihi na gị na Chineke na mmadụ agbawo mgba,+ i wee merie n’ikpeazụ.” 29  Jekọb wee jụọ ya, sị: “Biko, gwa m aha gị.” Otú ọ dị, ọ sịrị: “N’ihi gịnị ka i ji ajụ m aha m?”+ O wee gọzie ya n’ebe ahụ. 30  Jekọb wee kpọọ ebe ahụ Penayel,+ n’ihi na, dị ka o kwuru, “Ahụwo m Chineke ihu na ihu ma a napụtara mkpụrụ obi m.”+ 31  Anyanwụ wee malite ịcha ya ozugbo ọ gafere Penuel, ma ọ nọ na-ete ụkwụ.+ 32  Ọ bụ ya mere, ruo taa, ụmụ Izrel anaghị eri akwara apata ụkwụ anụ, bụ́ nke na-adị n’isi ọkpụ ya, n’ihi na ọ kpatụrụ isi ọkpụ Jekọb aka, n’akụkụ akwara apata ụkwụ ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Je 32:10*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”