Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jenesis 31:1-55

31  Ka oge na-aga, ọ nụrụ ihe ụmụ ndị ikom Leban nọ na-ekwu, sị: “Jekọb ewerewo ihe niile nna anyị nwere; ọ bụkwa n’ihe onwunwe nna anyị ka o si kpata akụ̀ a niile.”+  Mgbe ọ bụla Jekọb lere Leban anya n’ihu, lee, ọ naghị adị otú ọ na-adịbu n’ebe ọ nọ.+  N’ikpeazụ, Jehova sịrị Jekọb: “Laghachi n’ala nna gị hà, laghachikwuru ndị ikwu gị,+ m ga-anọnyere gị.”+  Jekọb wee zie ozi kpọọ Rechel na Lia ka ha bịakwute ya n’ọhịa n’ebe ìgwè anụ ụlọ ya nọ,  o wee sị ha: “Ana m ahụ ihu nna unu, ọ dịkwaghị emeso m otú o si emeso m na mbụ;+ ma Chineke nke nna m nọnyeere m.+  Unu onwe unu maara na ọ bụ ike m niile ka m ji jeere nna unu ozi.+  Nna unu nwara ịghọgbu m, ọ gbanwewokwa ụgwọ ọrụ m ugboro iri, ma Chineke ekweghị ka o merụọ m ahụ́.+  Ọ bụrụ na ọ sị, ‘Anụ ndị tụrụ akịka ga-abụ ụgwọ ọrụ gị,’ mgbe ahụ, ìgwè anụ ụlọ ahụ dum na-amụ ụmụ tụrụ akịka; ma ọ bụrụ na ọ sị, ‘Anụ ndị nwere akara n’ahụ́ ga-abụ ụgwọ ọrụ gị,’ mgbe ahụ, ìgwè anụ ụlọ ahụ dum na-amụ ụmụ nwere akara n’ahụ́.+  Chineke wee na-anara nna unu ìgwè anụ ụlọ ya na-enye m.+ 10  N’ikpeazụ, o ruru mgbe ìgwè anụ ụlọ ahụ na-agba ibe ha na m lepụrụ anya ná nrọ+ wee hụ, ma, lee, mkpi ndị na-amagoro n’elu ìgwè anụ ụlọ ahụ nwere akara n’ahụ́ ha, ha tụrụ akịka, tụọkwa àgwà.+ 11  Mmụọ ozi nke ezi Chineke wee gwa m ná nrọ ahụ, sị, ‘Jekọb!’ m wee sị, ‘Lee m.’+ 12  O wee gaa n’ihu ịsị, ‘Biko, lepụ anya hụrụ na mkpi niile na-amagoro n’elu ìgwè anụ ụlọ ahụ nwere akara n’ahụ́, ha tụrụ akịka, tụọkwa àgwà, n’ihi na ahụwo m ihe niile Leban na-eme gị.+ 13  Abụ m ezi Chineke nke Betel,+ bụ́ ebe i tere otu ogidi mmanụ+ na ebe ị nọ kwe m nkwa.+ Ugbu a, bilie, si n’ala a pụọ ma laghachi n’ala a mụrụ gị.’”+ 14  Rechel na Lia wee zaa ya, sị: “Ànyị ka nwere òkè n’ihe nketa dị n’ụlọ nna anyị?+ 15  Ọ̀ bụ na ọ gụghị anyị ná ndị mba ọzọ ebe o rere anyị ere, o wee na-eri ego a kwụrụ n’isi anyị?+ 16  N’ihi na akụ̀ niile Chineke napụworo nna anyị bụ nke anyị na ụmụ anyị.+ Ya mere, ihe ọ bụla Chineke gwara gị, mee ya.”+ 17  Jekọb wee bilie kugoro ụmụ ya na ndị nwunye ya n’elu kamel;+ 18  o wee chịrị ìgwè anụ ụlọ ya niile na akụ̀ niile ọ kpatara,+ ìgwè anụ ụlọ ya ndị o nwetara na Padan-eram, ka o wee lakwuru Aịzik nna ya n’ala Kenan.+ 19  Ma Leban gara ịkpacha ajị atụrụ ya. Ka nke a na-eme, Rechel zuuru terafim+ nna ya. 20  Jekọb wee ghọgbuo Leban onye Siria, n’ihi na ọ gwaghị ya na ya ga-agbapụ. 21  O wee gbapụ, o bilikwara gafee Osimiri Yufretis,+ ya na ihe niile o nwere. Mgbe e mesịrị, o chere ihu n’ógbè Gilied bụ́ ugwu ugwu.+ 22  E mesịa, n’ụbọchị nke atọ, a gwara Leban na Jekọb agbalawo. 23  O wee kpọrọ ụmụnne ya chụwa ya+ wee chụkwute ya n’ógbè Gilied bụ́ ugwu ugwu, bụ́ ebe were ya njem ụbọchị asaa. 24  Chineke wee bịakwute Leban onye Siria+ ná nrọ n’abalị+ wee gwa ya, sị: “Kpachara anya ka ị ghara ịga gwa Jekọb ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ.”+ 25  Leban wee bịakwute Jekọb, ka Jekọb mara ụlọikwuu n’ugwu, Leban emeekwa ka ụmụnne ya maa ụlọikwuu n’ógbè Gilied bụ́ ugwu ugwu. 26  Leban wee sị Jekọb: “Gịnị bụ ihe a i mere, n’ihi na ị ghọgburu m wee kpọrọ ụmụ m ndị inyom lawa dị ka ndị e ji mma agha dọrọ n’agha?+ 27  N’ihi gịnị ka i ji gbapụ na nzuzo wee ghọgbuo m ma ghara ịgwa m, ka m wee jiri ọṅụ na abụ+ na obere ịgbà na ụbọ akwara sị gị gaa nke ọma?+ 28  I nyeghịkwa m ohere ka m susuo ụmụaka m na ụmụ m ndị inyom ọnụ.+ I zuzuwo nzuzu. 29  Ọ dị n’ike aka m ime unu ihe ọjọọ,+ ma Chineke nke nna unu gwara m okwu n’abalị ụnyaahụ, sị: ‘Kpachara anya ka ị ghara ịgwa Jekọb ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ.’+ 30  Ugbu a ị lawara n’ihi na ụlọ nna gị anọwo na-agụsi gị agụụ ike, gịnịzi mere i ji zuru chi m?”+ 31  Jekọb wee zaa Leban, sị: “Ọ bụ n’ihi na egwu tụrụ m.+ N’ihi na m gwara onwe m, sị, ‘I nwere ike ịnapụ m ụmụ gị ndị inyom.’ 32  Onye ọ bụla ị hụrụ chi gị n’aka ya, ka ọ ghara ịdị ndụ.+ Nọrọ n’ihu ụmụnne anyị chọọ ya n’ihe m ji ma were ya.”+ Ma Jekọb amaghị na Rechel zuuru ya.+ 33  Leban wee banye n’ụlọikwuu Jekọb, banyekwa n’ụlọikwuu Lia nakwa n’ụlọikwuu ndị inyom abụọ ahụ na-eje ozi,+ ma ọ hụghị ya. N’ikpeazụ, o si n’ụlọikwuu Lia pụta wee banye n’ụlọikwuu Rechel. 34  Ma, ọ bụ Rechel weere terafim ahụ, o wee tinye ya n’ihe a kpara akpa ụmụ nwaanyị ji anọkwasị na kamel, o wee nọgide ya ọdụ. Leban wee bigharịa aka n’ụlọikwuu ahụ dum, ma ọ hụghị ya. 35  O wee gwa nna ya, sị: “Ka iwe ghara iwe onyenwe m,+ n’ihi na enweghị m ike ibili n’ihu gị, n’ihi na ihe ahụ na-emekarị ndị inyom ji m aka.”+ O wee chọọ ya nke ọma, ma ọ hụghị terafim ahụ.+ 36  Jekọb wee wee iwe+ ma malite isesa Leban okwu, Jekọb wee zaa Leban, sị: “Olee otú m si nupụrụ gị isi,+ gịnị bụ mmehie m mere, nke mere i ji chụọ m ajọ ọsọ a?+ 37  Ugbu a i bigharịchara aka ná ngwongwo m niile, ole n’ime ngwongwo niile nke ụlọ gị ka ị hụrụ?+ Debe ya n’ebe a n’ihu ụmụnne m nakwa ụmụnne gị,+ ka ha kpee ikpe n’etiti anyị abụọ.+ 38  Ebiwo m n’ụlọ gị afọ iri abụọ a. Nne atụrụ gị na nne ewu gị amụkwoghị ụmụ,+ ọ dịghịkwa mgbe m tara ebule si n’ìgwè anụ ụlọ gị. 39  Ewetaraghị m gị anụ ọ bụla a dọgburu adọgbu.+ Mụ onwe m na-akwụ ụgwọ ya. Ma nke e zuru n’ehihie ma nke e zuru n’abalị, ị na-asị m kwụọ ụgwọ ya.+ 40  Okpomọkụ anọwo na-emekpa m ahụ́ n’ehihie, oyi na-atụgbukwa m n’abalị, ụra na-apụkwa m n’anya.+ 41  Nke a mere ya afọ iri abụọ m biworo n’ụlọ gị. Ejeworo m gị ozi afọ iri na anọ maka ụmụ gị ndị inyom abụọ, jeekwa ozi afọ isii maka ìgwè anụ ụlọ gị, i wee na-agbanwe ụgwọ ọrụ m ruo ugboro iri.+ 42  A sị na Chineke nke nna m,+ bụ́ Chineke Ebreham nakwa Onye Aịzik na-atụ egwu ya,+ anọnyereghị m, ị gaara agbawa m aka sị m lawa. Chineke ahụwo nhụjuanya m na ndọgbu aka m dọgbuworo onwe ya n’ọrụ, o wee baara gị mba n’abalị ụnyaahụ.”+ 43  Leban wee zaa Jekọb, sị: “Ndị inyom a bụ ụmụ m, ụmụaka a bụkwa ụmụ m, ìgwè anụ ụlọ a bụ ìgwè anụ ụlọ m, ihe ọ bụla ị na-ele anya bụ nke m, bụrụkwa nke ụmụ m ndị inyom.’ Gịnị ka m pụrụ ime ha taa ma ọ bụ mee ụmụ ha mụrụ? 44  Bịa ka anyị gbaa ndụ,+ mụ na gị, ọ ga-abụkwa ihe àmà n’etiti mụ na gị.”+ 45  N’ihi ya, Jekọb butere nkume wee guzobe ya dị ka ogidi.+ 46  Jekọb wee sị ụmụnne ya: “Butewenụ nkume!” Ha wee butewe nkume wee tụkọta ha ka ha bụrụ ikpo nkume.+ E mesịa, ha riri nri n’ebe ahụ n’elu ikpo nkume ahụ. 47  Leban wee malite ịkpọ ya Jiga-sahaduta, ma Jekọb kpọrọ ya Galied. 48  Leban wee sị: “Ikpo nkume a bụ ihe àmà n’etiti mụ na gị taa.” Ọ bụ ya mere o ji kpọọ ya Galied,+ 49  kpọọkwa ya Ụlọ Nche, n’ihi na ọ sịrị: “Ka Jehova bụrụ onye nche n’etiti mụ na gị mgbe anyị nọ n’ebe anyị na-adịghị ahụ ibe anyị.+ 50  Ọ bụrụ na i mekpawa ụmụ m ndị inyom ahụ́,+ ọ bụrụkwa na ị lụọ ndị inyom ọzọ ma e wezụga ụmụ m ndị inyom, ọ dịghị onye anyị na ya nọ. Lee! Chineke bụ onye àmà n’etiti mụ na gị.”+ 51  Leban wee gaa n’ihu ịsị Jekọb: “Lekwa ikpo nkume a, lekwa ogidi m guzobeworo n’etiti mụ na gị. 52  Ikpo nkume a bụ ihe àmà, ogidi a bụkwa ihe na-agba àmà,+ na agaghị m agabiga ikpo nkume a imegide gị nakwa na ị gaghị agabiga ikpo nkume a na ogidi a ime m ihe ọjọọ.+ 53  Ka chi Ebreham+ na chi Nehọ,+ bụ́ chi nna ha, kpee ikpe n’etiti anyị.” Ma Jekọb ji Onye nna ya Aịzik na-atụ egwu ya ṅụọ iyi.+ 54  E mesịa, Jekọb chụrụ àjà n’ugwu ahụ ma kpọọ ụmụnne ya ka ha rie nri.+ Ha wee rie nri ma rahụ n’ugwu ahụ. 55  Otú ọ dị, Leban biliri n’isi ụtụtụ wee susuo+ ụmụaka ya na ụmụ ya ndị inyom ọnụ ma gọzie ha.+ Leban wee lawa ka o wee laghachi n’obodo nke ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji