Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jems 5:1-20

5  Ugbu a, bịanụ, unu ndị ọgaranya,+ kwaanụ ákwá, tienụ mkpu ákwá n’ihi nhụsianya ndị na-adakwasị unu.+  Akụnụba unu erewo ure, uwe elu unu aghọwokwa ihe nla riri.+  Ọlaedo na ọlaọcha unu atawo nchara, ịta nchara ha ga-abụkwa ihe àmà megide unu, ọ ga-erikwa anụ unu. Ọ bụ ihe dị ka ọkụ+ ka unu kwakọbaworo+ n’oge ikpeazụ.+  Lee! Ụgwọ nke unu kwesịrị ịkwụ ndị ọrụ bụ́ ndị weere unu ihe ubi, nke unu na-ekweghị akwụ ha,+ na-eti mkpu,+ mkpu enyemaka+ nke ndị na-ewe ihe ubi na-eti eruwokwa Jehova nke ụsụụ ndị agha ntị.+  Unu ebiwo ndụ okomoko n’elu ụwa, unu ebiwokwa ndụ dị ka ihe ụtọ nke anụ ahụ́ si dị.+ Unu emewo ka obi unu dị ka anụ mara abụba ruo n’ụbọchị a ga-egbu ha.+  Unu amawo onye ezi omume ikpe, unu egbuwo ya. Ọ́ dịghị emegide unu?+  Ya mere, ụmụnna m, nweenụ ndidi ruo n’oge ọnụnọ+ nke Onyenwe anyị. Lee! Onye ọrụ ubi na-echere mkpụrụ dị oké ọnụ ahịa nke ala, na-enwere ya ndidi ruo mgbe o nwetara ụbịa mmiri na ụla mmiri.+  Unu onwe unu, nweenụ ndidi;+ meenụ ka obi sie unu ike, n’ihi na ọnụnọ nke Onyenwe anyị adịwo nso.+  Ụmụnna m, unu asụla ude megide ibe unu, ka e wee ghara ikpe unu ikpe.+ Lee! Onyeikpe ahụ guzo n’ọnụ ụzọ.+ 10  Ụmụnna m, werenụ ndị amụma+ ndị kwuru okwu n’aha Jehova+ dị ka ihe nlereanya+ nke nhụjuanya+ na inwe ndidi.+ 11  Lee! Anyị na-akpọ ndị tachiri obi ndị obi ụtọ.+ Unu anụwo banyere ntachi obi Job,+ unu ahụwokwa ihe Jehova mesịrị mee,+ na Jehova nwere obi ọmịiko dị ukwuu, na-emekwa ebere.+ 12  Ma, karịsịa ihe niile, ụmụnna m, kwụsịnụ ịṅụ iyi, ee, unu ejila eluigwe ma ọ bụ ụwa ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ ṅụọ iyi.+ Kama ka Ee unu bụrụ Ee, ka Ee e unu bụrụkwa Ee e, ka unu wee ghara ịdaba n’ikpe.+ 13  È nwere onye ọ bụla na-ahụju anya n’etiti unu? Ka ọ na-ekpe ekpere.+ È nwere onye ọ bụla obi dị ụtọ? Ka ọ bụọ abụ otuto.+ 14  È nwere onye ọ bụla na-arịa ọrịa n’etiti unu?+ Ka ọ kpọọ ndị okenye+ nke ọgbakọ, ka ha kpeekwara ya ekpere, teekwa ya mmanụ+ n’aha Jehova. 15  Ekpere e ji okwukwe kpee ga-emekwa ka ahụ́ dị onye ahụ nke ahụ́ na-adịghị ike mma,+ Jehova ga-emekwa ka o bilie.+ Ọ bụrụkwa na o mewo mmehie, a ga-agbaghara ya.+ 16  Ya mere, na-ekwupụtanụ+ mmehie unu gwa ibe unu, na-ekpekwaranụ ibe unu ekpere, ka e wee gwọọ unu.+ Ekpere nke onye ezi omume na-ekpesi ike dị ike nke ukwuu mgbe ọ na-akpa ike.+ 17  Ịlaịja bụ nwoke nwere ụdị mmetụta anyị na-enwe,+ ma o kpere ekpere ka mmiri ghara izo;+ mmiri ezoghịkwa n’ala ahụ ruo afọ atọ na ọnwa isii. 18  O kpekwara ekpere ọzọ, mmiri wee si n’eluigwe zoo, ala wee mịa mkpụrụ ya.+ 19  Ụmụnna m, ọ bụrụ na e duhie onye ọ bụla n’etiti unu, o wee hapụ eziokwu, onye ọzọ ewee mee ka ọ lọghachite,+ 20  maranụ na onye mere ka onye mmehie hapụ njehie+ nke ụzọ ya ga-azọpụta mkpụrụ obi ya n’ọnwụ,+ ọ ga-ekpuchikwa ọtụtụ mmehie.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji