Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jems 2:1-26

2  Ụmụnna m, ùnu nwere okwukwe n’Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, onye bụ́ ebube anyị,+ ma na-ele mmadụ anya n’ihu?+  N’ihi na, ọ bụrụ na nwoke nke gbajuru ọla e ji ọlaedo mee ná mkpịsị aka ya, nke yikwa ákwà mara mma, abata n’ebe unu zukọrọ,+ ma onye ogbenye nke yi ákwà ruru unyi abata,+  ma unu elee onye ahụ yi ákwà mara mma anya ọma+ wee sị: “Nọdụ ala n’ebe a mara mma,” unu ewee sị onye ogbenye ahụ: “Guzoro ọtọ,” ma ọ bụ: “Nọdụ ala n’ebe ahụ, n’okpuru ihe mgbakwasị ụkwụ m,”  unu na-akpa ókè n’etiti onwe unu,+ ọ̀ bụ na unu aghọbeghị ndị ikpe+ na-ekpe ajọ ikpe?+  Geenụ ntị, ụmụnna m m hụrụ n’anya. Ọ̀ bụ na Chineke ahọrọghị ndị dara ogbenye+ n’ihe nke ụwa ka ha bụrụ ndị bara ọgaranya+ n’okwukwe, bụrụkwa ndị nketa nke alaeze ahụ, nke o kwere nkwa inye ndị hụrụ ya n’anya?+  Ma, unu emenyewo onye ogbenye ahụ ihere. Ọ̀ bụ na ndị bara ọgaranya adịghị emegbu+ unu, na-adọkpụrụkwa unu gaa n’ụlọikpe?+  Ọ̀ bụ na ha adịghị ekwulu+ ezi aha ahụ a kpọkwasịrị unu?+  Otú ọ dị, ọ bụrụ na unu na-edebe iwu nke eze nyere,+ dị ka ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ si kwuo, sị: “Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị,”+ unu na-eme nnọọ nke ọma.  Ma ọ bụrụ na unu na-ele mmadụ anya n’ihu,+ unu na-eme mmehie, n’ihi na iwu+ ahụ na-akatọ unu na unu bụ ndị na-emebi iwu. 10  N’ihi na onye ọ bụla nke na-edebe Iwu ahụ niile ma na-azọhie ụkwụ n’otu ihe, ọ ghọwo onye dara ha niile.+ 11  N’ihi na onye ahụ nke sịrị: “Akwala iko,”+ sịkwara: “Egbula ọchụ.”+ Ma ọ bụrụ na ị dịghị akwa iko ma ị na-egbu ọchụ, ị ghọwo onye na-emebi iwu. 12  Na-ekwunụ okwu, na-emekwanụ omume, dị ka ndị a ga-eji iwu nke ndị nweere onwe ha kpee ikpe.+ 13  N’ihi na a ga-ekpe onye na-adịghị eme ebere ikpe n’emereghị ya ebere.+ Ya mere, ebere na-emeri ikpe. 14  Ụmụnna m, olee uru ọ bara ma ọ bụrụ na mmadụ asị na ya nwere okwukwe+ ma o nweghị ọrụ?+ Okwukwe ahụ ọ̀ pụrụ ịzọpụta ya?+ 15  Ọ bụrụ na nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị gba ọtọ, n’enweghịkwa ihe oriri ga-ezuru ya n’ụbọchị,+ 16  ma otu onye n’ime unu asị ya: “Laa n’udo, nyaa ọkụ, rijuokwa afọ,” ma unu enyeghị ya ihe na-akpa ahụ́ ya, olee uru ọ bara?+ 17  Otú ahụkwa, ọ bụrụ na okwukwe enweghị ọrụ,+ ọ nwụrụ anwụ. 18  Otú ọ dị, otu onye ga-ekwu, sị: “I nwere okwukwe, enwekwara m ọrụ. Gosi m okwukwe gị nke na-agụnyeghị ọrụ, m ga-egosikwa gị okwukwe m site n’ọrụ m.”+ 19  Ọ̀ kwa i kwere na e nwere otu Chineke?+ Ị na-eme nke ọma. Ma ndị mmụọ ọjọọ kwekwara wee kụja.+ 20  Ma, gị onye nzuzu, ị̀ chọrọ ịma na okwukwe nke na-enweghị ọrụ adịghị arụpụta ihe ọ bụla? 21  Ọ̀ bụ na e siteghị n’ọrụ kpọọ nna anyị bụ́ Ebreham+ onye ezi omume mgbe ọ chụsịrị nwa ya bụ́ Aịzik n’àjà n’elu ebe ịchụàjà?+ 22  Ị hụrụ na okwukwe ya na ọrụ ya rụkọrọ ọrụ, e sitekwara n’ọrụ ya mee ka okwukwe ya zuo okè,+ 23  e mezukwara ihe ahụ e dere n’Akwụkwọ Nsọ, nke sịrị: “Ebreham nwere okwukwe n’ebe Jehova nọ, e wee gụọrọ ya nke ahụ dị ka ezi omume,”+ e wee kpọọ ya “enyi Jehova.”+ 24  Unu hụrụ na a ga-akpọ mmadụ onye ezi omume+ n’ihi ọrụ ya,+ ọ bụghị naanị n’ihi okwukwe ya.+ 25  Otú ahụkwa, ọ̀ bụ na e siteghịkwa n’ọrụ kpọọ nwaanyị akwụna ahụ bụ́ Rehab+ onye ezi omume, mgbe ọ nabatasịrị ndị ozi ahụ nke ọma wee zipụ ha ka ha si ụzọ ọzọ lawa?+ 26  N’ezie, dị ka ahụ́ nke na-enweghị mmụọ bụ ihe nwụrụ anwụ,+ otú ahụkwa, okwukwe nke na-enweghị ọrụ bụ ihe nwụrụ anwụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji