Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ilu 9:1-18

9  Ezi amamihe+ ewuwo ụlọ ya;+ ọ wapụtawo ogidi asaa ya.  Ọ haziwo ogbugbu anụ ya; ọ gwawo mmanya ya agwa; o dowokwa tebụl ya n’usoro.+  O zipụwo ndị inyom na-ejere ya ozi, ka ha nọrọ n’ebe ndị dị elu nke obodo kpọọ òkù, sị:  “Onye ọ bụla nke na-amaghị ihe, ya bata ebe a.”+ Ọ gwawo onye ọ bụla nke na-enweghị uche,+ sị:  “Bịa rie nri m, sorokwa m ṅụọ mmanya m gwara agwa.+  Hapụ ndị na-amaghị ihe ka i wee dịrị ndụ,+ na-eje ije n’ụzọ nghọta.”+  Onye ọ bụla nke na-agbazi onye na-akwa emo na-akparị onwe ya,+ onye ọ bụla nke na-abara onye ajọ omume mba—ọ bụụrụ ya ihe ihere.+  Abarala onye na-akwa emo mba, ka ọ ghara ịkpọ gị asị.+ Baara onye maara ihe mba, ọ ga-ahụ gị n’anya.+  Kụziere onye maara ihe ihe, ọ ga-amakwa ihe karị.+ Nye onye ezi omume ihe ọmụma, ọ ga-atụkwasị ihe n’ihe ọ mụtara. 10  Ịtụ egwu Jehova bụ mmalite amamihe,+ ịmara Onye Kasị Nsọ ka nghọta bụkwa.+ 11  N’ihi na ọ bụ m ga-eme ka ụbọchị gị dị ọtụtụ,+ a ga-atụkwasịkwara gị ọtụtụ afọ ndụ.+ 12  Ọ bụrụ na ị maara ihe, ọ bụ onwe gị ka ị maara ya;+ ọ bụrụkwa na ị kwawo emo, ị ga-eburu ya, naanị gị.+ 13  Nwaanyị nzuzu na-eme mkpọtụ.+ O nweghị uche, ọ maghịkwa ihe ọ bụla.+ 14  Ọ nọrọwo ọdụ n’ọnụ ụzọ ụlọ ya, n’oche, n’ebe ndị dị elu nke obodo,+ 15  ịkpọ ndị na-agafe n’ụzọ òkù, bụ́ ndị na-aga n’ihu n’ihu n’ụzọ ha,+ sị: 16  “Onye ọ bụla na-amaghị ihe, ya bata ebe a.”+ Ọ gwawokwa onye ọ bụla na-enweghị uche,+ sị: 17  “Mmiri e zutere ezute na-atọ ụtọ,+ achịcha a na-ata na nzuzo na-adị ụtọ.”+ 18  Ma ọ maghị na ndị na-adịghị ndụ nọ n’ebe ahụ, na ndị ọ kpọbatara nọkwa n’ime ime Shiol.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji