Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ilu 7:1-27

7  Nwa m, debe okwu m+ ma chekwaa ihe m nyere n’iwu n’obi gị.+  Debe ihe m nyere n’iwu ka i wee dịrị ndụ,+ debekwa iwu m dị ka nwa anya gị.+  Kee ha ná mkpịsị aka gị,+ deekwa ha ná mbadamba nkume nke obi gị.+  Gwa amamihe,+ sị: “Ị bụ nwanne m nwaanyị”; kpọọkwa nghọta “Onye ikwu m,”  iji chebe gị ka ị ghara ịdaba n’aka nwaanyị na-akwa iko,*+ n’aka nwaanyị na-eme omume rụrụ arụ,* bụ́ onye mere ka okwu ya bụrụ okwu ire ụtọ.+  N’ihi na m si na windo na mpio+ ụlọ m ledata anya,  ka m wee hụ ndị na-amaghị ihe.+ Achọrọ m ịmata nwa okorobịa nke na-enweghị uche n’etiti ndị ikom,+  ka ọ na-agafe n’okporo ámá n’akụkụ ụlọ nwaanyị ahụ, ọ bụkwa n’ụzọ ụlọ ya ka ọ na-aga,+  mgbe chi jiwere, ná mgbede,+ mgbe abalị na ọchịchịrị na-eru nso. 10  Ma, lee! otu nwaanyị bịara izute ya, o yi uwe nwaanyị akwụna,+ aghụghọ dịkwa ya n’obi. 11  Ọ na-eme mkpọtụ, bụrụkwa onye isi ike.+ Ụkwụ adịghị anọ ya n’ụlọ.+ 12  Ugbu a, ọ nọ n’èzí, ugbu a, ọ nọ n’ámá,+ ọ bụkwa n’akụkụ ngalaba ụzọ ọ bụla ka ọ na-echechi mmadụ.+ 13  Ọ bagidewo ya wee susuo ya ọnụ.+ Ihere apụwo ya n’ihu, o wee malite ịsị ya: 14  “M nwere àjà udo m na-aghaghị ịchụ.+ Taa ka m mezuru ihe m kwere ná nkwa.+ 15  Ọ bụ ya mere m ji pụta izute gị, ka m chọọ ihu gị, ka m wee chọta gị. 16  Ejiriwo m ákwà sachie ihe ndina m, ya na ihe ndị tụrụ àgwà, bụ́ ákwà linin Ijipt.+ 17  Efesawo m ihe na-esi ísì ụtọ bụ́ mea, alo na sinamọn n’ihe ndina m.+ 18  Bịa ka anyị ṅụjuo ịhụnanya afọ ruo ụtụtụ; ka anyị mee onwe anyị obi ụtọ site n’igosi ịhụnanya.+ 19  N’ihi na di m anọghị n’ụlọ; ọ gawo njem n’ebe dị anya.+ 20  O bu akpa ego gaa. N’ụbọchị ọnwa ga-agbazu ka ọ ga-alọta n’ụlọ ya.” 21  O jiriwo ọtụtụ okwu ya nke na-eru n’obi duhie ya.+ O ji okwu ire ụtọ nke egbugbere ọnụ ya rata ya.+ 22  Na mberede, o sooro ya na-aga,+ dị ka oké ehi nke na-aga n’ebe a ga-egbu ya, dịkwa ka à ga-asị na e kere ya agbụ iji dọọ ya aka ná ntị a na-adọ onye nzuzu, 23  ruo mgbe akụ́ ga-agbapu imeju ya,+ dị nnọọ ka nnụnụ si eji ọsọ efeba n’ọnyà,+ ọ maghịkwa na o metụtara mkpụrụ obi ya.+ 24  Ugbu a, ụmụ m, geenụ m ntị, ṅaakwanụ ntị n’ihe ọnụ m na-ekwu.+ 25  Ka obi gị ghara ịtụgharị gaa n’ụzọ ya. Akpafula wee banye n’okporo ụzọ ya.+ 26  N’ihi na o mewo ka ọtụtụ ndị nwụọ,+ ndị niile ọ na-egbu dịkwa ọtụtụ.+ 27  Ụlọ ya bụ ụzọ e si aga Shiol;+ ụzọ ahụ gbadara ruo n’ime ime ọnụ ụlọ ọnwụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ilu 7:5*  Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “nwaanyị mba ọzọ.”
Ilu 7:5*  Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “nwaanyị ala ọzọ.”