Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ilu 31:1-31

31  Nke a bụ okwu Lemuel bụ́ eze, okwu gbara ọkpụrụkpụ+ nke nne ya gwara ya iji gbazie ya:+  Gịnị ka m na-ekwu, nwa m, gịnị, nwa nke afọ m,+ ọ̀ bụkwa gịnị, nwa m mụtara n’ihi nkwa m kwere?+  Enyela ndị inyom ike gị,+ emekwala ka ụzọ gị gaa n’ihe na-eme ka e kpochapụ ndị eze.+  Ndị eze ekwesịghị ịṅụ mmanya, Lemuel, ndị eze ekwesịghị ịṅụ mmanya, ndị isi ekwesịghịkwa ịsị: “Olee ebe ihe ọṅụṅụ na-egbu egbu dị?”+  ka mmadụ ghara ịṅụ mmanya wee chefuo ihe iwu kwuru, gbagọọkwa okwu ikpe nke onye ọ bụla n’ime ndị nọ n’ahụhụ.+  Nyenụ onye na-aga ịla n’iyi mmanya na-egbu egbu,+ nyekwanụ ndị ihe na-ewute ná mkpụrụ obi mmanya.+  Ka mmadụ ṅụọ mmanya wee chefuo ogbenye ọ dara, ka mmadụ gharakwa icheta nsogbu ya ọzọ.  Meghee ọnụ kwuchitere onye ogbi ọnụ ya,+ n’okwu ikpe nke ndị niile na-aga ịnwụ anwụ.+  Meghee ọnụ gị, kpee ikpe ziri ezi ma kpechite ọnụ onye nọ n’ahụhụ na ogbenye.+ א [Alef] 10  Ezigbo nwunye, ònye pụrụ ịchọta ya?+ Ọnụ ahịa ya dị nnọọ ukwuu karịa nke nkume kọral. ב [Bet] 11  Onye nwe ya tụkwasịrị ya obi, ọ dịghịkwa uru kọrọ ya.+ ג [Gimel] 12  O jiriwo ihe ọma kwụọ di ya ụgwọ, ọ bụghị ihe ọjọọ, n’ụbọchị niile nke ndụ ya.+ ד [Dalet] 13  Ọ chọwo ajị anụ na ákwà linin, ọ na-arụkwa ọrụ ọ bụla aka ya nwere mmasị ịrụ.+ ה [Hee] 14  Ọ dị ka ụgbọ mmiri nke onye ahịa.+ Ọ na-esi n’ebe dị anya ebubata ihe oriri ya. ו [Wọọ] 15  Ọ na-ebilikwa mgbe chi na-abọchabeghị,+ ọ na-enye ezinụlọ ya ihe oriri, na-ekenyekwa ụmụ agbọghọ ya òkè ha.+ ז [Zayin] 16  Ọ gawo leruo ala anya wee zụta ya;+ o siwo n’ihe aka ya rụpụtara kụọ ubi vaịn.+ ח [Het] 17  O jiriwo ume kee n’úkwù ya, ọ na-emekwa ka ogwe aka ya dị ike.+ ט [Tet] 18  Ọ hụwo na ahịa ọ na-azụ dị mma; oriọna ya adịghị anyụ n’abalị.+ י [Yod] 19  O setịpụwo aka ya were osisi e ji akpa ákwà, aka ya ejidewo mkpịsị e ji akpa ákwà.+ כ [Kaf] 20  Ọ gbasapụworo onye nọ n’ahụhụ ọbụ aka ya, o setịwokwara ogbenye aka ya.+ ל [Lamed] 21  Ọ dịghị atụ egwu na ọ dị ihe oyi ga-eme ezinụlọ ya, n’ihi na ezinụlọ ya dum yi uwe abụọ abụọ.+ מ [Mem] 22  O meworo onwe ya ákwà ihe ndina.+ E ji ákwà linin na ákwà e sijiri odo odo dụọ uwe ya.+ נ [Nun] 23  Onye nwe ya+ bụ onye a ma ama n’ọnụ ụzọ ámá,+ mgbe ya na ndị okenye obodo nọ ọdụ. ס [Samek] 24  Ọ kwawo uwe ime+ dị iche iche wee ree ha, o nyewokwa ndị ahịa ájị̀. ע [Ayin] 25  Ike na ịma mma bụ uwe ya,+ ọ na-achịkwa ụbọchị dị n’ihu ọchị.+ פ [Pee] 26  O meghewo ọnụ ya n’amamihe,+ iwu obiọma* dịkwa n’ire ya.+ צ [Sadee] 27  Ọ na-eleru anya n’ihe ndị na-eme n’ezinụlọ ya, ọ naghịkwa eri nri umengwụ.+ ק [Kof] 28  Ụmụ ya ebiliwo kpọọ ya onye obi ụtọ;+ onye nwe ya na-ebili, na-ajakwa ya mma.+ ר [Resh] 29  E nwere ọtụtụ ụmụ nwaanyị+ gosiworo na ha bụ ezigbo ụmụ nwaanyị, ma gị onwe gị karịrị ha niile.+ ש [Shin] 30  Ịma mma pụrụ ịbụ ụgha,+ mma elu ahụ́ pụkwara ịbụ ihe efu;+ ma nwaanyị nke na-atụ egwu Jehova na-enwetara onwe ya otuto.+ ת [Tọọ] 31  Nyenụ ya ihe aka ya rụpụtara,+ ka ọrụ ya jaakwa ya mma ọbụna n’ọnụ ụzọ ámá.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ilu 31:26*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”