Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ilu 21:1-31

21  Obi onye eze dị ka iyi n’aka Jehova.+ Ebe ọ bụla ọ chọrọ, ya echee ya ihu.+  Ụzọ niile nke mmadụ ziri ezi n’anya ya,+ ma Jehova na-enyocha obi.+  Ime ezi omume na ikpe ikpe ziri ezi na-adị Jehova mma karịa àjà.+  Anya dị mpako na obi dị nganga,+ ya bụ, oriọna ndị ajọ omume, bụ mmehie.+  Atụmatụ onye dị uchu aghaghị iweta uru,+ ma onye ọ bụla ọ na-adị ngwa ngwa aghaghị ịdaba n’ụkọ.+  Iji ire aghụghọ enweta akụ̀ bụ ume e kupụrụ ekupụ;+ ndị na-eme otú ahụ na-achọ ọnwụ.+  Ihe ndị ajọ omume na-ebukọrọ ga-adọkpụrụ ha pụọ,+ n’ihi na ha ajụwo ime ihe n’ikpe ziri ezi.+  Mmadụ nke si n’ezi ụzọ dapụ gbagọrọ agbagọ n’ụzọ ya;+ ma onye dị ọcha ziri ezi n’ọrụ ya.+  Ọ dị mma mmadụ ibi na nkuku elu ụlọ+ karịa ya na nwaanyị na-ese okwu ibi n’otu ụlọ.+ 10  Ihe ọjọọ agụwo mkpụrụ obi onye ajọ omume agụụ;+ mmadụ ibe ya agaghị enweta ihu ọma ọ bụla n’anya ya.+ 11  Onye na-amaghị ihe na-aghọ onye maara ihe mgbe e riri onye na-akwa emo iwu;+ onye maara ihe na-enwetakwa ihe ọmụma mgbe e mere ka ọ ghọta ihe.+ 12  Onye Ezi Omume na-eleru anya n’ụlọ onye ajọ omume,+ na-akwatu ndị ajọ omume ka ọdachi wee dakwasị ha.+ 13  Onye ọ bụla nke na-emechi ntị ya ka ọ ghara ịnụ ákwá mkpesa nke onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya,+ ya onwe ya ga-akpọ òkù ma a gaghị aza ya.+ 14  Onyinye e nyere na nzuzo na-eme ka iwe dajụọ;+ ngarị e zobere n’obi uwe+ na-emekwa ka oké ọnụma dajụọ. 15  Ime ihe n’ikpe ziri ezi bụụrụ onye ezi omume ihe ịṅụrị ọṅụ,+ ma ihe egwu dịịrị ndị na-eme ihe ọjọọ.+ 16  Mmadụ nke si n’ụzọ nghọta na-akpafu+ ga-ezu ike n’ọgbakọ nke ndị na-adịghị ndụ.+ 17  Onye hụrụ oriri na nkwari n’anya ga-ada ogbenye;+ onye hụrụ mmanya na mmanụ n’anya agaghị aba ọgaranya.+ 18  Onye ajọ omume bụụrụ onye ezi omume ihe mgbapụta;+ onye na-aghọ aghụghọ bụkwaara ndị ziri ezi ihe mgbapụta.+ 19  Ọ dị mma mmadụ ibi n’ala ịkpa karịa ya na nwaanyị na-ese okwu, nke na-akpasukwa mmadụ iwe, ibi.+ 20  Akụ̀ a na-achọsi ike na mmanụ dị n’ụlọ onye maara ihe,+ ma onye dị nzuzu ga-eloda ya eloda.+ 21  Onye na-achụso ezi omume+ na obiọma* ga-enweta ndụ, ezi omume na nsọpụrụ.+ 22  Onye maara ihe arịgorowo ọbụna n’obodo ndị dike, ka o wee kwada ihe na-enye obodo ahụ obi ike.+ 23  Onye na-eche ọnụ ya na ire ya nche na-echebe mkpụrụ obi ya ka ọ ghara ịbanye n’ahụhụ.+ 24  Onye na-etu ọnụ, nke dị mpako ma na-anya isi, bụ aha onye ji oké iwe nke mpako na-eme ihe.+ 25  Ihe na-agụ onye umengwụ agụụ ga-egbu ya, n’ihi na aka ya ajụwo ịrụ ọrụ.+ 26  Ogologo ụbọchị dum ka agụụ na-agụsi ya ike, ma onye ezi omume na-enye ihe, ọ dịghịkwa ihe ọ na-ajụ inye.+ 27  Àjà ndị ajọ omume bụ ihe arụ,+ ma ya fọdụzie mgbe mmadụ na-eweta ya ma na-eme omume rụrụ arụ.+ 28  Onye akaebe ụgha ga-ala n’iyi,+ ma onye na-aṅa ntị ga na-ekwu okwu ọbụna ruo mgbe ebighị ebi.+ 29  Ihere apụwo onye ajọ omume n’ihu,+ ma onye ziri ezi ga-eme ka ụzọ ya guzosie ike.+ 30  Ọ dịghị amamihe ma ọ bụ nghọta ma ọ bụ ndụmọdụ ọ bụla nke pụrụ iguzogide Jehova.+ 31  Ịnyịnya bụ ihe a kwadebere maka ụbọchị agha,+ ma, ọ bụ Jehova nwe nzọpụta.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ilu 21:21*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”