Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ilu 2:1-22

2  Nwa m, ọ bụrụ na ị nabata ihe m na-ekwu+ ma chekwaa ihe m nyere n’iwu n’obi gị,+  ka i wee gee amamihe ntị,+ ka i wee jiri obi gị chọọ nghọta;+  ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta+ ka ị na-akpọku, ọ bụrụkwa na ọ bụ ikike ịghọta ihe+ ka ị na-etiku,  ọ bụrụ na ị na-achọ ya dị ka e si achọ ọlaọcha,+ ọ bụrụkwa na ọ bụ dị ka akụ̀ zoro ezo ka ị na-achọ ya,+  mgbe ahụ, ị ga-aghọta egwu+ Jehova, ọ bụkwa ihe ọmụma Chineke+ ka ị ga-achọta.  N’ihi na ọ bụ Jehova na-enye amamihe;+ ihe ọmụma na nghọta na-esi n’ọnụ ya apụta.+  Ọ bụkwa ndị ziri ezi ka ọ ga-echekwara ezi amamihe;+ ọ bụ ọta nke ndị na-eje ije n’iguzosi ike n’ezi ihe,+  site n’iche ụzọ ikpe ziri ezi+ nche, ọ ga-echekwa ụzọ nke ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ nche.+  Mgbe ahụ, ị ga-aghọta ezi omume na ikpe ziri ezi na ịkwụwa aka ọtọ, bụ́ ụzọ dum nke ihe dị mma.+ 10  Mgbe amamihe banyere n’obi gị,+ ihe ọmụma abụrụkwa ihe na-atọ mkpụrụ obi gị ụtọ,+ 11  ikike iche echiche ga-echekwa gị nche,+ nghọta ga-echebekwa gị,+ 12  ịnapụta gị n’ụzọ ọjọọ,+ n’aka onye na-ekwu ihe rụrụ arụ,+ 13  n’aka ndị na-ahapụ ụzọ ziri ezi iji jee ije n’ụzọ ọchịchịrị,+ 14  n’aka ndị na-aṅụrị ọṅụ n’ime ihe ọjọọ,+ ndị na-enwe aṅụrị n’ihe arụ nke bụ́ ihe ọjọọ;+ 15  ndị ụzọ ha gbagọrọ agbagọ, ndị dịkwa aghụghọ n’ụzọ ha niile;+ 16  iji napụta gị n’aka nwaanyị na-eme omume rụrụ arụ,* n’aka nwaanyị na-akwa iko,*+ bụ́ onye mere ka okwu ya bụrụ okwu ire ụtọ,+ 17  onye na-ahapụ enyi ọma o nwere n’oge ọ bụ nwa agbọghọ,+ onye chefuwokwara ọgbụgba ndụ Chineke ya.+ 18  N’ihi na ụlọ ya na-emi emi ruo n’ọnwụ, ụzọ ya na-emikwa emi ruo n’ebe ndị na-adịghị ndụ nọ.+ 19  Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ndị ya na ha na-enwe mmekọahụ ga-alọghachi, ha agaghịkwa abịaghachi n’ụzọ nke ndị dị ndụ.+ 20  Nzube ya bụ ka i wee na-eje ije n’ụzọ ndị ezi mmadụ,+ ka i wee sorokwa ụzọ nke ndị ezi omume.+ 21  N’ihi na ọ bụ ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa,+ ọ bụkwa ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta ka a ga-ahapụ n’ime ya.+ 22  Ma a ga-ebipụ ndị ajọ omume n’ụwa;+ a ga-efopụkwa ndị na-aghọ aghụghọ na ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ilu 2:16*  Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “nwaanyị mba ọzọ.”
Ilu 2:16*  Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “nwaanyị ala ọzọ.”