Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ilu 17:1-28

17  Ibé achịcha kpọrọ nkụ nke a na-eri n’ebe e nwere ịdị jụụ+ dị mma karịa ụlọ nke jupụtara n’àjà a na-eri na-ese okwu.+  Ohu nke nwere nghọta ga-achị nwa nke na-emechu mmadụ ihu,+ ọ ga-eso ụmụnne nwa ahụ keta òkè n’ihe nketa.+  Ite e ji anụcha ihe bụ maka ọlaọcha, ekwú ọkụ bụkwa maka ọlaedo,+ ma, ọ bụ Jehova na-enyocha obi.+  Onye na-eme ihe ọjọọ na-aṅa egbugbere ọnụ nke na-ekwu ihe ọjọọ ntị.+ Onye ụgha na-ege ire nke na-akpata ahụhụ ntị.+  Onye na-akwa onye dara ogbenye emo akọchawo Onye kere ya.+ Onye na-aṅụrị ọṅụ n’ọdachi onye ọzọ agaghị agbanahụ ntaramahụhụ.+  Okpueze ndị agadi bụ ụmụ ụmụ ha,+ ma ịma mma nke ụmụ bụ nna ha.+  Egbugbere ọnụ nke ziri ezi ekwesịghị onye ọ bụla nke na-amaghị ihe,+ ma ya fọdụzie egbugbere ọnụ okwu ụgha ikwesị onye a ma ama!+  Onyinye bụ nkume e ji enweta ihu ọma n’anya onye nwe ya.+ Ebe ọ bụla ọ tụgharịrị, ọ na-enwe ihe ịga nke ọma.+  Onye na-ekpuchi mmejọ na-achọ ịhụnanya,+ onye na-ekwukwa banyere otu ihe mgbe niile na-ekewa ndị ha na ibe ha dị ná mma.+ 10  Ịba mba na-abami onye nwere nghọta n’ahụ́+ karịa iti onye nzuzu ihe ugboro otu narị.+ 11  Naanị nnupụisi ka onye ọjọọ na-achọ mgbe niile,+ onye obi tara mmiri ka onye ozi a na-ezigara ya bụkwa.+ 12  Ọ ka mma ka mmadụ zute anụ ọhịa bea a napụrụ ụmụ ya+ kama izute onye ọ bụla nke bụ́ onye iberiibe ná nzuzu ya.+ 13  Onye ọ bụla nke na-eji ihe ọjọọ akwụ ụgwọ ihe ọma,+ ihe ọjọọ agaghị apụ n’ụlọ ya.+ 14  Mmalite esemokwu dị ka mmadụ imeghere mmiri ụzọ;+ ya mere, tupu esemokwu amalite, si n’ebe ahụ pụọ.+ 15  Onye ọ bụla nke na-ekwu na onye ajọ omume bụ onye ezi omume+ nakwa onye ọ bụla nke na-ekwu na onye ezi omume bụ onye ajọ omume+—ọbụna ha abụọ bụ ihe arụ n’anya Jehova.+ 16  Gịnị mere ụzọ e si enweta amamihe ji dịrị n’aka onye nzuzu,+ ebe ọ bụ onye na-enweghị uche?+ 17  Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile,+ ọ bụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.+ 18  Onye na-enweghị uche na-ekwe n’aka iji nwee nkwekọrịta,+ na-ana mmadụ ibe ya n’ibé.+ 19  Onye ọ bụla nke hụrụ njehie n’anya hụrụ esemokwu n’anya.+ Onye ọ bụla nke na-eme ka ọnụ ụzọ mbata ya dị elu na-achọ nkụpịa.+ 20  Onye gbagọrọ agbagọ n’obi agaghị enweta ihe ọma,+ onye ire abụọ ga-adabakwa n’oké nsogbu.+ 21  Onye ọ bụla nke bụ́ nna nwa nzuzu—ọ bụụrụ ya ihe iru uju;+ nna nke nwa na-amaghị ihe adịghịkwa aṅụrị ọṅụ.+ 22  Obi nke na-aṅụrị ọṅụ bara uru dị ka ihe na-agwọ ọrịa,+ ma mmụọ nke dara mbà na-amịkpọ ọkpụkpụ.+ 23  Onye ajọ omume ga-anara ọbụna ngarị e wepụtara n’obi uwe+ iji gbagọọ ụzọ ikpe ziri ezi.+ 24  Amamihe dị n’ihu onye nwere nghọta,+ ma anya onye nzuzu na-awagharị n’ebe niile ụwa sọtụrụ.+ 25  Nwa nzuzu bụụrụ nna ya+ ihe mkpasu iwe, bụkwaara nne mụrụ ya ihe obi ilu.+ 26  Iri onye ezi omume iwu adịghịkwa mma.+ Iti ndị a ma ama ihe ezighị ezi.+ 27  Onye ọ bụla nke na-adịghị ekwu ọtụtụ okwu maara ihe,+ mmụọ nke onye nwere nghọta na-adị jụụ.+ 28  Mgbe onye ọ bụla nke dị nzuzu gbachiri nkịtị, a ga-ewere ya dị ka onye maara ihe;+ a ga-ewerekwa onye mechiri ọnụ ya dị ka onye nwere nghọta.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji