Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ilu 15:1-33

15  Azịza dị nro na-eme ka ọnụma laa,+ ma okwu ọjọọ na-akpasu iwe.+  Ire ndị maara ihe na-eji ihe ọmụma eme ihe ọma,+ ma ọnụ ndị nzuzu na-ekwu ọtụtụ okwu nzuzu.+  Anya Jehova dị n’ebe niile,+ na-elegide ndị ọjọọ na ndị ọma.+  Ire dị jụụ bụ osisi nke ndụ,+ ma ọ bụrụ na ọ gbagọrọ agbagọ, ọ na-eweta nkụda mmụọ.+  Onye ọ bụla nke dị nzuzu na-elelị ịdọ aka ná ntị nna ya,+ ma onye ọ bụla nke ji ịba mba kpọrọ ihe maara ihe.+  Ụlọ onye ezi omume jupụtara n’akụ̀,+ ma ihe onye ajọ omume rụpụtara na-ebute nsogbu.+  Egbugbere ọnụ ndị maara ihe na-ekesa ihe ọmụma,+ ma obi ndị nzuzu adịghị otú ahụ.+  Àjà ndị ajọ omume bụ ihe arụ n’anya Jehova,+ ma ekpere ndị ziri ezi bụ ihe na-atọ ya ụtọ.+  Ụzọ onye ajọ omume bụ ihe arụ n’anya Jehova,+ ma onye na-achụso ezi omume ka ọ hụrụ n’anya.+ 10  Ịdọ aka ná ntị bụ ihe ọjọọ n’anya onye na-ahapụ ụzọ;+ onye ọ bụla nke kpọrọ ịba mba asị ga-anwụ.+ 11  Shiol na ebe mbibi+ dị n’ihu Jehova,+ ma ya fọdụzie obi ụmụ mmadụ!+ 12  Onye na-akwa emo adịghị ahụ onye na-abara ya mba n’anya.+ Ọ gaghị agakwuru ndị maara ihe.+ 13  Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ihu dị mma,+ ma a na-enwe ịda mbà na mmụọ n’ihi ihe na-ewute obi.+ 14  Ọ bụ obi nke na-aghọta ihe na-achọ ihe ọmụma,+ ma, ọ bụ ọnụ ndị iberiibe na-achụso nzuzu.+ 15  Ụbọchị niile nke onye nọ n’ahụhụ jọrọ njọ;+ ma onye obi dị mma na-eri oriri mgbe niile.+ 16  Ntakịrị ihe e nwere n’egwu Jehova dị mma+ karịa ihe dị ukwuu e nwere n’ebe ọgba aghara dị.+ 17  Nri e ji naanị akwụkwọ nri sie dị mma n’ebe e nwere ịhụnanya+ karịa ehi mara abụba n’ebe e nwere ịkpọasị.+ 18  Onye na-ewe oké iwe na-akpasu esemokwu,+ ma onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ na-eme ka esemokwu dajụọ.+ 19  Ụzọ onye umengwụ dị ka ogige e ji osisi ogwu gbaa,+ ma ụzọ ndị ziri ezi bụ ụzọ a wụrụ ájá.+ 20  Ọ bụ nwa maara ihe na-eme ka nna ya ṅụrịa,+ ma onye nzuzu na-eleda nne ya anya.+ 21  Nzuzu bụụrụ onye na-enweghị uche ịṅụrị ọṅụ,+ ma onye nwere nghọta na-eje ije n’ụzọ kwụ ọtọ.+ 22  Atụmatụ na-aghasasị ma ọ bụrụ na a gbaghị izu,+ ma a na-arụzu ihe ma e nwee ọtụtụ ndị ndụmọdụ.+ 23  Mmadụ na-aṅụrị ọṅụ n’ihi ihe ọnụ ya zara,+ leekwa nnọọ ka okwu e kwuru n’oge ya si dị mma!+ 24  Ụzọ nke ndụ dị n’ebe dị elu n’anya onye ji nghọta eme ihe,+ ka o wee ghara ịbanye na Shiol nke dị n’okpuru.+ 25  Ụlọ nke ndị na-ebuli onwe ha elu ka Jehova ga-etida,+ ma ọ ga-eme ka ókè nke ala nwaanyị di ya nwụrụ dịgide.+ 26  Atụmatụ onye ọjọọ bụ ihe arụ n’anya Jehova,+ ma okwu ọma dị ọcha.+ 27  Onye na-eri uru na-ezighị ezi na-ewetara ụlọ ya nsogbu,+ ma onye kpọrọ iri ngo asị ga-adịrị ndụ.+ 28  Obi onye ezi omume na-atụgharị uche iji zaa okwu,+ ma ọnụ ndị ajọ omume na-ekwu ọtụtụ ihe ọjọọ.+ 29  Jehova nọ ndị ajọ omume n’ebe dị anya,+ ma ekpere ndị ezi omume ka ọ na-anụ.+ 30  Ìhè nke anya+ na-eme ka obi ṅụrịa;+ akụkọ+ dị mma na-eme ka ọkpụkpụ maa abụba.+ 31  Ntị nke na-anụ ịba mba+ nke ndụ na-anọ kpọmkwem n’etiti ndị maara ihe.+ 32  Onye ọ bụla nke na-ezere ịdọ aka ná ntị+ na-ajụ mkpụrụ obi nke ya, ma onye na-aṅa ntị n’ịba mba na-enweta ezi uche.+ 33  Ịtụ egwu Jehova bụ ịdọ aka ná ntị nke na-enye amamihe,+ ịdị umeala n’obi na-ebute otuto ụzọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji