Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ilu 12:1-28

12  Onye hụrụ ịdọ aka ná ntị n’anya hụrụ ihe ọmụma n’anya,+ ma onye kpọrọ ịdọ aka ná ntị asị adịghị eche echiche.+  Onye bụ́ ezi mmadụ na-enweta ihu ọma Jehova,+ ma onye na-eche echiche ọjọọ ka ọ na-akpọ onye ajọ omume.+  Ọ dịghị onye ime ajọ omume ga-eme ka o guzosie ike;+ ma a gaghị eme ka mgbọrọgwụ ndị ezi omume maa jijiji.+  Ezigbo nwunye bụ okpueze onye nwe ya,+ ma nwaanyị nke na-emechu mmadụ ihu dị ka ure n’ọkpụkpụ di ya.+  Echiche ndị ezi omume bụ ikpe ziri ezi;+ nduzi ndị ajọ omume na-enye bụ aghụghọ.+  Okwu ndị ajọ omume bụ ichechi mmadụ iji wụfuo ọbara,+ ma, ọ bụ ọnụ ndị obi ha ziri ezi ga-anapụta ha.+  A na-akwatu ndị ajọ omume, ha ewee ghara ịnọkwa,+ ma ụlọ ndị ezi omume ga-eguzo mgbe niile.+  A ga-eto mmadụ n’ihi na ọnụ ya na-ekwu ihe ezi uche dị na ya,+ ma onye obi ya gbagọrọ agbagọ ka a ga-elelị.+  Onye a na-ejighị kpọrọ oké ihe ma ya enwee onye na-ejere ya ozi dị mma karịa onye na-enye onwe ya otuto ma ya anọrọ n’ụkọ ihe oriri.+ 10  Onye ezi omume na-elekọta mkpụrụ obi anụ ụlọ ya,+ ma ebere ndị ajọ omume bụ obi ọjọọ.+ 11  Onye na-akọ ubi ya ga-eriju ihe oriri afọ,+ ma onye na-achụso ihe ndị na-abaghị uru enweghị uche.+ 12  Anụ a matara n’ọnyà ndị ọjọọ agụwo onye ajọ omume agụụ;+ ma mgbọrọgwụ ndị ezi omume na-emepụta ihe.+ 13  Njehie egbugbere ọnụ na-eme ka onye ọjọọ ma n’ọnyà,+ ma onye ezi omume na-esi n’ahụhụ apụta.+ 14  A na-esi n’okwu ọnụ mmadụ eme ka ihe ọma ju ya afọ,+ ihe mmadụ jikwa aka ya na-eme ga-alaghachikwute ya.+ 15  Ụzọ onye nzuzu ziri ezi n’anya ya,+ ma onye na-aṅa ntị na ndụmọdụ maara ihe.+ 16  Ọ bụ onye nzuzu na-egosipụta iwe ya n’otu ụbọchị ahụ,+ ma onye maara ihe na-ekpuchi ihe ihere.+ 17  Onye na-ekupụ ikwesị ntụkwasị obi dị ka ume ga-ekwu ihe ziri ezi,+ ma onye akaebe ụgha ga-ekwu okwu aghụghọ.+ 18  E nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị echiche dị ka ebe e ji mma agha maa mmadụ,+ ma ire ndị maara ihe na-agwọ ọrịa.+ 19  Ọ bụ egbugbere ọnụ eziokwu+ ka a ga-eme ka o guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi,+ ma ire okwu ụgha ga-adịru naanị nwa mgbe nta.+ 20  Aghụghọ dị n’obi ndị na-akpa nkata ihe ọjọọ,+ ma ndị na-adụ ọdụ udo na-aṅụrị ọṅụ.+ 21  Ọ dịghị ihe ọjọọ ga-adakwasị onye ezi omume,+ ma, ọ bụ ndị ajọ omume ka ọdachi ga-ezu ahụ́.+ 22  Egbugbere ọnụ ụgha bụ ihe arụ n’anya Jehova,+ ma ndị na-eme ihe n’ikwesị ntụkwasị obi na-eme ka o nwee obi ụtọ.+ 23  Onye maara ihe na-ezobe ihe ọmụma,+ ma, ọ bụ obi onye nzuzu na-eti nzuzu ná mkpu.+ 24  Ọ bụ aka ndị dị uchu ga-achị achị,+ ma aka dị umengwụ ka a ga-amanye ịrụ ọrụ.+ 25  Ọ bụ nchegbu nke dị n’obi mmadụ ga-anyịgbu ya,+ ma, ọ bụ okwu ọma na-eme ka ọ ṅụrịa ọṅụ.+ 26  Onye ezi omume na-eleru ebe anụ ya na-ata nri anya, ma ụzọ ndị ajọ omume na-eme ka ha na-awagharị awagharị.+ 27  Umengwụ agaghị achụpụtara mmadụ anụ ọ na-achụ nta ya,+ ma onye dị uchu bụ akụ̀ mmadụ nke dị oké ọnụ ahịa. 28  Ndụ dị n’ụzọ ezi omume,+ ije ije n’ụzọ ya adịghị eduga n’ọnwụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji